Ọ bụ iwu na onye na-azọ ọkwa onyeisiala ga-enwete vootu 25% n'Abuja tupu o merie?

Ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa

Dịka a na-akpọpụta mpụtara ntuliaka onyeisiala Naịjirịa, e nwere mgbagwoju anya banyere pasentị vootu mmadụ ga-enwete ka a kpọpụta dịka onye meriri.

Iwu Naịjirịa nke ngalaba 133 (a na b) kwuru na onye ahụ ga-enwete vootu kachasị n’ọnụọgụgụ gbakwụnyere na ọ ga-enwete vootu pasenti 25 n’ime steeti abụọ ma e kee steeti ụzọ atọ nakwa n’isiobodo Abuja.

Nghọtahie dị ugbua bụ ma onye ahụ o kwesịrị inwete vootu pasenti 25 n’Abuja nakwa steeti iri abụọ na anọ ka Abuja o bụ steeti nke iri atọ na asaa bụ ebe onye ahụ kwesịrị inwete vootu pasentị 25.

Mike Igini bụbu onye kọmishọna n’ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) tinyere ọnụ n’okwu a.

Mgbe ọ na-aza ajụjụ na TV n’ụbọchị Fraịde 24 Febuwarị tupu e mee ntuliaka, Igini kwuru “no o nweghi onye ọbụla a ga-akpọpụta dịka onyeisiala ma o nweteghi vootu pasentị 25 n’isiobodo Abuja.

“Na-agbanyeghi na o nwete vootu pasentị 25 n’ime steeti iri abụọ na anọ. Ọ bụ ajụjụ dị mkpa ịza, i nwereike ịza ajụjụ niile mana ọ bụrụ na i nweteghi pasentị 25 n’Abuja, o nweghi ebe i ji azụ aga.”

Mana, Wahab Shittu bụ onye ọkaiwu di ukwuu a kpọrọ SAN ekweteghi n’ihe Igini kwuru, i lebara anya n’iwu Naịjirịa ngalaba 299 nke hụtara Abuja dịka steeti.

Ọ gwara BBC na kamgbe a hụtara Abuja dịka steeti, ọ pụtara na ọ bụghi iwu na onye ahụ ga-enwete vootu pasentị 25 ma ọ bụrụ na o nwetela pasentị 25 na steeti ndị ọzọ.”

O gbakwụnyere na n’ihi ntuliaka ọkwa onyeisiala, ihe a na-ele anya bụ ka onye ahụ nwete ọkara abụọ n’ime steeti 37, ọ bụghị 36, “kamgbe a hụtara Abuja dịka steeti”.

Onye ọkaiwu ọzọ bụ Candide Johnson kwenyere n’ihe Shittu kwuru gwara BBC na nghọtahie dị n’okwu bụ maka na “emezighi iwu a nke ọma...asụsụ na-adabaghị adaba”.

O kwuru na iwu ngalaba (133b) ahụ abụghị ka e nye Abuja ikike pụrụiche, kama ọ bụ ka a kọwaa na mmadụ agaghị emeri ntuliaka ma ọ bụrụ na vootu o nwetere abụghị nke ekesara na steeti niile dị na Naịjirịa.

“Mgbakwụnye Abuja na steeti ndị ahụ apụtaghị na ị ga-enwete pasentị 25 n’Abuja tupu i merie.

“Ọ bụrụ na ụlọikpe ọbụla kpebie na Abuja bụ ọnụụzọ e si abanye n’ọkwa onyeisiala maara na nke ahụ megidere iwu na-achị Naịjirịa.”

O meela ọtụtụ ụbọchị ndị Naịjirịa tụchara vootu mana na-echezi ka ha hụụ etu ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec) ga-esi akpọpụta onye meriri ntuliaka a.