Etu e si mee olili ozu Ifunanya Nwangene

A dọnyela ozu Ifunanya Nwangene n'ala
    • Onye dere ya, Michael Ngene
    • Ebeg o si, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10

Ndị ezinaụlọ, ndị enyi na ikwu na ibe gbakọrọ n'obodo Ụmụọkparangene Nara Unateze dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti n'ụbọchị Satọde 14 Febụwarị, 2026 iji kwanyere Ifunanya Nwangene ugwu ikpeazụ.

Mmemme ahụ malitere n'ụlọụka St Pius Catholic Church Nara Unateze ebe a nọ kaara ya ụka ikpeazụ.

Ọtụtụ ndị enyi ya nakwa ndị ihe ya na-amasị si ebe dị iche iche juputara n'igwe n'ụlọụka ahụ iji kwanyere Ifunanya Nwangene ugwu ikpeazụ ma.

Foto ndị ụkọchukwu kwụrụ n'ihu igbe ozu Ifunanya Nwangene oge a kaara ya ụka ikpeazụ.

Ụkọchukwu ụlọụka ahụ ji ohere ahụ kasie ezinaụlọ Nwangene na ndị enyi obi ma kọwaa mkpa ọ dị ikwenye na Chukwu ma nye ya ekene n'ihe niile.

Ndị egwu bịara ụka ikpeazụ ahụ, bụrụ abụ dị iche iche iji kwanyere Ifunanya bụ onye otu ha ugwu ikpeazụ.

Foto ndị choir na-agụ egwu n'ụka ikpeazụ a kaara Ifuananya Nwangene n'ụlọụka St Pius Catholic Church Nara Unateze

Ka a kachaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka ahụ, e bugara ozu ya n'ụlọ nna ya bụ Christopher Nwangene ebe a nọ kaa ụka olili ozu ya tupi e lie ya.

Ndị bịara mmemme ahụ na-eru uju, kọwara Ifunanya Nwangene dịka onye Chukwu nyere ezigbo olu ịgụ egwu ma kwuo na ọnwụ ya dị ezi mwute.

Ha jikwa ohere ahụ tie nne na nna Ifunanya na nwanne ya nwoke bụ Kingsley Nwangene aka n'obi maka ọnwụ nwa ha nwaanyị.

Foto Christopher Nwangene na nwunye ya Patricia Nwangene nne na nna Ifunanya. Nwa ha nwoke Kingsley Nwangene na ndị ezinaụlọ ha oge a kaara Ifunanya ụka ikpeazụ.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde 31 Jenụwarị ka agwọ tara Ifunanya n'ụlọ ya dị na mpaghara Lugbe n'Abuja, nke mere ka ọ gaa ụlọọgwụ maka nleta.

Ọ bụ n'ụlọọgwụ Federal Medical Center Abuja ka ọ nọ nwụọ.

Mmemme nkwanye ugwu ikpeazụ e meere Ifunanya malitere n'ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị 2026 dịka a kaara ya ụka ikpeazụ n'ụlọụka Immaculate Conception Catholic Church dị n'Abule-Oshun, Legọs Steeti bụ ụlọụka ọ na-aga na Legọs.

Ozu Ifunanya Nwangene oge a kaara ya ụka olili ozu n'ụlọ nna ya dị n'obodo Ụmụọkparangene Nara Unateze dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East n'Enugwu Steeti

A malitela ịkwanyere nwada Ifunanya Nwangene ugwu ikpeazụ ya

A malitela ịkwanyere nwada Ifunanya Nwangene ugwu ikpeazụ ya

A malitela ịkara Ifunanya Nwangene ụka ikpeazụ n'ụlọụka Immaculate Conception Catholic Church dị n'Abule-Oshun, Legọs Steeti.

Na mbụ ka ezinaụlọ Ifunanya Nwangene kwuru na ha ga-aka ụka akwamozu nwaada Ifunanya nwụrụ anwụ n'ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị 2026.

N'usoro oliliozu ezinaụlọ Nwangene wepụtara, ha kwuru na a ga-eli ozu Ifunanya n'ụbọchị Satọde 14 Febụwarị 2026.

Ifunanya Nwangene nwụrụ n'izuụka gara aga dịka agwọ abụọ tara ya n'Abuja.

