Ihe mere n'ikpe Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit n'Ụlọikpe

Mmadụ atọ ahụ gọọmenti Anambra Steeti boro ebubo ime ọgwụ okeite nakwa ihe ndị ọzọ, wuchiri n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Awka isiobodo steeti n'ụbọchị Fraịde 12 Disemba, 2025.
Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit bịara n'ụlọikpe ahụ dịka ha na-arịọ arịrịọ beelu kemgbe a nwụchiri ha na mmalite afọ a.
Akụkọ kwuru na ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ n'ụbọchị Fraịde 19 Disemba, 2025. Ka ọ dị ugbua, mmadụ atọ ahụ ka nọ n'aka ndị ọrụ nchekwa wuchiri ha kemgbe.
Kedụ oge Akwa ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit ga-abịa n'ụlọikpe ọzọ?

Gọọmenti Anambra Steeti ga-akpụpụ Akwa ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit n'ụlọikpe ukwu dị n'Awka isiobodo steeti n'ụbọchọ Fraịde 12 Disemba, 2025 dịka ikpe ha na-aga n'ihu maka ebubo dị iche iche gọọmenti steeti ahụ boro ha nke gụnyere ime ọgwụ okeite nke gọọmenti steeti ahụ machiri ndị dịbịa ime.
Akụkọ kwuru na ụlọikpe ga-anụ arịrịọ beelu mmadụ atọ a rịọrịọ.
Cheta na gọọmenti Anambra Steeti nwụchiri ha na mmalite afọ a ma kpọchie ha kemgbe ahụ.
Mkpebi ụlọikpe banyere ntọhapụ beelu Akwa Ọkụkọ, Eke-Hit na Onyeze Jesus

Ụlọikpe Ukwu Anambra steeti dị n'Awka nke Ọkaikpe Jude Obiorah nọ n'isi ya, eyigharịala ụbọchị ikpe Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit banyere ntọhapụ beelu ha.
Dịka mmadụ atọ ahụ gọọmenti boro ebụbọ ime ọgwụ okeite nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ laghachiri n'ụlọikpe ụbọchị Fraịde 20 Juun, 2025, ndị Ọkaiwu na-anọchiteanya ha kwuru ka e nye ha ntọhapụ beelu mana Ọkaiwu na-anọchiteanya gọọmenti katọrọ nke a ma kwuo na gọọmenti achọghị inye ha beelu.
Ọ bụ nke a mere ka Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ yigharịa ikpe Eke-Hit na Onyeze Jesus ruo n'ụbọchị Fraịde 18 Julaị, 2025 ebe e tinyere nke Akwa Ọkụkọ n'ụbọchị Wenezde, 31 Julaị, 2025.
Oge BBC gara ịgba Ọkaiwu gọọmenti steeti bụ Alex Ejesieme (SAN) ajụjụ ọnụ, o kwuru na ya agaghị agwa ndị ntaakụkọ okwu.
Cheta na gọọmenti Anambra steeti nwụchiri Akwa Ọkụkọ, Eke-Hit na Onyeze Jesus n'ọnwa Febụwarị, 2025 maka ebubo dị iche iche e boro ha.

Lee ihe mere n'ikpe Akwa Ọkụkọ, Eke Hit na Onyeze Jesus

Ụlọikpe Ukwu Anambra Steeti dị n'Awka, eyigharịala ụbọchị ikpe Onyebuchi Okocha a maara dịka Onyeze Jesus, Chidozie Nwangwu e ji Akwa Okuko maara na Ekene Igbokwe Eze a maara dịka Eke-Hit gaa Fraịde 20 Juun 2025.
Ụlọikpe kpebiri nke a maka na mmadụ atọ ahụ abịaghị ụlọikpe oge a kpọlitere ikpe ha ụbọchị Fraịde 16, Mee, 2025.
Akụkọ kwuru na ụlọikpe ahụ enwetaghị ozi ọbụla banyere ihe mere ha ji abịaghị ụlọikpe.
Ọkaiwu Barth Ezedinobi na-anọchitenaya Onyeze Jesus kwupụtara mwute ha ma bo gọọmenti Anambra steeti ebubo ịkpụghachị aka elekere azụ n'ikpe ahụ.
Lee ebubo gọọmenti Anambra Steeti boro Akwa Ọkụkọ, Eke Hit na Onyeze Jesus

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọikpe Ukwu Anambra Steeti agbaala n'anwụ ebubo ndị ahụ gọọmenti steeti ahụ boro Onyebuchi Okocha a maara dịka Onyeze Jesus, Chidozie Nwangwu a maara dịka Akwa Ọkụkọ na Ekene Igboekweze e ji Eke Hit mara.
Cheta na kemgbe gọọmenti Anambra Steeti nwụchiri mmadụ atọ ahụ, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ajụjụ banyere ebubo ndị ahụ gọọmenti boro ha.
Na nkwupụta ha ụbọchị Fraịde 11 Eprel, 2025, ụlọikpe ahụ kwuru na gọọmenti boro Onyebuchi Okocha nke a na-akpọ Onyeze Jesus ebubo atọ nke gụnyere iji akara ịhụakwụkwọ soshal midịa ya na-akwalite ụzọ na-ezighị ezi e ji akpata ego.
Ekene Igboekweze bụ Eke Hit ka e boro ebubo asaa gụnyere iji ọgwụ ọtụmọọkpọ, ihiwe ụlọọgwụ adigboroja, ịkwalite ụzọ e ji enweta ego ngwa ngwa nakwa ebubo igbu nwa ya nwoke oge ọ na-achụ aja.
N'aka nke ọzọ, gọọmenti boro Chidozie Nwangwu ebubo iri nke gụnyere ime ọgwụ ọtụmọọkpọ, ịkwalite ụzọ e enweta ego na-ezighị ezi, ịtọ mmadụ, nakwa ihiwe ụlọọgwụ adigboroja ebe ọ na-enye ọgwụ n'enweghị ikike.
Ụlọikpe ahụ kwuru na tinye ụbọchị Fraịde 16 Mee 2025 dịka ụbọchị ọzọ ha ga-ekpe ikpe ahụ.
Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke Hit alaghachitela ụlọikpe maka ebubo gọọmenti Anambra Steeti boro ha

