City Boy Movement: Kedụ ndị a ma ama n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa so na ya?

Ebe foto si, Instagram
Kemgbe akụkọ banyere nhọpụta a họpụtara Obinna Iyiegbu e ji Obi Cubana mara dịka onye nchịkọta otu 'City Boy Movement' (CBM) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ọtụtụ ụmụafo Naịjirịa malitere ịjụ ihe 'City Boy Movement' bụ.
City Boy Movement bụ otu nkwado na-achụrụ Onyeisiala Bola Tinubu nta vootu maka ntuliaka afọ 2027.
Mana ozi anyị nwetara na websaịt City Boy Movement, kọwara otu ahụ dịka nke e hiwere iji kwalite ezi ọchịchị, ọdịmma nakwa ezi nnọchiteanya nye ụmụafo Naịjirịa niile.
Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na CBM bụ otu kwenyere na inye ndị ntorobịa ohere n'ọchịchị ma weta mgbanwe n'ọnọdụ akụnaụba ụmụ Naịjirịa niile.
Onye bụ onyeisi 'City Boy Movement'?

Ebe foto si, Francis Oluwatosin Shoga/Instagram
Ozi anyị nwetere na websaịt City Boy Movement kwuru na ọ bụ Francis Oluwatosin Shoga bụ onyeisi ha ebe Onyeisiala Bola Tinubu bụ nna ukwu 'Grand Patron' otu ahụ.
Nwa onyeisiala bụ Seyi Tinubu sokwa jiri ọkwa grand patron otu CBM.
Otú City Boy Movement nwere ndịisi na mpaghara Naịjirịa dị iche iche ma nwekwaa ndịisi na steeti niile na Naịjirịa.

Ebe foto si, Seyi Tinubu/Bola Tinubu/Instagram
Obinna Iyiegbu 'Obi Cubana'

Ebe foto si, Obi Cubana/Instagram
A bịa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ọ bụ Obinna Iyiegbu ji ọkwa dịka onyeisi CBM.
Ngwa ngwa ozi nhọpụta ya a gbara n'anwụ, ọ kpaliri ọtụtụ ụmụafo Naịjirịa ọ kachasị ndị ntorobịa ndị kọwara nhọpụta n'ụzọ dị iche iche.
Ebe ụfọdụ tọrọ ya, ndị ọzọ katọrọ ya. Mana onye bụ Obinna Iyiegbu?
Obinna Iyiegbu onye e ji Obi Cubana mara bụ onye ji ego achụ ego a ma ama.
Ọ bụ onye Oba dị n'okpuru ọchịchị Idemili Saụt nke Anambra Steeti.
A mụrụ ya na Eprel 12 1975. Ọ gara mahadum University of Nigeria Nsukka ebe ọ nwetere nzere sayensị ndọrọndọrọ ọchịchị nke bekee kpọrọ 'political science'.
Obinna Iyiegbu bụ onyeisi ụlọọrụ Cubana Group. Ụlọọrụ a na-eme ihe dị iche iche nke gụnyere ụlọọrụ oriri na ọṅụṅụ na mmepụta ihe e ji esi nri a kpọrọ blender na bekee.
Cubana Group arụkwa ihe e ji ege egwu Bekee kpọrọ 'speaker na headphones'.

Ebe foto si, Screenshot
Ha nwere mmanya dị iche iche ha na-emepụta ma na-ere.
N'afọ 2021, Obi Cubana malitere iwu ewu dịka o mere akwamozu nne ya bụ Uche Iyiegbu onye nwụrụ dịka ọ gbara afọ 75.
N'afọ 2025, Obi Cubana gbara afọ 50 ma chikọba nnukwu mmemme iji merube ya n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ Transcorp Hilton, dị n'Abuja.
Mmemme ahụ bụ nke wuru ewu na Naịjirịa niile maka na ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ bịara mmemme ahụ.
Ndị dị ka Pastọ Jerry Eze, Benjamin Kalu, Peter Obi Sịnetọ Enyinnaya Abaribe, Sịnetọ Chris Ngige, Emeka Ihedioha, Sịnetọ Dino Melaye, Kanayo O. Kanayo na ọtụtụ ndị ọzọ.
N'ọnwa Febụwarị 2026, Onyeisiala Tinubu họpụtara Obi Cubana dịka onyeisi otu City Boy Movement na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile nke mere ka ụfọdụ kwuo ihe dị iche iche maka nhọpụta ya.
Pascal Chibuike Okechukwu 'Cubana Chiefpriest'