Ifunanya Nwangene: Ihe ikpeazụ nwa anyị gwara anyị - Nne na nna ya

Aha onyonyo, Ifunanya Nwangene: Ihe ikpeazụ Ifunanya gwara anyị - Nne na nna ya
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nne na nna Ifunanya Nwangene ekwuola ihe ikpeazụ nwa ha gwara ha tupu ọ nwụọ n'ụbọchị Satọde 31 Jenụwarị, 2026.

Na mkparịtaụka ha na BBC News Igbo were, Christopher Nwangene bụ nna Ifunanya, gwara anyị na nwa ya kpọrọ ya n'ụtụtụ ụbọchị Satọde ahụ ma gwa ya na agwọ tara ya.

"Ọ gwara na agwọ ahụ tara dịka ọ na-ehi ụra n'ụlọ ya dị n'Abuja mana ọ gawara n'ụlọọgwụ iji nweta nleta".

Mazi Nwangene kọwara na ụlọọgwụ mbụ Ifunanya gara enweghị ọgwụ anti-venom.

"Ụlọọgwụ Federal Medical Center (FMC) dị n'Abuja bụ ụlọọgwụ nke abụọ ọ gara, ha gwara ya na ha nwere ọgwụ anti-venom".

Ọ gara n'ihu kọwaa na ya amaghị ihe mere ndị ụlọọgwụ FMC ji gwa Ifunanya kepụ ihe o kere n'aka ya iji gbochie nsị agwọ ahụ ịgazu ya ahụ.

Nne ya bụ Patricia Nwangene, kọwara Ifunanya dịka nwa na-atụ egwu Chineke.

"Ifunanya nwa m bụ nwa Chukwu nyere onyinye ịgụ egwu, o nwere ifụnanya ebe mmadụ ibe ya nọ, ọ na-atụ egwu Chineke ma bụrụkwa nwa nwere nrubeisi".

Patricia Nwangene kwuru na oge pụrụiche ya agahị echefu bụ oge Ifunanya kpọkọrọ ndị otu egwu ya iji tiere ya egwu n'oge emume ụka nne afọ 2025.

O kwuru na ozi ikpeazụ Ifunanya zitere ya bụ na 28 Jenụwarị, 2026.

"O zitere m ozi na e nwere ihe na-echu ya ụra n'ụbọchị ahụ".

Ụlọomeiwu Sịnetị enyela iwu ka e kesaa ọgwụ agwọ ọtịta n'ụlọọgwụ

Foto otiegwu a ma ama nwụrụ anwọ aha ya bụ Ifunanya Nwangene sere dịka ụgbọala nọ ya n'azụ na nke onyeisioche nke ụlọomeiwu Sineti bụ Godswill Akpabio

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook/ Getty Images

Ụlọomeiwu Sineti enyeela ministri ahụike na ọdịmma ọha na Naịjirịa iwu ka ha mepụta ma tinye iwu mba nke ga-ahụ na ụlọọgwụ dum nọ na Naịjirịa nwere ọgwụ mgbochi na ọgwụ e ji azọ ndụ gbatagbata kacha n'ụlọọgwụ ọha na eze na nkeonwe dị na Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ọ gachara abalị atọ nke onye otiegwu a ma ama bụ Nwaada Ifunanya Nwangene e ji 'Nanyah' mara, nwụrụ dịka agwọ tara ya oge ọ na-ehi ụra n'ụlọ ya n'ụtụtụ Satọde 31 Jenụwarị 2026

Mkpebi a sochiri ntụle nke onye omeiwu bụ Senatọ Adebule Idiat Oluranti kwadoro, nke kọwara mkpa ọ dị na gọọmentị etiti na nke steeti hụrụ na e nwere ọgwụ e ji azọpụta ndụ zuru oke na mpaghara mba Naịjirịa niile.

Onye omeiwu Idiat kwuru na Naịjiria na-ahụ mmụba nke ihe mberede ahụike, gụnyere agwọ ịta mmadụ, akpị ịta mmadụ, nsi, ịṅụ ọgwụ gabigara oke, na ụdị ihe ndị ọzọ na-eme ka mmadụ nwee nsogbu ahụike.

