Mercy Chinwo na di ya akpụpụla mmadụ ise n’ụlọikpe maka ikwu na nwa ha bụ nke Nathaniel Bassey

Mercy Chinwo na di ya

Ebe foto si, Mercy Chinwo/Facebook

Ụlọikpe Magistrate dị na Wuse Zone 2 Abuja akpọkuola mmadụ ise na-eji soshal midia agbasaozi ka bịara zara ọnụ maka imetọ aha oti egwu a ma ama bụ Mercy Chinwo na di ya bụ Blessed Uzochikwa.

N’akwụkwọ ikpe ahụ e wepụtara n’ụbọchị 3 Eprelụ 2024, ọkaikpe magistrate Emmanuel Iyanna gwara mmadụ ise ndị ahụ ka ha wuchie n’ụlọikpe n’ụbọchị 23 Eprelụ 2024 ka zaa ajụjụ maka imetọ aha ndị a.

Ndị ụlọikpe a kpọro oku gụnyere; Okoronkwo Ejike, Kingsley Ibeh, DJ SoiltKid, Terrence Ekot na Samuel Agozie.

Nke a na-abịa dịka otiegwu ahụ na nwunye ya wepụtara foto nwa nwoke ha mụrụ ọhụrụ n’Instagram. Ndị a ga-azara ọnụ ha malitere ikesa akụkwọ na-ekwu na nwata ahụ yiri nwa otiegwu a na-akpọ Nathaniel Bassey, ma sị na ọ bụ ya bụ nna nwa ahụ.

Mery Chinwo na di site n’aka ọkaiwu ha bụ Pelumi Olajengbesi gwara ụlọikpe na agwa ndị a kpara metọrọ aha ha, tụgide ha asị ma kpaa ha oke agbụrụ n’ịntanetị.

Ha gara n’ihu kwuo na o megidere iwu Naịjirịa ngalaba 391 nke ‘Penal Code nakwa ngalaba 24(1) nke ‘Cybercrimes, Prevention) 2015.

Cheta na Nathaniel Bassey n’onwe ya adịla mbụ mee mkpesa n’aka onyeisi ndị uweojii n’Abuja ma sị ha nyochaa mmadụ anọ n’ime ndị a maka imetọ aha ya.

Mana gịnị jikọrọ Mercy Chinwo na Nathaniel Bassey?

  • Ọ dị mma gbapụtara ihe dị n’etiti Mercy Chinwo na Nathaniel Bassey bụ ọdịmma nke mmadụ abụọ na-arụ otu ọrụ dịka ha abụọ bụ ndị otiegwu a ma ama n’iti egwu ụka Kraịst.
  • Ha abụọ etikọọla ọtụtụ egwu ọnụ nke otu n’ime ha bụ egwu a kpọrọ ‘Tobechukwu’.
  • A ma ha abụọ ama dịka ndị kwenye siri ike n’okpukperechi Kraịst ma bụrụkwa ndị a mụgharịrị ọzọ a kpọro ‘born again’.
  • Ha abụọ si na mpaghara 'South South' nke Naịjirịa, Mercy Chinwo bụ onye Rivers Steeti ebe Nathaniel Bassey bụ onye Akwa Ibom Steeti.

Nathaniel Bassey mere mkpesa n'aka ndị uweojii megide mmadụ anọ n'ime ndị a

Oti egwu ụka Kraịst a ma ama bụ Nathaniel Bassey

Ebe foto si, Nathaniel Bassey/Facebook

Nathaniel Bassey bụkwa otiegwu a ma ama dị mbụ degaara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ ka o nyochaa ma maa mmadụ anọ ikpe n’ebubo imetọ aha ya nakwa isu ya imi n’ịntanetị.

Nwamadị a degaara ndị uweojii akwụkwọ ahụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ site n’aka ndị ọkaiwu ya gụnyere Peter Abraham, Uche Mathew,Gbenga Agunloye na Anthony Abia.

