Jnr Pope mechara nwụọ - Emeka Rollas

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
Igwe soshial midịa nwurula ọkụ maka akụkọ gbasara ihe mberede mere Junior Pope Odonwodo, onye ọbụla maama na Nollywood dịka Junior Pope na ndị ọzọ ebe ha gara rụọ ọrụ dịka ndị omenka.
Onyeisi otu na-ahụ maka ndị na-akpa agwa n'ejije Nollywood bụ Emeka Rollas ehichala ozi o zipuru na soshial midia ya na Jnr Pope dị ndụ.
Rollas gwara BBC mbụ na Junior Pope Odonwodo anwụọla ma mechaa zipu ozi na Jnr Pope dị ndụ.
Ugbua, ọzọkwa, o hichala ozi ahụ o zipuru na-ekwu na Jnr Pope dị ndụ.
Anyị kpọtụrụ ya ịchọpụta nke bụ eziokwu mana o zaghị ozi anyị.
Gịnị mere Jnr Pope na ndi ọzọ ?

Ebe foto si, Jnr Pope/Instagram
Nke bụ eziokwu bụ na akụkọ gbasara nwamadị ahụ karịrị akarị.
O nweghi onye mazi nke bụ eziokwu mana ọtụtụ ndị na-eme ejije na Nollywood n'Asaba ekwuola na nwamadị ahụ anwụọla.
Otu onye n'ime ha bụ onye a ma dịka Stanley ontop bụ onye mere onyonyo n'Instagram kwuo, 'Jnr Pope mechara nwụọ n'ikpeazụ'.
Dịka akụkọ dị icheiche si ekwu, Jnr Pope no n'ụzọ aga ebe ha na-arụ ọrụ ha na-ese onyonyo oge ụgbọ mmiri bu ha na ụgbọmmiri ọzọ sukorịtara ma kpunye n'ime mmiri.
Akụko ahụ kwuru na mmiri ha nọ n'elu ya bụ mmiri River Niger, ihe ịtụ n'anya bụ na o nweghi onye nọ n'ime ụgbọ mmiri ahụ yi akwa nchekwa ọbụla.
Nke a mere na oge ụgbọmmiri ahụ sukorịtara onwe ha, ndị nọ n'ime ya enweghi ihe ọbụla chekwara ha chacha.
Ndị ọzọ ha na ya so bụ otu nwada a na-akpọ Abigail Fredrick bụ onye na-eme ntecha n'ọrụ onyonyo ha bụ onye a na-ahụbeghi ozu ya nakwa onye ọzọ a na-akpọ Precious.

Ndị ọzọ bụ onye na-ahaziri ha onyonyo bụ 'director' na Bekee bụ Michael Akpan a na-akpo 'Movement sokwa n'ụgbo ahụ mana isi ya pụtara.
Akụkọ kwuru na ngwangwa ọ pụtara na mmiri ahụ, ọ hapụrụ onye niile laa n'ụlọ ya.
Otu onye isi ya pụtara bụ onye a na-akpọ TC Virus nke aha ya bụ TC Okafor.
Dịka akụkọ siri kwuo, na o jidere aka n'eriri ụgbọ mmiri nke ya na ụgbọ mmiri ha kụkọtara mana o kpughi na mmiri.

Ihe otu ndị ejije bụ Actor's Guild of Nigeria kwuru maka Junior Pope Odonwodo
Onyeisi otu jikọrọ ndị ejije Nollywood na Naijiria, 'Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas agbaala ama na Junior Pope Odonwodo, onye ejije Nollywood a sịbụ nwụrụ dị ndụ.
Rollas kwuru nke a n'ozi o wepụrata n'akara ọbaozi Instagram ya.
Rollas gwaburu BBC Igbo n'ekwentị na Odonwodo nwụrụ ụbochị Wenezde abalị 10 ọnwa Epureel n'Asaba n'ihe mberede ụgbọmmiri.
N'okwu ya; "eziokwu Junior Pope nwụrụ n'Asaba taa n'ihe mberede ụgbọmmiri."
"Anyị ebugala ozu ya n'ụlọozu n'Asaba."
"Mmadụ anọ ndị ọzọ bụ ndị o metụtara mana a hụbeghị ozu ha."
Mana n'ozi o wepụtara mgbede ụbọchị Wenezde, o kwugharịrị ma sị na Jnr Pope dị ndụ ma na-ata nleta n'ụlọọgwụ dị n'Asaba.
Ozi ahụ kwuru," Ọ dịghị Ihe Chukwu apụghị ime".
"Junior Pope dị ndụ."
"Ọ na-anata nleta n'ụlọọgwụ ugbua."