Ndị omeiwu Sineti gosipụtara nnukwu nwute gbasara ọnwụ Nwaada Ifunanya Nwangene, onye nwụrụ mgbe agwọ tara ya n'ụlọ ya dị n'isi obodo Abuja.

Ifunanya Nwangene: Anyị chọrọ ime nnyocha iji mara ihe gburu ya - Ezinaụlọ ya

Foto Ifunanya Nwangene sere dịka ọ nọ n'ihu ụgbọala. O yi ihe ntị ma na-achị ọchị.

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

Nna Ifunanya Nwangene bụ Mazị Nwangene agwala BBC na ezinaụlọ ya ga-eme nnyocha 'autopsy' iji chọpụta kpọmkwem ihe gburu nwa ya nwaanyị.

Oge ọ gwara BBC News Igbo okwu, Mazi Nwngene kọwara na ha kpebiri nke a n'ihi akụkọ dị iche iche banyere etu ụlọọgwụ Federal Medical Centre (FMC) dị n'Abuja si kpaa agwa oge Ifunanya rutere n'ụlọọgwụ ahụ n'ụbọchị Satọde, 31 Jenụwarị, 2026.

"Anyị chọrọ ịchọpụta ọgwụ ndị ụlọọgwụ ahụ gbara ya oge o rutere ụlọọgwụ ahụ nakwa ihe mere ha ji kepu ja ihe o kere n'aka ya iji gbochie nsi agwọ ahụ ịgazu ya ahụ".

Banyere ozi ụlọọgwụ FMC wepụtara maka ọnwụ Ifunanya, Mazi Nwangene kọwara na ozi nkọwa ahụ gosiri na ụlọọgwụ FMC na-achọ ichekwa onwe ha maka na o nweghị onye ọbụla jụrụ maọbụ gwa ha wepụta nkọwa ọbụla maka ọnwụ Ifunanya.

Ka ọ dị ugbua, Mazi Nwangene kwuru na ha ga-enweta ndụmọọdụ onye ọkaiwu iji mara etu ha ga-esi mee nnyocha autopsy ahụ.

E bulatara ozu Ifunanya Nwangene ma tinye ya n'ọba ozu dị n'Enugwu Steeti dịka a na-atụ anya ime nnyocha autopsy ahụ.

Ụlọọgwụ FMC Abuja akọwaala kpọmkwem ihe ha chọpụtara gburu Ifunanya Nwangene

Njirimaara ụlọọgwụ Federal FMC Abuja na Ifunanya Nwangene yi uwe na-acha mme mme.

Ebe foto si, FMC Abuja/Ifunanya Nwangene

Ụlọọgwụ Federal Medical Centre dị n'Abuja ekwuola ihe ha ma banyere ọnwụ otiegwu bụ Ifunanya Nwangene, onye nwụrụ n'ụlọọgwụ ahụ n'ihi agwọ tara ya.

Ha kwuru na ọ bụghị eziokwu na Ifunanya nwụrụ n'ihi enweghi ọgwụ mgbochi nsi agwọ a kpọrọ 'antivenom' gburu nwada ahụ.

Ha kwuru na ọ bụ ọnọdụ ọjọọ nke ahụike a kpọrọ 'neurotoxic complications' n'ihi agwọ ahụ tara ya bụ ihe gburu nwada ahụ.

Ụlọọgwụ a gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ gbara mbọ ịzọ ndụ nwada ahụ n'usoro na-achịkwa nlekọta ahụike mana o mechara nwụọ.

Ha gara n'ihu kwuo na akụkọ ahụ kwuru na ha enweghi ọgwụ mgbochi nsi agwọ bụ asị ọcha na ha kwụdosiri ike n'ịrụ ọrụ ha n'usoro iwu kwadoro.

Ha tikwara ezinaụlọ Ifunanya aka n'obi maka ọnwụ nwa ha nwaanyị.

E bulaala ozu Ifunanya Nwangene n'obodo ya dị n'Enugwu Steeti

Foto Ifunanya Nwangene

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

Akụkọ BBC na-enweta ugbua a bụ na e bulela ozu Ifunanya Nwangene n'Enugwu Steeti.

