Ihe gọọmenti, ndịagha, ndị a ma ama kwuru gbasara ogbunigwe ndịagha tụrụ n'okeala Yobe na Borno Steeti

Ebe foto si, Hajiya Sa'adatu Maina
Onye ji pati Peoples Democratic Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Atiku Abubakar akatọọla ogbunigwe ndịagha Naịjirịa tụrụ n'obodo Jilli dị na mpaghara ọchịchị ime obodo Gubio dị na Borno Steeti.
O kwuru na ogbunigwe ahụ gburu ọtụtụ ndị ahịa aka ha dị ọcha abụghị naanị ihe mwute, kama, ọ bụ ịda mba dị egwu nke kwesịrị ịkpasu onye ọbụla nwere ezi uche iwe.
Dịka Abubakar si kwuo, mgbe ndịagha na-awakpo ndị nnupụisi, ụmụafọ Naịjirịa aka ha dị ọcha dabara n'ihe mbibi.
Atiku nyere ọmụmatụ na mba Amerịka wepụtara ụgbọelu ruru otu narị na iri ise ma mefuo narị nde dọla atọ iji zọpụta otu onye ọkwọụgbọelu ha tọrọ n'Ịran ma jụọ ajụjụ si "ruo ole mgbe ka ụmụ amaala ga-anọgide na-enweghị nchekwa n'aka ndị na-eyi ọha egwu nakwa site n'ọrụ ndị a haziri iji chekwaa ha"?
O zigaara ezinaụlọ ndị nke ha nwụrụ ozi nkasiobi tinyere obodo ndị ihe metụtara, ma kpọọ oku ka Naịjirịa were ihe gbasara nchekwa ụmụafọ ha kpọrọ ihe dị mkpa.

Ebe foto si, Atiku Abubakar/X
Ihe ndịagha Naịjirịa kwuru maka ogbunigwe a tụrụ na Yobe Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha elu Naịjirịa ekwuola na ha amalitela ime nnyocha dịka e kwuru na ọtụtụ mmadụ nkịtị nwụrụ oge e siri n'elu tụọ ogbunigwe n'ahịa n'ụbọchị Satọde 11 Eprel.
Ndị obodo na otu Amnesty International kwuru na ihe karịrị otu narị mmadụ tụfuru ndụ ha na mwakpo ahụ.
N'ozi ha wepụtara, ndịagha elu Naịjirịa kwuru na ha ezipụla ndị otu ha "ka ha mee ngwangwa gaa ebe ahụ ihe mere iji chọpụta nke bụ eziokwu gbasara ebubo ahụ".
Ndịagha elu Naịjirịa nọọrọ na mbụ kwuo na ha gburu ndị Boko Haram na mwakpo ha mere na mpaghara Jilli nke Borno Steeti.
Ha kwuru nke a oge ha na-aza ajụjụ ndị mgbasaozi Reuters gbasara ogbunigwe a sị ndịagha tụrụ n'ahịa dị n'okeala Yobe na Borno Steeti ma gbuo ndị nkịtị karịrị iri ise.
Nkwupụta ha emetụghị aka n'okwu banyere ịtụ ogbunigwe n'ahịa maọbụ ọnwụ ndị mmadu.
Ndịagha ekwughịkwa ihe ọzọ ọbụla mgbe a jụrụ ha ka ha kọwakwuo ihe merenụ oge ha mere mwakpo ahụ.
Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị nkwupụta gọọmentị wepụtara maka nnyocha doro anya, maọbụ nkọwa zuru oke banyere etu ndịagha siri rụọ ọrụ ahụ n'ụzọ ga-eme ka ọhanaeze mara nke bụ eziokwu.
Ndịagha elu Naịjirịa atụọla ogbunigwe n'ahịa dị n'okeala Yobe na Borno Steeti

Ebe foto si, Hajiya Sa'adatu Maina
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ si n'aka ndị obodo nakwa ụlọọrụ Reuters na-ekwu na ọtụtụ mmadụ nwụrụ mgbe ụgbọelu ndịagha Naịjirịa tụpụrụ ogbunigwe n'otu ahịa jupụtara na mmadụ na mgbago ugwu-ọwụwa anyanwụ.
Ndịagha tụrụ ogbunigwe ahụ n'ime abalị Satọde 11 Eprel 2026 na Yobe Steeti, oge ụgbọelu ndịagha nọ na-achụ ndị na-eyi ọha egwu n'otu mpaghara ndị Boko Haram na ISWAP na-emekarị mwakpo kemgbe ọtụtụ afọ.
Otu onye ntaakụkọ nọ na Damaturu, isi obodo Yobe Steeti gwara BBC na o nwetala ozi banyere mwakpo ụgbọelu ahụ, tinyere akụkọ na a kpọgara ụfọdụ ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ dị n'obodo ahụ. Mana ọ pụghị ikwusi ike ma mwakpo ahụ o mere na mberede.
Ndịagha ụgbọelu Naịjirịa kwuru na ha mere mwakpo megide ndị Boko Haram na mpaghara ahụ, mana ha ekwupụtabeghị ma ogbunigwe ha ọ dara n'ahịa maọbụ bute ọnwụ ndị nkịtị.
Ụfọdụ ụlọmgbasaozi na Naịjirịa na-ekwu na ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ nwere ike iru mmadụ iri ise maọbu iri isii, ma kwuo na ọ na-esi ike ịbanye n'ebe ahụ tinyere na e nwebeghị ihe gọọmentị kwurula maka mmadụ ole e gburu.
Mwakpo a metụtara Ahịa Jilli, nke dị nso na mpaghara ọchịchị ime obodo Geidam, n'akụkụ oke dị n'okeala Yobe na Borno Steeti, bụ ebe ndị Boko Haram kachasị akpa ike.
A na-enwe mgbagwojuanya gbasara ebe ahịa ahụ nọ, mana Reuters kọwara na obodo ọ nọ na ya bụ Yobe Steeti nke dị n'okeala ha na Borno.
Ndị bi n'obodo ahụ gwara Reuters na ozu tọgbọrọ ebe niile n'ahịa ahụ ka mwakpo ahụ gachara, ebe ndị gbanarịrị ọnwụ kọrọ na a kpọgara ndị nwere mmerụahụ n'ụlọọgwụ dị iche iche na Yobe nakwa Borno Steeti.



