Gọọmenti Anambra Steeti nọrọ ụbọchị Fraịde 11 Eprel, 2025 bughachita Chidozie Nwangwu e ji Akwa Ọkụkọ mara na Ekene Igboekweze a maara nke ọma dịka Eke Hit na Onyeeze Jesus n'ọnwa Febrụwarị 2025 maka ebubo na ha na-eme ọgwụ okeite.
Cheta na gọọmenti kpụpụrụ ha Ụlọikpe Ukwu Anambra Steeti dị n'Awka isi obodo steeti ahụ ụbọchị Fraịde 4 Eprel 2025 mana ụlọikpe ahụ nyigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụ ụbọchị Fraịde 11 Eprel, 2025 iji nye ohere ka ha gbaa akwụkwọ ndị e kwesịrị nke ga-eme ga-ahụ na r kpere ikpe ahụ etu o kwesiri.
Ihe ụlọikpe kwuru n'ikpe Akwa Ọkụkọ, Eke Hit na Onyeze Jesus

Ebe foto si, ABS Awka
Ụlọikpe Ukwu Anambra steeti ebugharịala ikpe Akwa Ọkụkọ, Eke Hit na Onyeze Jesus ka ọ bụrụzie ụbọchị Fraịde 11, 20225.
Nke a bụ iji nye ohere ka e kpee ikpe ahụ etu o kwesiri.
Mgbe Akwa Ọkụkọ, Eke Hit na Onyeze Jesus wuchiri n'ụlọikpe

Ebe foto si, ABS Awka
Gọọmenti Anambra Steeti kpụpụrụ ha n'Ụlọikpe Ukwu Steeti ahụ maka ebubo ime ọgwụ okeite nke gọọmenti steeti ahụ machiri.
Ikpe ahụ bụ nke a nụrụ n'Ulọikpe Ukwu dị n'Awka isi obodo Anambra Steeti ụbọchị Fraịde 4 Eprel, 2025.

Ebe foto si, ABS Awka
Gịnị mere gọọmenti ji nwụchie mmadụ atọ a?

Ebe foto si, Instagram
Cheta na a nwuchiri Chidozie Nwangwu e ji Akwa Ọkụkọ mara na Ekene Igboekweze a maara nke ọma dịka Eke Hit na Onyeeze Jesus n'ọnwa Febrụwarị 2025 maka ebubo na ha na-eme ọgwụ okeite.
Nwuchi ha bịara dịka gọọmenti Anambra Steeti nke Gọvanọ Charles Soludo nọ n'isi ya wepụtara iwu n'ọnwa Jenụwarị 2025 iji megide ma gbochie mpụ na ọnọdụ enweghị nchekwa na echere steeti ahụ aka mgba kemgbe.
Lee ihe Iwu 'Anambra State Homeland Security Law 2025' kwuru

Ebe foto si, Charles Soludo/Facebook
Ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ nke gọọmenti Anambra steeti kwuru na aka ndị dibia adigboroja dị na ya.
Dịka Gọvanọ Soludi si kwu, ha hụrụ ihu agbara n'ọtụtụ ogige ndị ntọ ndị ọrụ nchekwa wakporo na steeti ahụ.
Ọ bụ nke a mere ka ụlọomeiwu Anambra steeti mepụta iwu Homeland Security Bill nke Gọvanọ Soludo binyereaka na ya n'ọnwa Jenụwarị 2025.
Iwu a bụ ebumnobi ya bụ ihiwe ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ Agunechemba. Mana mpaghara 18 iwu ahụ kwuru okwu banyere ịmachi ime ọgwụ ego na steeti ahụ.
Mpaghara a kwuru na 'Onye dibia ọbụla nyere mmadụ ọgwụ iji mee mpụ ọbụla, kpata ego n'ụzọ na-ezighị ezi emegidela iwu steeti ahụ.
Onye dị etu a nwereike ịga ụlọmkpọrọ ruo afọ isii maọbụ kwụọ ego ruru nde iri abụọ maọbụ ha abụọ.
Iwu a kwuru na iwu megidere onye ọbụla ikwu na na o nwere ikike pụrụiche, ebe onye ọbụla a nwụchiri maka nke ga-egosi na ikike ya bụ eziokwu. Ọ bụrụ na o meghị nke, onye di etu a nwereike ịga ụlọmkpọrọ ruo afọ isii maọbụ kwụọ ego ruru nde iri abụọ maọbụ ha abụọ.