Onyeisi otu egwu Abuja Metropolitan Music Society (AMEMUSO) Choir Abuja bụ Sam Ezugwu gwara BBC na nna Ifunanya nyere iwu ka e bulata ozu nwa ya nwaanyị n'Enugwu Steeti dịka a gwara ya na ọ nwụrụ.

"Nna Ifunanya ji aka ya kpọọ ụgbọala ambulance ma si ka e bulata ozu ya n'Enugwu Steeti".

Ezugwu gara n'ihu kwuo na otu onye ezinaụlọ Ifunanya kwuru na ozu ya batara Enugwu steeti n'ụtụ Sọnde 1 February, 2026.

Ka ọ dị ugbua, e tinyere ozu Ifunanya n'ọba ozu n'Enuguw Steeti dịka ezinaụlọ ya na-akwado maka olili ya.

"Ifunanya Nwangene ji ụkwụ ya gaa ụlọọgwụ oge agwọ ahụ tara ya n'ụtụtụ Satọde"

Foto Ifunanya Nwangene ka o yi uwe na-acha ọbara ọbara

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

Akụkọ ọnwụ otiegwu nwaada Ifunanya Nwangene e ji 'Nanyah' mara, akpalịela ọtụtụ ajụjụ banyere ihe gburu ya na etu o si nwụọ.

Nchọpụta BBC News Igbo mere chọpụtara na agwọ tara ya n'ụlọ ya dị n'Abuja n'ụbọchị Satọde, 31 Jenụwarị 2026.

Dịka ozi nwanne ya nwoke bụ Kingsley Nwangene wepụtara n'akara Facebook ya si kwu, Ifuananya gwara ya na agwọ tara ya dịka ọ na-ehi ụra n'ụtụtụ Satọde.

"Ọ kpọrọ m n'ekwentị ma gwa m na agwọ tara ya dịka ọ na-ehi ụra n'ụlọ ya mgbe o ji ụkara gafee elekere asatọ nke ụtụtụ ma gwa m na o ji akwa kechie aka ya ma kwuo na ọ na-aga ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ".

Foto Ifunanya Nwangene na nwanne ya nwoke Kingsley Nwangene

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Kingsley Nwangene/Facebook

Kingsley gara n'ihu kọwaa na ya Ifunanya na-ekwu n'ekwentị oge ọ gawara n'ụlọọgwụ.

"Mụ na ya na-ekwu n'ekwentị dịka ọ gara ụlọọgwụ abụọ iji nweta ọgwụgwọ. Ụlọọgwụ mbụ ọ gara dị na mpaghara Lugbe mana ụlọọgwụ ahụ gwara ya na ha enweghị ọgwụ e ji egbochi nsi agwọ bekee kpọrọ 'anti-venom' ".

Ọ bụ nke a mere ka Ifunanya banye ụgbọala gawa ụlọọgwụ ọzọ iji nweta ọgwụ anti-venom ahụ.

Kingsley kwuru na ụlọọgwụ nke abụọ Ifunanya gara bụ ụlọọgwụ gọọmenti dị n'Abuja nke o rutere dịka ọ fọdụrụ nkeji ole na ole ka ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ.

O kwuru na ngwa ngwa o rutere ụlọọgwụ ahụ, ha malitere ịjụ ya ajụjụ dị iche iche.

"Ajụrụ m Ifunanya ka ụlọọgwụ ahụ enwere ọgwụ anti-venom, ọ gwara m na ndị ọrụ ụlọọgwụ sị na ha ga-enye ya drip".

Foto Ifunanya Nwangene na foto oge e tinyere ya drip n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Kingsley Nwangene/Facebook

"Ọ bụ otu dọkịnta n'ụlọọgwụ ahụ tọpụrụ ihe Ifunanya ji kechie aka ya iji gbochie asụ mmiri (nsi) agwọ ahụ ifesa n'ahụ ya".

Ọ gara n'ihu kwuo na "Oge Ifunanya gwara m na dọkịnta tọpụru ihe ahụ, obi ruru m ala maka na echere m na ụlọọgwụ ahụ ga-enye ya ezi nleta".

Kingsley gosikwara ihe onyonyo vidio Ifunanya sere oge ndị ọrụ ahụike tinyere ya drip n'aka.

