Ndị dọkịta Naịjirịa akagbuola abụbọọrụ ha gbara

Ndi dọkịta nwere mkpebi ịgba abụbọọrụ n'ofe Naịjirịa niile n'ihi ụgwọ gọọmenti akwụghị ha nakwa ntụgharị iwu gọọmenti banyere ndị ọrụ ahụike

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu jikọtara ndị dọkịta n'ụlọọgwụ Gọọmenti Etiti na Naịjirịa bụ 'Nigerian Association of Resident Doctors' (NARD) akagbuola abụbọọrụ ha gbara, dịka ha na Gọọmentị Etiti nwechara nkwekọrịta banyere ịkwụ ụgwọ e ji ha na ịkwalite ọdịmma ndị dọkịta.

Nke a na-abịa dịka ndị otu dọkịta ahụ na ndị ọchịchị gọọmenti 'National Executive Council (NEC)' nwechara nzukọ, ebe ha lebara anya na nkwa gọọmenti kwere ha, ma kpebie na ha ga-ebido mkparịtaụka ọzọ tupu ha emee ihe ọ bụla.

Ndị otu NARD kọwara na ha kwụsịrị ịgba abụbọọrụ ha n'ihi ọganihu e nwetara na mkparịta ụka ha na gọọmentị. Ha rụtụrụ aka na gọọmentị ekwela nkwa ịkwụ ụgwọ ọrụ na ụgwọ ndi ọzọ ekwesịrị ikwu.

Otu ahụ kọwakwara na esemokwu dị n'etiti ha na gọọmenti akwụsịbeghị kpamkpam mana ha gara n'ihu kwuo na ha nwere olileanya ọhụrụ n'ihi na gọọmentị egosila na ha adịla njikere ugbua idozi ihe niile na-enye ndị dọkịta Naịjirịa nsogbu.

Cheta na ndi dọkịta nwere mkpebi ịgba abụbọọrụ n'ofe Naịjirịa niile n'ihi ụgwọ gọọmenti akwụghị ha nakwa ntụgharị iwu gọọmentị banyere ndị ọrụ ahụike.

Chetakwa na kemgbe ọchịchị Bola Tinubu malitere, na ndị dọkịta agbaala abụbụọrụ ọtụtụ gburu n'ihi nghọtahie na emezughị nkwa gọọmentị kwere ha.

Gịnị mere ndị dọkịta jiri chọọ ịgba abụbụọrụ gburugburu Naịjirịa?

Otu jiktara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ na Naịjirịa bụ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) ekwuola na ha ga-amalite ịgba abụbụọrụ gburugburu Naịjirịa.

Dịka otu NARD siri kwuo, abụbụọrụ ahụ a na-amaghị mgbe ọ ga-akwụsị ga-amalite ma ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị n'ụbọchị Tuzde 7 Eprel 2026.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

NARD kwuru na abụbụọrụ a bụ maka mkpebi Gọọmenti Etiti ịkwụsịtụ mmejupụta usoro ego mkponyeaka a hazigharịrị ahazigharị bụ Professional Allowance Table, nke bụ otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwekọrịtara oge ndị otu ahụ gbachara abụbụọrụ n'afọ 2025.

Otu jikọtara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ nwere mkpebi a oge ndị isi ha nwechara nzukọ pụrụiche n'ụbọchị Satọde 4 Eprel 2026.

A tụrụ anya na abụbụọrụ a ga-akụsasị ọrụ nlekọta ahụike gburugburu Naịjirịa.

N'ozi ha wepụtara, nke Onyeisi ha bụ Dr. Shuaibu Ibrahim binyere aka na ya, ndị otu NARD kọwara ọnọdụ a dịka nke na-ekwesịghị ekwesị.

Ha tara Gọọmenti Etiti ụta maka ịmanye ndị dọkịta ịmalite abụbụọrụ ọzọ gburugburu Naịjirịa.

Dr. Ibrahim kwuru na nsogbu a sitere n'imejupụta usoro ego mkponyeaka a hazigharịrị ahazigharị bụ Professional Allowance Table, nke NARD na Gọọmenti Etiti kpara maka ya oge ha gbachara abụbụọrụ were ogologo oge n'afọ 2025.

Nkwekọrịta ha nwere oge ahụ gụnyere ibuli ụgwọọnwa ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ, nke metụtara ego mkponyeaka maka ọrụ, oge ọrụ, ịrụ ọrụ n'ime ime obodo nakwa ụgwọ ọrụ ndị a na-arụghị n'ụlọọgwụ.

Dr. Ibrahim kwuru na ọ bụ eziokwu na ha kwetara ịmalite mmejupụta nkwekọrịta ahụ n'ọnwa Jenụwarị 2026, mana e bugaziri ya n'ọnwa Febụwarị n'ihi ụfọdụ ihe ndọghachiazụ.

Ka ọ dị, NARD na-ebo ebubo na gọọmenti chọziri ịkwụsị atụmatụ ahụ n'ọnwa Eprel, bụ nke ha kwuru na na-akụnye ụkwụ na ntụkwasịobi, ma bụrụkwa nke megidere nkwekọrịta ndị ha nwere n'oge gara aga.

N'ihi nke a, ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ na-akpọ oku ka gọọmenti jiri ọsọ na ije tụgharịa mkpebi ahụ, ma kwụchapụ ha ụgwọ niile e jikọrọ ha.