Atiku, PDP akpụpụkwala Inec, Tinubu, APC ụlọikpe maka ntuliaka onyeisiala

Ebe foto si, Peter Obi/Bola Tinubu/Inec/Atiku Abubakar
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị n'Abuja, megide ụlọorụ nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec), otu ndọrọndọrọ 'All Progressives Congress' (APC) nakwa Bola Ahmed Tinubu.
Akwụkwọ a ha gbara n'ụlọikpe bụ maka ebubo nrụrụaka na wuruwuru nke ha na-ebo Inec maka ịkpọpụta Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

Ebe foto si, Dino Melaye
Atiku na-ekwu na ntuliaka ahụ agaghị etu o si kwesị, nakwa na Inec esoghi usoro iwu ha wepụtara maka ya bụ ntuliaka.
Ọ na-arịọ ụlọikpe ka ha nye Inec iwu ka ọ napụta akwụkwọ asambodo o nyere Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa n'ihi na ọ bụ ya meriri n'ezie.
Nke a na-abịa dịka ọ gachara awa olemole akụkọ pụtara na Peter Obi, onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa kpụpụkwara APC ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka na ntuliaka 2023.
Presidential Election 2023: Okpụrụkpụ ihe nọ n’akwụkwọ ikpe Peter Obi nyere Inec

Labour Party (LP) na onye zọọrọ pati ahụ ọkwa onyeisiala eburula mkpesa ha banyere mmeri Bola Tinubu nke All Progressives Congress (APC) gawa ụlọikpe n’uju.
Ndị a gbara akwụkwọ n’okwu mkpọpụta Tinubu dịka onye nwetere mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa e mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị, 2023.
Ndị e depụtara aha ha n’akwụkwọ ikpe a nke akara ya bụ CA/PEPC/03/2023 gụnyere ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec), Bola Tinubu, osote ya bụ Sịnetọ Kashim Shettima nakwa otu pati APC.

Ụfọdụ mkpesa n’ime akwụkwọ ikpe a
Ha chọrọ ka ụlọịkpe kwupụta na Tinubu enweteghi mmeri site n’ịnweta vootu iwu kwadoro na ntulika ahụ
- Ha chọrọ ka ụlọikpe nye Inec iwu ka ha napụ Tinubu asambodo gosiri na ọ ga-achị (certificate of return) ma nyefe Peter Obi ya bụ akwụkwọ nke ọhụrụ
- Ha boro ebobo kwusiriike na n’oge ntuliaka a e mechapụrụ na Tinubu etozughi oke ma nacha ịzọ ọkwa ahụ ma rụọ aka n'okwu ebubo nrụrụaka nọ n'isi ya n'ụlọikpe mba Amerịka
- Ha rụkwara aka na usoro ntuliaka ahụ si ụzọ nrụrụaka nke gụnyere ịghara iso ntuziaka iwu ntuliaka Naịjirịa 2022
- Obi rịọrọ ụlọikpe ka a kpọpụta ya dịka onye ga-achị Naịjirịa dịka o kwetere na ọ bụ ya bụ onye kacha nweta vootu na ntuliaka ahụ, kagbuo ntuliaka ahụ e mere ma hibe ntuliaka ọzọ.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’otu aka ahụ, otu Action Alliance nakwa onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Solomon Okanigbuan ebugala mkpesa ha banyere mpụtara ntuliaka a gaa ụlọikpe, akara akwụkwọ ikpe ha bụ CA/PEPC/01/2023 ebe otu Allied Peoples’ Movement bupụkwara mkpesa nke ha ụlọikpe n’akara CA/PEPC/04/2023.
A na-atụ anya na otu Peoples Democratic Party na onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar ga-eweta akwụkwọ mkpesa nke ha tupu chi ejitọpụ na Tuzde dịka Tuzda a bụ ụbọchị ikpesa ohere dịrị ha ịme nke a.
Cheta na n’izu gara aga, otu Peoples Democratic Party (PDP) Atiku, wepụrụ ma kagbuo akwụkwọ ikpe ha bupụtarabụrụ nke rịọrọ ka ụlọikpe nye ụlọọrụ Independent Electoral Commission (Inec) iwu ka ka ndị otu ha nweeike sonye n'usoro nhazi akwụkwọ e jii tụọ vootu na ntụliaka onyeisiala Naịjirịa.
Ụlọikpe nyeburu PDP, Atiku nakwa ndị otu Labour Party nakwa Obi ikike inweike nyobanye anya n’ime akwụkwọ ndị e jiri mee ntuliaka 2023.
Ụlọikpe kwukwara na ndị ga-enweike hụ ozi ndị nọ n’ime ngwa ọrụ Inec bụ Bvas mana dịka ya bụ usoro ghara ịmetụta ntuliaka ọkwa gọvanọ ezuburu ime n’ụbọchị 11 nke ọnwa Maachị, ụlọikpe nyere Inec iwu ka ha bufee ozi niile dị n’ime ngwa teknụzụ Bvas n’ọbaozi pụrụiche bụ ‘Server’ ma hazigharị ya bụ ngwa maka ntuliaka ọkwa gọvanọ.








