Ihe mere Atiku na ndị ọzọ ji hapụ PDP banye ADC

Ebe foto si, Dele Momodu/Atiku Abubakar/Instagram
Onye bụbu osote onyeisiala bụ Atiku Abubakar ahapụla pati Peoples Democatric Party (PDP) banye pati ADC.
Akwụkwọ ozi o degara onyeisioche PDP na wọọdụ ya dị n'okpuru ọchịchị Jada dị n'Adamawa steeti, Atiku kwuru na ihe mere o ji hapụ pati PDP bụ maka esemokwu dị na pati ahụ.
Ọ gara n'ihu kelee PDP maka ohere o nyere ya iji ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa malite na 1999 ruo 2007 ma zọọ ọkwa onyeisiala ugboro abụọ.
Onye ọzọ isi kara hapurụ PDP banye ADC bụ Dele Momodu.
Dele Momodu kwuru na ọ hapụrụ PDP maka na ọtụtụ ihe na-ezighị ezi na-aga n'ihu na pati ahụ. O kwuru na ihe ndị ahụ megidere iwu pati ahụ.

Ebe foto si, Dele Momodu/@omonlakiki/X

Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Peter Obi kwuru banyere ịzọ ọkwa Onyeisiala na 2027

Ebe foto si, Peter Obi/X
Dịka akụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ntuliaka afọ 2027 na-aga n'ihu na Naịjirịa, onye ji aha otu Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 bụ Peter Obi ekwupụtala ebumnobi ya banyere ntuliaka ahụ ma zaa ajụjụ ụfọdụ na-ajụ ma ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala ka ọ ga-abụ osote onyeisiala na ntuliaka afọ 2027.
Lee ọtụtụ ọkpụrụkpụ ihe Peter Obi kwuru banyere ntuliaka 2027.
Aga m azọ ọkwa onyeisiala na 2027
Na mkparịtaụka Peter Obi na ụlọmgbasa ozi Channels Tv nwere ụbọchị Sọnde 6 Julaị, 2025, o mere ka o doo anya na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2027.
N'okwu ya 'Ekwenyere m na m tozuru etozu ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2027".
Ọ gara n'ihu kwuo na ya agaghị abụ osote Atiku Abubakar maọbụ osote onye ọbụla. O mere ka o doo anya na enweghị onye ọbụla ya na ya nwere mkparịtụka banyere ịbụ osote onye ahụ na 2027.
Banyere okwu 'coalition' nakwa pati ADC, Peter Obi kwuru na ya ka bụ onye otu Labour Pati n'agbanyeghị na ọ na-akwado otu pati ADC nke ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị isi karaka kwuru na ha chọrọ ịnapụ pati Onyeisiala Bola Tinubu bụ APC ọchịchị na 2027.
N'okwu ya "Ana m akwado otu coalition iji họpụta onyeisiala nwere obi mmadụ ga-enweta ezi ọnọdụ ndị Naịjirịa.
Cheta na Obi hapụrụ pati PDP dịka otu ahụ họpụtara Atiku dịka onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 mana Onyeisiala Tinubu ji vootu dị pasenti 37 merie Atiku na Obi nwetara vootu dị pasenti 29 na pasenti 25 iche iche na ntuliaka ahụ.
Ọ bụ naanị afọ anọ ka m chọrọ
Peter Obi kwuru na ọ bụ naanị afọ anọ ka ọ chọrọ iji gbanwee ọnọdụ Naịjirịa ma nweta ezi ọchịchị nye ụmụafọ Naịjirịa.
"Achọghị m karịa afọ anọ. Aga m atọ ntụala ezi ọchịchị na Naịjirịa" ka Obi kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na "Ọ bụrụ na ọchịchị nọ ugbua ji naanị afọ abụọ mebie Naịjirịa, nke a gosiri na afọ abụọ zuru iji tọọ ntọala ezi ọchịchị maka na ihe ndị Naịjirịa chọrọ bụ onyeisiala nwere obi mmadụ, onyeisiala nwere nghọta".
Arụghị m ọrụ na gọọmenti Abacha
Peter gara n'ihu kwuo na ọ bụghị eziokwu na ya rụrụ ọrụ n'ọchịchị ndịagha nke Sani Abach bụ onyeisiala.
N'okwu ya, ọ kọwara na ya na ọtụtụ ndị ọzọ gakwuru Sani Abacha banyere ọnọdụ ọdụ ụgbọmmiri Naịjirịa ma wepụta atụmatụ iji hụ na a haziri ya etu o kwesiri.

Ebe foto si, Peter Obi/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ihe ọzọ Peter Obi katọrọ bụ ego gọọmenti na-emefu iji zụta ụgbọala 'bulletproof' nakwa ụgbọelu nke onwe onyeisiala.
O kwuru na oge ọ bụ Gọvanọ Anambra steeti, na ya ejighị ụgbọala nwere bulletproof eme njem.
BBC Igbo kpọtụrụ Ọkammụta Chinyere Stella Okunna rụrụ ọrụ dịka kọmishọna mgbasaozi, Kọmịshọna na-ahụ maka akụnaụba na nhazi ego nakwa 'Chief of Staff oge Peter Obi bụ Gọvanọ Anambra steeti, iji chọpụta ka okwu ahụ ọ bụ eziokwu.
Ọkammụta Okunna gwara anyị na oge Peter Obi bụ Gọvanọ, ọ naghị eji ụgbọala 'bulletproof' eme njem.
"Eziokwu bụ na ọtụtụ ụgbọala anaghị eso ya eme nje dịka Gọvanọ, ọ bụ naanị nnukwu ụgbọala jeep abụọ maọbụ atọ ka o ji eme njem dịka gọvanọ Anambra steeti", ka Ọkammụta Okunna gwara anyị.
O kwuru na ọtụtụ mmadụ hụrụ Peter Obi n'anya, ọ bụ nke mere egwu jighị atụ ya maka mwakpo ọbụla.
N'ịga n'ihu, Peter Obi kwuru na a họpụta ya dịka onyeisiala Naịjirịa, na ọ gaghị eji ụgbọelu nke onwe mee njem maka na ọ ga-ebuta imefu ego.








