Otiegwu, ọgbaegwu, onye oziọma, onye ejije... Lee ọkpụrụkpụ ihe maka ndụ Chinedu Nwadike

Ebe foto si, Chinedu Nwadike/Instagram
Ndị Igbo na-ekwu okwu sị na ọnwụ na-eme ka obodo jụọ oyi, n'ezie ọnwụ Chinedu Nwadike emeela ka obodo jụọ oyi.
Chinedu Nwadike bụ onye ọtụtụ mmadụ ma dịka onye na-eti egwu ụka, nakwa onye na-eme ejije Nollywood.
N'ọdị nso a ka onyonyo ya gbasara na soshal midia ebe ọ na-yọ ndị mmadụ enyemaka ego iji nweta ọgwụgwọ maka ọrịa akịrị (kidney failure).
Mana n'ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Maachị ka akụkọ gbasara ọnwụ ya pụtara.
Ihe i kwesịrị ịma maka Chinedu Nwadike

Ebe foto si, Chinedu Nwadike/Instagram
- A mụrụ Chinedu Nwadike n'afọ 1983, nke pụtara na ọ gbara afọ iri atọ na itoolu tupu ọ laa mmụọ.
- Ọ lụrụ nwaanyị, mụọ ụmụ anọ, mana otu nwa ya bụ Ryan Obiajuru Chinedu Nwadike nwụrụ n'afọ 2020
- Chinedu Nwadike malitere ọrụ ịkpa ndị mmadụ obiọma (entertainment) dịka onye na-agba egwu
- Ọ gbara egwu n'ihe onyonyo ndị oti egwu dị icheiche dịka Gozie Okeke, Chineyere Udoma, na ndị ọzọ

Ebe foto si, Chinedu Nwadike/Facebook/Instagram
- O mechara malite iti egwu nke ya. Egwu ya kacha wuo ewu bụ nke ọ kpọrọ "Ọkụ gbajie aka ji ngọzị m"
- Chinedu Nwadike sikwa n'iti egwu banye ime ejije Nollywood. N'afọ 2018, o mere ihe ejije ebe o kere ekike dịka nwaanyị, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kọọ ya ọnụ.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onye oti mkpu ndị na-eme ndọrọndọrọ ọchịchị; ndị ọ kwadoro gụnyere Rochas Okorocha na Ifeanyi Ubah
- Chinedu bụkwa onye oziọma n'okpukerechi Kraịst, nke bekee na-akpọ 'Evangelist'
Ọrịa Chinedu Nwadike
Ọ bụ n'ọnwa Febụwarịa afọ 2022 ka akụkọ gbasara ọrịa Chinedu Nwadike malitere ịgbasa na soshal midia.
Onyonyo ya pụtara ebe ọ na-ekwu na ya nwere ọrịa metụtara akịrị ya nke bekee na-akpọ 'kidney failure'.
O kwuru na ndị dọkịta sị na a ga-etinyere ya akịrị ọhụrụ nke a na-akpọ 'kidney transplant' na bekee.
N'oge ahụ, BBC Igbo kpọrọ ya n'ekwentị, o wee kwuo na ya nọ n'ụlọọgwụ 'National Hospital' n'Abuja.
Ka izuụka olemole gachara, Chinedu Nwadike mekwara onyonyo ọzọ ebe ọ nọrọ kelee Andy Ubah, bụ onye omeiwu Naịjirịa, maka ịgbatara ya ọsọ enyemaka.
O kwuru na ya enwerela onwe ya n'ọrịa akịrị, mana na-agbakekwa obere obere.
Mana ka obere oge gachara, Chinedu Nwadike kwukwara okwu n'onyonyo wee sị na a chọpụtala na o nwere ọrịa kansa ọbara nke bekee kpọrọ 'leukemia'.
Ọ sị na ya na-adị nkwadebe ịga mba India ebe a ga-anọ gwọọ ya, mana nke a enweghịzi isi.
'Ọ bụ eziokwu, Chinedu Nwadike anwụọla' - Anyi Don

Ebe foto si, Chinedu Nwadike/Facebook
Onye oti egwu Ifeanyi Donatus, onye eji Anyị Don onye Ichaka mara, ekwuola na ọ bụ eziokwu na Chinedu Nwadike anwụola.
Ọ bụ n'ehihe ụbọchị Sọnde, Maachị 28, ka kepukepu bidoro fegharịwa na otiegwu ahụ anwụọla.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị, Anyi Don kwuru na ọ bụ eziokwu na Nwadike alaala mmụọ.
Anyi Don kwuru na akwụkwọ Chinedu Nwadike ga-eji gaa mba India ịnata ọgwụgwọ pụtara n'ụbọchị Satọdee, mana nwa amadi ahụ nwụrụ n'ụbọchị Sọnde.
Akụko na-ekwu na ọ bụ ọrịa kansa ọbara gburu ya.
Nwadike nọbu n'ute ọrịa, nke mere ka ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyemaka.