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest/Instagram
N'agbanyeghị na ọtụtụ ndị Naịjirịa kọrọ ya ọnụ maka na o kwuru na ọ bụ Onyeisiala Tinubu ka ọ ga-akwado na ntuliaka ọkwa onyeisiala afọ 2027, Pascal Chibuike Okechukwu a maara dịka Cubana Chiefpriest ekwuola na ya ga-aga n'ihu kwado Onyeisiala Bola Tinubu maka na o kwenyere na ọchịchị ya bụ nke ga-enye ndị ntorobịa ohere isonye n'ọchịchị.
Cubana Chiefpriest bụ onye ji ego achụ ego a mụrụ n'Eprelụ 2 1981 n'Imo steeti bụ onye a ma ama ma bụrụkwa onye nwe ụlọ oriri na nkwari Hotel CP dị n'Owere, isiobodo Imo steeti, ụlọ oriri Donalds nakwa Xhrine dị n'Imo nakwa Asaba.
Ọ bụ ya bụ onyeisioche 'City Boy Movement' n'Imo Steeti.
Stanley Uzochukwu

Ebe foto si, Stanley Uzochukwu/Instagram
Stanley Uzochukwu bụ onyeisi ụlọọrụ Stanel Group.
Ọ bụ ojiegoachụego n'ihe gbasara mmanụ agbidi, ọrụugbo nakwa ụlọ oriri na ọṅụṅụ.
Ọ bụ ya nwe ụlọ oriri na nkwari Delborough Lagos.
A mụrụ ya na Julaị 30, 1984 na Krọs Riva steeti mana ọ bụ onye okpuru ọchịchị Nnewi Saụt dị n'Anambara steeti.
Cletus Uzoezie Oragwa 'Zenco'

Ebe foto si, Zenco/Facebook
Cletus Uzoezie Oragwa a maara dịka 'Zenco' bụ onye ojiegoachụego, si Ụkpọ dị n'Anambara steeti.
Zenco bụ onyeisi ụlọọrụ 'Zenco Group of Companies' nke na-eme ihe gbasara ụlọ, mmanụ agbidi, mmanya ọkụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
A mụrụ ya na Febụwarị 14 1972.
Ọ malitere iwu ewu n'afọ 2025 dịka o mere akwamozu nne ya nke dọtara ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa.
Ihe onyonyo Cubana Chiefpriest wepụtara n'akara Instagram ya, gosiri ọtụtụ ụgbọala Zenco zụtara iji kwado otu 'City Boy Movement' nke mere ka ọtụtụ malite ikwu okwu maka ya.
Elijah Onyeagba 'Ọgba ka Ịgba'

Ebe foto si, Elijah Onyeagba/Facebook
Elijah Onyeagba onye e ji Ịgba ka Ịgba mara, bụ onye maara ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara akụnaụba nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị si Anambra Steeti.
A mụrụ ya n'obodo Amovu dị n'Enugwu Ukwu. Ọ gara mahadum 'University of Nigeria Nsukka' ebe o nwetara nzere n'ihe gbasara akụnaụba.
Ọ rụọla ọrụ n'ụlọakụ dị iche iche na Naịjirịa ma nweta nzere dị iche iche maka ezigbo ọrụ ya.
Onyeagba ji ọkọlọtọ APC zọọ ọkwa ịnọchiteanya Anaocha, Dunukofia na Njikoka n'Ụlọomeiwu Nta Naịjirịa na ntuliaka afọ 2019.
Ọ dara ntuliaka ahụ mana Muhammadu Buhari bụ onyeisiala oge ahụ, họpụtara ya dịka onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Burundi n'afọ 2021.




























