Ntuliaka 2023: E ji akụrụngwa ‘server’ Inec mee nrụrụaka na ngụkọ mpụtara ntuliaka a?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Fauziyya Tukur
- Ndị mere akụkọ a, BBC Disinformation Unit
Ndị nkwado ụfọdụ pati na-anọghị n’ọchịchị ji soshal midia na-ebo ebubo na ụfọdụ ‘ndị’, si n’ụzọ megidere owu wụba n’ime websaịtị Inec ma na etinye mpụtara ntuliaka sọrọ ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Websaịtị ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) nwere akụkọ ebe a na-etinye mpụtara ntuliaka nke ọha nwere ike ịhụ ka ya bụ mpụtara na-abata.
Mana websaịtị ndị mmadụ nọ na-ebo ebubo maka ya ma na-ekesa na soshal midia bụ nke adịgboroja ndị aghụghọ meghariri ka o yie nke Inec. Ya bụ ihe ka ndị na-ebo ebobo setere n’onyonyo na-ekesa dịka ‘ihe akaebe’.
Nnyocha anyị gosiri na enweghị ihe aghụghọ ọbụla megidere iwu na-eme na nzuzo n’ime websaịtị Inec dịka ụfọdụ siri chee.
Akụkọ ụgha banyere etu Inec siri jiri akụrụngwa ‘Bimodal Voter Accreditation’ (Bvas) pụtakwara na soshal midia nke mere ụfọdụ nke pati na-anọghị n’ọchịchị ji ekwu na ha ga-amalite ọgbaghara ma ọ bụrụ na ya ha na-akwado enwetaghi mmeri na ntuliaka a.

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Akụkọ pụtara na ya bụ ngwa ọrụ Inec arụghị ọrụ n’akụkụ ụfọdụ na Naịjirịa n’ihi nsogbu teknuzụ nakwa nsogbu enweghi ịntanetị.
Ụfọ ndị a ma ama na soshal midia, ji akara soshal midia ha ebo Inec nakwa patị nọ n’ọchịchị ugbua bụ APC ebubo atụmatụ ime nrụrụaka na ntuliaka 2023 nke mere ntụkwasị obi ụfọdụ ji adatu ugbua dịka ha na-arụ aka na Inec na-ele anya n’ihu arụ ọrụ ha ma na-ekwukwa na ha anaghị akwụbaakaọtọ n’ọrụ ha.
Soro akụkọ niile anyị na-ewetere gị banyere ntuliaka 2023 ebe a.