Chris Ngige: Ihe ndị ụlọikpe nyere iwu ka Ngige mee dịka a tọhapụrụ ya nwa mgbe nta

Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo dị n'Abuja enyela onye bụbu Minista ndị ọrụ bụ Chris Ngige beelụ.
Ọkaikpe Maryam Aliyu Hassan kwupụtara nke a n'ụbọchị Tọzde 18 Disemba, 2025 oge ọ na-achabi ikpe n'akwụkwọ Ngige tinyere ka e nye ya beelụ n'izuụka gara aga.
Cheta na EFCC nwụchiri ma kpụpụ Ngige ụlọikpe maka ebubo iji ọkwa ya dịka onye na-elekọta ngalaba 'Nigeria Social Insurance Trust Fund (NSITF) n'agbata ọnwa Septemba afọ 2015 na ọnwa Mee afọ 2023 lee anya n'ihu were nye ọrụngo ego ya dị ijeri naira abụọ na ụma abụọ(₦2.2 bn).
EFCC nyere Ngige beelụ n'oge mbụ ha nwuchiri ya n'ọnwa Septemba, 2025 mana minista ahụ jụrụ iweghachi akwụkwọ njirimara ya n'ụbọchị a kara aka, bụ nke mere ha jiri nwuchigharịa ya n'ụbọchị 10 Disemba, 2025.
Oge ọ na-achabi ikpe, Ọkaikpe Maryam kwuru na Ngige ga-erubeisi n'ọnọdụ EFCC jiri nye ya beelụ na mbụ, ma kwuo na ọ ga-akpọta ndị akaebe abụọ.
Dịka ọ chabichara ikpe ahụ, Ọkaikpe Hassan kwupụtara ụbọchị 28 na 29 Jenụwarị, 2026 dịka mgbe a ga-amalite ikpe Ngige maka ebubo nrụrụakaego EFCC boro ya.
Etu ikpe inye Chris Ngige ntọhapụ beelụ si gaa n'ụlọikpe ukwu n'Abuja

Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo dị na Gwarimpa n'Abuja ekwupụtala 18 Disemba, 2025 dịka ụbọchị a ga-achabi ikpe n'arịrịọ beelụ Chris Ngige.
Ọkaikpe Maryam Aliyu Hassan kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde 15 Disemba, 2025 oge ọ nụchara nrụrịtaụka ndị Ọkaiwu nọchitere anya Ngige na ụlọọrụ EFCC.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye nnọchiteanya Chris Ngige bụ Ọkaiwu Patrick Ikwueto rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ha nye onye ahụ bụbụ Minista na-ahụ maka ndị ọrụ beelụ n'ihi afọ ole ọ dị nakwa ọnọdụ ahụike ya.
Ikwueto kwukwara na Chris Ngige agaghị eri mbọmbọ ma ọ bụrụ na ụlọikpe nye ya beelụ.
Mana Ọkaikpe EFCC bụ Sylvanus Tahir gbara ụkwụ megide nke a, ma kwuo na Chris Ngige nwereike iri mbọmbọ ma gbagaa mba ofesi ma ọ bụrụ na e nye ya beelụ.
Oge ọ nụchara arụmarụ ndị Ọkaiwu abụọ ahụ, Ọkaikpe Maryam Hassan kwupụtara ụbọchị Tọzde 18 Disemba 2025, dịka mgbe a ga-achabi ikpe gbasara arịrịọ beelụ Ngige.
Cheta na mgbe ikpe ahụ chọrọ ibido ka Ọkaiwu na-anọchịteanya ụlọọrụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) bụ Slyvanus Tahir si n'aka onye ọrụ ya rịọ ụlọikpe ka e chere ya, nye ya nkeji iri na abụọ ka o nweeike rute n'ụlọikpe maka na o nwere ihe ndọghachiazụ n'okporoụzọ.
Ka ikpe ahụ mechere bido, Ọkaikpe Maryam Aliyu Hassan nụrụ ihe EFCC na-ekwu nakwa okwu Ọkaiwu na-anọchịteanya Chris Ngige tupu o kwupụta ụbọchị ọ ga-enye mkpebi banyere inye Ngige beelụ.
Ụlọikpe atụkpuola Ngige na mkpọrọ Kuje

Ebe foto si, Ngige, BBC
Ọkaikpe Maryam Aliyu Hassan enyela iwu ka e jichie onye bụbu Minista na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige n'ụlọmkpọrọ dị na Kuje.
Nke a mere n'ụbọchị Fraịde 12 Disemba, 2025 oge ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Ngige n'Ụlọikpe Ukwu nke Isi Obodo dị na Gwarimpa, Abuja n'ihi ebubo nrụrụakaego.
Ọkaikpe Aliyu Hassan kwuru na minista ahụ ga-anọgodu n'ụlọmkpọrọ Kuje ruo ụbọchị a ga-anụrụ arịrịọ beelụ ya.
Ka o sina dị, Hassan kwupụtara Mọnde 15 Disemba, 2025 dịka ụbọchị a ga-elebara okwu ahụ anya.

