Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwuola uche ya maka ntuliaka emere na Febụwarị.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Nnọ n'ọba ozi anyị

    Unu asaala chi?

    Daalụ maka ịbata n'ime ọba ezi anyị taa.

    Soro akụkọ gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti Naịjirịa ebe a taa.

  2. Peter Obi etiela mkpu maka ndị chọrọ iji aha ndị 'Obidients' mee ngagharịiwe

    Peter Obi

    Ebe foto si, Pater Obi/Twitter

    Onye jí ọkọlọtọ otu Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023 bụ Peter Obi etiela mkpụ na ndị otu patị ọzọ chọrọ iji aha ndị nkwado Labour Party eji Obideints mara mee ngaghariiwe na Naịjirịa niile.

    Dịka o siri kwuo na akara Twitter ya sị, "Ndị otu party ọzọ chọrọ iji soshal Midịa kpalie ngaghariiwe n'aha ndị nkwado anyị".

    Obi ji ohere a kwuo na ọ ka kwụsị ike n'iji ụloikpe maka okwu gbasara nrụrụaka oge ntụliaka.

    Ọ sị, "Agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị ntụkwasị obi maka usoro ụloikpe, kama anyị kwesịrị ihiwe aka ọchichị siri ike nke ụloikpe bụ otu n'ime ha".

  3. 2023 Nigeria Elections: E nyela ndị meriri ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi na Enugwu Steeti asambodo mmeri

  4. Onye bụ ugwu ndị Enugwu ga-eguzo na ya dịka Gọvanọ?

  5. Global Terrorism Index: GTI akọwaala ihe ha ji tinye IPOB dịka otu na-eyi ndụ egwu

  6. Anyị agaghị aza ajụjụ ọbụla maka nwuchi Tony Otuonye - DSS

    Njimara DSS

    Ebe foto si, Department of State Services (DSS)/Twitter

    Ngalaba Department of State Services bụ DSS n'ịchafụ ekweghị aza ajụju ọbụla BBC Igbo jụrụ ha maka akụkọ na-ekwu na ha nwuchiri Tony Otuonye onye na-arụ dịka onyeisi na ngabala State Signage and Advertisement Agency nke Abia Steeti maka okwu a sị na-eyi ndụ egwu.

    Ọ bụ ihe onyonyi nke na-efegharị na soshal Midịa ebe esetere Otuonye ebe ọ na-ekwu okwu maka etu otu ya bụ PDP ga-esi emeri ntụliaka nke gọvanọ na ndị ụlọomeiwu a ga-eme n'ụbọchị satọde.

    Ya bụ ihe onyonyo bidoro na-efegharị na soshal midịa dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na o yiri ndụ ndị mmadụ egwu maka ntụliaka.

    Kepukepu na-efegharịkwa na otu DSS nwuchịrị ya maka nke a kama mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ngalaba DSS maka nke a, ha ekweghị ikwu ihe ọbụla gbasara ya.

  7. Otu PDP emeela ngagharịwe n'ụlọọrụ Inec nke Imo steeti

    Ndị otu PDP

    Ndị otu Peoples Demcratic Party nke Imo steeti emela ngaghariiwe taa bụ ụbọchị 15 nke ọnwa Maachị afọ 2023 dịka ha kwuru na mpụtara ntụliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu ngalaba Inec mere n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Febụwarị na steeti ahụ ejughị ha afọ.

    Onyeisioche otu a n'Imo steti bụ Charles Ugwu gwara ndị ntaaakụkọ na e mere nrụrụaka na ya bụ ntụliaka.

    O kwuru sị, " E nwere mpụtara ntụliaka na mpaghara ebe emeghị ntụliaka ọbụla...kama Inec nabatara ya ma kpọpụta ya".

    O kwuru na ha ji ohere ngaghariiwe ha ekwu na obi adịghị ha mma etu Inec siri hazie ntụliaka a.

    Ndị otu PDP
  8. Anyị chọrọ udo oge ntụliaka Gọvanọ - Umunwaanyị Rivas Steeti

    Ụmụnwaanyị mere ngaghariudo

    Ebe foto si, Sorbari Peter

    Ụfọdụ ụmụnwaanyị pọtakụt emeela ngagharịudo n'isi ụlọọrụ Inec nke dị na Rivas Steeti taa bụ ụbọchị 15 nke ọnwa maachị.

    Ụmụnwaanyị a ndị yi uwe ojii kwuru na ha chọrọ ka udo na ịkwụwa aka ọtọ were ọnọdụ n'oge ntụliaka ọkwa gọvanọ na nke ụlọomeiwu steeti na Rives Steeti n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.

    Ụmụnwaanyị mere ngaghariudo

    Ebe foto si, Sorbari Peter

  9. Ụlọikpe agbaala isiakwara n’okwu ntọhapụ onye omeiwu Rịvas ikpe nzufu ego nọ n’isi ya

    A na-enyo Chinyere Igwe n'okwu nzufu ego

    Ebe foto si, Ayo Odungweru

    Ụlọikpe uwku na Pọta kọtụ bụ isi obodo Rịvas steeti ekwuola na Chinyere Igwe bụ otu onye omeiwu steeti ahụ agaghị esi n’ụlọ na-abịa ikpe ya.