Ebe foto si, Emeka Rollas /Instagram
Ọ bụghị naanị Jnr Pope dabara n'ihe mbere ụgbọmmiri ahụ. Ha dị mmadụ anọ ihe ahụ metụtara, a gbapụtara otu nwoke na Jnr Pope.
A maghị ọnọdụ onye nke ahụ nọ ugbua. O nwebeghikwa ihe e kwuru maka mmadụ abụọ ndị ọzọ.
Ruo oge anyị bipụtara akụkọ a, a ka na-achọ ozu ha na mmiri.
Ihe Rollas kwuburu

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
Akụkọ gbakapụtara na mgbede Wenezde nke na ebo ebubo na onye ejije Nollywood a ma ama bụ Obumneme Odonwodo a ma dịka 'Junior Pope', nwụụ n'ihe mberedere ụgbọmmiri dịka ha gara ime ihe ejije n'elu Osimiri Naija(River Niger), dịka ihe onyonyo ebe a gụpụtara Odonwodo fegharịrị n'a soshal midia.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọdachị dagidere Pope na mmadụ anọ ndị ọzọ gara ime ihe ejije n'elu mmiri dịka ụgbọmmiri ha nọ na ya kpuru na mberede n'oke osimiri 'River Niger'.
Oge BBC Igbo kpọrọ Emeka Rollas ịmata n'akụkọ ahụ na-efegharị ọbụ eziokwu, o kwuru na ọ bụ eziokwu.
Rollas bụ onye gwara BBC na ya nọ Asaba gwuru na ha ebugala ya ụlọọzụ.
Ọ sịrị, "Eziokwu Junior Pope nwụrụ n'Asaba taa n'ihe mberede ụgbọmmiri."
"Anyị ebugala ozu ya n'ụlọozu n'Asaba."
"Mmadụ anọ ndị ọzọ bụ ndị o metụtara mana a hụbeghị ozu ha."
Ozi ikpeazụ Junior Pope hapụrụ n'akara ọbaọzi ya n' Instagram n'ụtụtụ Wenezde tupu ọdachi ahụ eme nke gosiri ebe ya na ndị ogbo ya nọ n'ụgbọ mmiri na-eme njem.
Nwa amadi ahụ gbara ama na ha na-eme ejije n'elu mmiri na-ejighị ihe nchekwa Bekee kpọrọ 'life jacket' kwuo sị, "Lee etu anyị si etinye ndụ anyị n'ihe oke egwu iji wetara ụnụ ihe obiụtọ."

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
Ọnwụ Junior Pope na abịa dịka ọdachi ọnwụ bagidere ndị ejije Nollywood.
N'izu ole na ole gara aga, Ndị ejije nwere agba na Nollywood bụ John Okafor a ma dịka 'Mr Ibu' na Amaechi Muonagor lakwuru ndị ichie dịka ha rịchara ọrịa nwa oge.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Junior Pope Odonwodo

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
- Ezigbo aha ya bụ Junior Pope Odonwodo.
- Ọ bụ onye Ukehe, n'Enugwu steeti.
- A mụrụ ya n'abalị asaa nke ọnwa Mee afọ 1984 na mba Kamerunu.
- Ọ gara akwụkwọ Praịmarị na Sekọndrị na Kamerunu.
- Mana ọ laghachi Naịjirịa, ebe ọ nọọrọ gụọ mahadum na 'University of Nigeria Nsukka' (UNN.
- Nwa amadị ahụ gụrụ 'Accountancy' banyere na Nollywood n'afọ 2006.
- O sonyeela n' ọtụtụ ihe ejije gụnyere 'Secret Adventures', 'Vengeance of Bullet', 'Mad sex', 'Bitter Generation'.
- Ọ lụrụ nwaanyị bụ Jennifer Awele Okpuno n'afọ 2014.
- Ha amụtakwara ụmụ atọ.