Ebe foto si, Fred Chukwuelobe
Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) were ike ịkpụpụ Dkta Chris Ngige bụbu Minista na-ahụ maka ọrụ ụlọikpe maka ebubo a mabeghị.
Dkta Chris Ngige rụrụ ọrụ mịnịsta ahụ n'oge ọchịchị Muhammadu Buhari bụbu Onyeisiala Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka Ngige gosipụtara ịtụnanya etu e si wakpo ụlọ ya ma nwụrụ ya ụbọchị Wenezde 'na-agbanyeghị na ya na ha na-akpa.
N'ụbọchị Wenezde ka ndị ọrụ EFCC ruru mmadu iri abụọ wakporo ụlọ Ngige dị n'okporoụzọ 'Justice Mohammed Bello Road' n' Asokoro, Abuja gaa nwụrụ ya.
N'ozi ọnụ na-ekwuru Ngige bụ Fred Chukwueloba wepụtara ụbọchị Tọzde, ọ gbaara ama a sị, "na Dkta Chris Ngige egosighị ịtụnanya etu e si nwuchie ya na-gbanyeghị na ya nweburu ohere isi n'ụlọ ya na-abịa maka okwu ya na ụlọọrụ ahụ."
"O kwere ghọta na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe oge ndị ọkaiwu ya ga-enwe ohere ịzatara ya ọnụ ya ma wnetara ya ohere isi n'ụlọ ya na-abịa ikpe ya."
Etu e si nwụrụ Ngige
Chukwuelobe gara n'ihu kọwapụta ihe ndị mere tupu ndị EFCC awụchie n'ụlọ ya "ka ndị agha na-aga ọgụ" n'ụbọchị Wenezde.
"Ndị ọrụ EFCC ruru 20 si mpaghara Wuse wuchiri ụnyahụ ka ndịagha na-aga ọgu ma kpụrụ Dkta. Ngige pụọ."
"E nyeghị ya ohere igbanwe uwe o ji nọrọ n'ụlọ ya kama ha kpụrụ ya n'ime akwa o ji ehi ụra abalị, dịka onye ezinaụlọ ya si kwuo."
O kwuru na Ngige nweburu ohere isi ụlọ abịa maka okwu ya na EFCC nwere tupu anwụchie ya ụbọchị Wenezde ma gwa ya ka o weta akwụkwọ njem ya.
Chukwuelobe kwuru na Ngige gawaburu njem nleta ahụike na mba Amerịka mana kwụsịtụ na Briten ebe o nọ akwụkwọ njem ya efuo nke mere ka ọ kwụsị njem ya ma nata akwụkwọ n'ụlọ nnọchiteanya Naijiria na Briten bụ nke o ji lọta Abuja.
"Ka ọ lagachiri Abuja, Ngige dere akwụkwọ ozi ọ chọrọ iwegara EFCC ịgwa ha maka akụkwọ njem ya furu efu, na ya enweghị akwụkwọ ya ga-ewetara ha tupu a kpụrụ ya."
Chris Ngige : Kedụ ndị nwụụrụ onye bụbụ Minista na-ahụ maka ọrụ n'ụlọ ya n'Abuja?

Ebe foto si, Federal Government
Akụko na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ṅgalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and Financial Crime Commission(EFCC) anwụchiela onye bụbụ Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Dkta Chris Ngige.
A nwụchiri Ngige n'ụlo ya dị n'okporoụzọ 'Justice Mohammed Bello Road' n' Abuja n' ụbọchị Wenezde.
Akụkọ na-efegharịbụ kwuburu na ndị ntọ tọọrọ Ngige n'ụlo ya dị n'Abuja n'abalị Wenezde.
Mana ọnụ na-ekwuru Ngige bụ Fred Chukwuelobe bụ onye gbara ama n' akụkọ ahụ na-efegharị bụ ụgha.
N'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi ya na Facebook n'abalị Wenezde, Chukwuelobe sịrị, " Ana m enweta oku n'aka ndị enyi na ndị ntaakụkọ n'otu awa gara aka bụ ndi na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na a tọọrọ Dkta Ngige bu bụ Minista na-ahụ maka ọrụ. Ngige na ndị ECC nọ, A tọghị ya."









