Ndị Anambra achọghị onye na-asụ 'okpookpo oyibo' dịka Gọvanọ - Nicholas Ukachukwu
- Onye dere ya, Ngene Michael, Ifiokabasi Ettang and Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Journalists
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ebe foto si, Nicholas Ukachukwu/Instagram
Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu ekwupụtala ihe ọ ga-emere ndị Anambra steeti ma o nweta mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ a ga-eme na steeti ahụ na Nọvemba 8, 2025.
Na mkparịtaụka ya BBC Igbo nwere, Ukachukwu rụtụrụ aka n'ọtụtụ ihe dị mkpa ọ ga-eme n'Anambra steeti iji mee ka ndị Anambra rite uru ọchịchị onyekwuouche ya.
N'okwu ya 'Gọọmenti nọ ugbua na-adọghchi steeti anyị azụ, nke a bụ ihe m ga-agbanwe ma ọ bụrụ na m bụrụ Gọvanọ."
O mere ka o doo anya na ọchịchị ya ga-ahụ maka ezi ọnọdụ agụmakwụkwọ, ezi nchekwa, mmepe obodo nakwa atụmatụ ga-ewulite azụmahịa na mmepụta nke bụ ihe e ji mara ndị Anambra steeti.

Ebe foto si, Nicholas Ukachukwu/Instagram
Oge anyị jụrụ ya maka ebubo Valentine Ozigbo buru ya banyere igwu ya chandum na ntuliaka imeụlọ ahụ tinyere na o tozughị etozu ịzọ ntuliaka imeụlọ ahụ, Ukachukwu kwuru na "Ọ bụghị eziokwu, maka na ndị mere ntuliaka ahụ bụ ndị otu NWC pati ha kwesịrị ntụkwasiobi."
Ọ kọwara na okwu ahụ nọ n'ụlọikpe ugbua, bụ nke ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi.
Cheta na Nicholas Ukachukwu tuuru ugo na ntuliaka imeụlọ pati All Progressives Congress mere n'ogige Prof Dora Akunyili Women Development Centre Awka, Anambra Steeti, n'ọnwa Eprel 2025.
Nicholas Ukachukwu ji vootu dị 1,455 merie Valentine Ozigbo onye ritere naanị vootu 67 ebe Johnbosco Onunkwo Edozie Madu ritere vootu na vootu 8 iche iche na ntuliaka ahụ.
Anyị ga-enwetara gị ihe onyonyo mkparịtaụka a n'oge adịghị anya.