O kwuru na ọ bụ oge ọgwụ drip ahụ malitere ime ịba ya ahụ nke mere ka ọ ghara ị na-ekwuzi ogwu nke ọma ka ọ kwụsịrị oku ekwentị ahụ iji nye Ifunanya ohere izu ike.

Kingsley kwukwara na ọ kpọtụụrụ otu onye ezinaụlọ ha bi n'Abuja onye mechara bịa ụlọọgwụ ahụ.

Kingsley kọwara dịka okwu ụgha ozi ndị ụlọọgwụ ahụ wepụtara banyere ọnwụ nwanne ya nwaanyị.

N'okwu ya "Ozi ahụ ndị ụlọọgwụ ahụ kwuru na ọ bụ maka na Ifunanya abịaghị ụlọọgwụ n'oge mere o ji nwụọ abụghị eziokwu".

Kingsley kwuru na Ifunanya na-ekwu okwu nke ọma oge o ji aka ya bịa ụlọọgwụ ahụ. O kwuru na ha bụọ na-ekwu n'ekwentị oge o rutere ụlọọgwụ ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya amaghị ihe mere ụlọọgwụ ahụ ji tọhapụ ihe ahụ Ifunanya ji kechie ebe ahụ agwọ ahụ tara ya ma.

Ihe onyeisi otu egwu Amemuso Choir kwuru

Foto Ifunanya Nwangene

Ebe foto si, Ifuananya Nwangene/Facebook

N'aka nke ọzọ, onyeisi otu egwu Abuja Metropolitan Music Society (AMEMUSO) Choir, Abuja bụ Sam Ezugwu gwara BBC na oge ya rutere n'ụlọọgwụ Federal Medical Centre dị n'Abuja, ọ hụrụ ndị dọkịnta na-eleta Ifunanya.

O kwuru na ndị ụlọọgwụ ahụ kwuru na ọ bụ nsi agwọ bekee kpọrọ 'anti-venom abụọ dị iche iche ka e kwesiri inye Ifunanya mana ọ bụ naanị otu ka ụlọọgwụ ahụ nwere.

N'okwu ya, "Agara m chọọ ebe m ga-azụta anti-venom nke ọzọ ụlọọgwụ ahụ na-enweghị mana tupu m ga-alaghachite n'ụlọọgwụ ahụ, Ifunanya anwụọla."

Ọ kọwara na ọnwụ Ifunanya dị ezi mwute.

Onye bụ Ifunanya Nwangene?

Foto Ifunanya Nwangene

Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

  • Ifunanya Nwangene bụ otiegwu e ji Nanyah Music mara.
  • Ọ gbara afọ 26 tupu ọ nwụọ.
  • Ọ bụ onye okpuru ọchịchị Enugu East dị n'Enugwu Steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum University of Nigeria Enugu Campus (Unec) ebe o nwetara nzere na ngalaba 'Architecture'.
  • Ifunanya Nwangene bụ onye otu egwu Abuja Metropolitan Music Society (AMEMUSO) Choir dị n'Abuja.
  • Ọ nwụrụ n'ụbọchị Satọde 31 Jenụwarị, 2026 n'ụlọọgwụ gọọmenti dị n'Abuja.

Ihe ndị ma Ifunanya kwuru maka ọnwụ ya

Dịka akụkọ ọnwụ Ifunanya Nwangene fesara ebe niile, ọtụtụ ndị enyi ya ekwuputala ezi mwute ọnwụ ya dị nye ha.

Otu enyi ya bụ Honest Onunwa, gwara BBC News Igbo na ọnwụ Ifunanya Nwangene bụ ihe a na-atụghị anya ya

"Nke bụ eziokwu bụ na enweghị onye tụrụ anya na ụdịrị ọdachi a ga-eme, ọnwụ Ifunanya dị m mwute.

Ozi otu Abuja Metropolitan Music Society (AMEMUSO) Choir nke Ifunanya so na ya wepụtara nke onyeisi ha bụ Sam Ezugwu binyereaka na ya, kọwara ọnwụ Ifunanya dịka nke dị mwute ma kwuo na Ifunanya bụ onye Chukwu ji ezi olu abụ gozie.

Chioma Ikwuagwu bụ onye ya na Ifunanya na-agọkọ egwu, kwuru na ọnwụ Ifunanya riri ya ọnụ.