    Ndị uweojii ji Igwe na-anọchiteanya mpaghara Port Harcourt Constitiuency 2 n’ihi ebubo nzufu ego.

    A na-abo ya ebubo ibufu ego ruru $500,000 dịka ahụrụ akwụkwọ a sị o ji kesaa ya bụ ego n’ụbọchị 24 nke ọnwa Febrụwarị bụ abalị foro chi ụbọchị ntuliaka onyeisiala 2023.

    Ikpe nke mere onye ọkaikpe gọọmentị steeti ahụ onye ga-anọzị n’isi ya bụ ikpe.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii ejichiela Igwe ọzọ.

  10. O nweela ihe gọọmentị mere ndị wakporo mmadụ maka agbụrụ ha n'oge ntuliaka na Legọs?

  11. Onye ga-abụ eze ga-akwụ ọtọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti?

  12. Inec ekwuola na ha eweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla n’ọrụ nlekọta teknụzụ ha

    Ndị pụtara ịtụ vootu

    Ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Election Commission (Inec) ekwuola na akụkọ na-efegharị na ha were otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n’ọrụ ịbụ onyeisi nlekọta ngwa teknụzụ ha bụ ezigbo akụkọ ụgha.

    Akụkọ a na-efegharị boro ebubo na Inec were Femi Odubiyi n’ọrụ mana ozi ọhụrụ Inec zipụtara kụchapụrụ ya bụ akụkọ nke si n’aka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ aha ya bụ Olabode George pụta.

    Inec kwusiriike na enweghi onye na aza aha Femi Odubiyi ha were n’ọrụ na steeti abụkwanụ n’ụlọọrụ etiti ha.

    Ha gakwara n’ihu kwuo na ọrụ ngalaba nlekọta teknụzụ n’ụlọọrụ abụghị ọrụ a na-enye ndị ndọrọndọrọọchịchị.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Ngagharịiwe ndị Umunze maka etu e si gbuo agadị nwaanyị bekọrọ ahụ ya maka ọgwụego

  14. Etu m ga-esi weghachite ebube na ugwu Abia steeti – Alex Otti

  15. Etu ndị omekome ịntanetị si chọọ iwakpo ọbaozi ntuliaka ugboro nde 12.9 - Gọọmenti etiti

    Isa Pantami

    Ebe foto si, TWITTER/UWASULEIMAN

    Minista na-ahụ maka mgbasaozi na ego site n’ime ngwa teknụzụ bụ Ọkamụta Isa Pantami ekwuola na ndị omekome nke ịntanetị nwara ugboro nde iri na abụọ na ụma iwakpo ime ọbaozi e ji mee ntuliaka 2023.

    O kwuru nke a n'ụbọchị Tuzde ma kọwakwa na ndị a nwara ugboro nde 6.9 n'ụbọchị ntuliaka mkpọ kwem.

    Ọ gara n'ihu kwuo na ndị kpara nkata bụ ma ndị nọ n’ime Naịjirịa nakwa na mba ofesi ndị ọzọ.

    Inec ji ngwa teknụzụ ụfodụ mee ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọ omeiwu Naịjirịa n’ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị 2023.

    Ozi Pantami kwuru na atụmatụ ndị a amịtaghị mkpụrụ ma ncha n’ihi na ha kere nkwụcha, buso ha agha ma merie ha.

  16. Lee ndị ọkamgba na-azọ ịnọchi Ikpeazu n'ocheeze Abia Steeti

  17. Peter Obi meriri mpaghara ndida n'ihi agbụrụ na okpukperechi - Ifeanyi Okowa

    Ifeanyi Okowa

    Ebe foto si, Ifeanyi Okowa

    Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa na PDP bụ Ifeanyi Okowa ekwupla na mmeri nke otu Peter Obi bụ Labour Party meriri na ntuliaka ọnwa Febụwarị bụ n'ihi agbụrụ na okpukperechi.

    Okowa kwuru nke a n'isi obodo Delta steeti bụ Asaba ebe ọ bụ Gọvanọ dịka ọ na-ekwu ebumnobi ya maka mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala ahụ.

    Cheta na Peter Obi meriri n'Abia, Ebonyi, Enugu, Imo nakwa Anambra.

    O merikwara na Delta, Cross River, Edo, Nassarawa steeti nakwa ndị ọzọ.

    "Site n'ọchịchọ obi ndị mmadụ ka onyeisiala ọzọ si na mpaghara ndida, okpukperechi nakwa agbụrụ so n'ihe ndị mmadụ lere anya" ka o kwuru.

    Osiso ndị 'Obidient' bụ ihe feere ebe niile n'ọwụwa anyanwụ nakwa ebe ọzọ na ndịda. Ndị mmadụ chọrọ Obi dịka onye mgbanwe. E kwere m na ndị mmadụ pụtara tuo vootu dịka ikike ha si dị mana Inec esoghi iwu debere ntuliaka bụ Electoral Act" ka o kwuru.

  18. Archbishop Maxwell Anikwenwa: Ihe ị kwesiri ịma n'ọnwụ ya

  19. Amaghị m ka e si chọta onye a sị chọrọ inye nwa m onyinye akịrị ya - Nwunye Ekweremadu

  20. 2023 Nigeria Election: Inec akwụsịla kọmịshọna ntuliaka Abia steeti ọrụ n'ike?