Cheta n’izuụka gara aga, mmadụ anọ boro ebubo na soshal midia na ọ bụ Nathaniel Bassey mụrụ Mercy Chinwo nwa ya nwoke.

Ebubo ahụ wuru ewu na soshal midia ọkachasị na X

Ndị ọkaiwu ya gwara ndị uweojii ka leba anya n’akwụkwọ mkpesa ahụ ngwa ngwa bụ Bassey gbara megide mmadụ anọ gụnyere Okoronkwo Ejike, Kingsley Ibeh, Terrence Ekot na Dj Spoiltkid.

Cheta na Mercy Chinwo bụkwa onye a ma ama na-eti egwu ụka Kraịst wepụtara foto nwa nwoke nke ya na di ya mụrụ ọhụrụ na Fraịde 29 Maachị 2024 na soshal midia.

Kamgbe ahụ ka ndị a malitere ịkatọ foto nwata ahụ ma kwuo na ihu nwa ahụ yiri nke Nathaniel Bassey.

Akwụkwọ mkpesa ha gbara n'aka ndị uweojii

Ebe foto si, Fortress Link

Mmadụ anọ ndị a depụtara ihe dị iche iche n'akara soshal midia ha nke gbagidere ụkwụ na nwata ahụ bụ nke Mercy Chinwo mụtaara Nathaniel Bassey.

Ndị ọkaiwu Nathaniel Bassey kwuru na ọ bụ maazị Okoronkwo Ejike bu ụzọ wepụta ozi banyere nke a na sosha, ebe Kingsley Ibeh gosiri foto Bassey ma kwuo "lee onye bụ ezigbo nna nwata."

N'ozi nke ọzọ onye a kpọrọ DJ SpoiltKid gbadoro ụkwụ na ozi ahụ Okoronkwo Ejike wepụtara ma jụọ "Kedụ mgbe anyị ga-eme nyocha DNA?"

N'otu aka ahụ Terrence Ekot depụtakwara ozi ma kwuo "Lee foto etu nwa nwoke Mercy Chinwe si yie Nathaniel Bassey. Mmadụ abụọ na-arụkọ ọrụ ọnụ kamgbe ọtụtu afọ, kedụ ihe i cheere?"

Ndị ọkaiwu a gara n'ihu kwuo na ozi mmadụ anọ a wepụtara na soshal midia bụ ihe ọjọọ nke metọrọ aha na njirimaara Bassey

Ha kwuru na agwa dị etu a megidere iwu nke Naịjirịa ngalaba 373 na 375 nke a kpọro 'Criminal Code Act nakwa ngalaba 24(b) nke Cybercrimes (Prohibition, Prevention).

Ụfọdụ ihe ndị ị maghị maka Nathaniel Bassey

Oti egwu ụka Kraịst a ma ama bụ Nathaniel Bassey

Ebe foto si, Nathaniel Bassey/Facebook

  • Nathaniel Bassey bụ nwafọ obodo Ikot Ofon Ikono dị n’Uyo Akwa Ibom Steeti.
  • A mụrụ ya na Legọs n’ụbọchị 27 Ọgọstụ 1981.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Legọs, gụkwa na Lọndọn, ma gụọkwa banyere egwu na mahadum Middlesex.
  • Ọ malitere iti egwu n’ụlọụka bụ ebe o sooro ndị otu egwu a kpọrọ Rhodes Orchestra ma fụọrọ ha opi afọ abụọ.
  • Efere egwu mbụ Bassey tiri bụ n’afọ 2008 bụ nke ọ kpọro Elohim, nke o tiri na mba Saụt Afrịka.
  • Ọ malitere ọgbakọ ịgụ egwu na soshal midia nke ọ kpọro ‘HallelujahChallenge n’ọnwa Juun afọ 2017.
  • Nathaniel Bassey na-ede egwu, na-eti egwu, na-afụ opi ma bụrụkwa onye ụkọchukwu.