Ihe mere m jiri buru ngwa ahịa m site n'ala Igbo gawa Legọs - Cubana Chiefpriest
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo na Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist na Video Journalist
Ojiegoachụego bụ Cubana Chiefpriest akọwarala BBC Igbo etu nsogbu nchekwa dị n'Orlu nakwa Orsu ji mee ka o bụgharịa ụlọahịa ya.
Na mkparịtaụka ahụ, o kwuru na ọnọdụ nchekwa ọjọọ achụọla ndị mmadụ ọsọ n'ọwụwa anyanwụ ma mee ka ha kwụsị ịla ụlọ.
Ọ sịkwa na nke ahụ mere ka o kwụsị ịrete ihe n'ahịa ọ na-azụ. "Igbo sị na mbụgharị ka eji ere mbe, ya mere m ji bịa Legọs butekwara ndị nke anyị ụdịrị ihe ahụ ha na-ahụ n'aka m n'Owere" ka ọ kọwara.

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest
Ọ dụkwara ndị mmadụ ndụmọdụ ha jiri iti vootu wepu ndị mmadụ n'ọkwa maọbụrụ na ha achọghịzi ha.
Cheta na naanị abali ole ma ole gara aga ka ndị ojiegbe amabeghi gburu ndị agha ise n'Aba dị n'Abia steeti.
Kemgbe ahụ ndị Aba chịobiha n'aka dịka ebe niile dara jụụ. Ndị agha fooro ntutu taa na ha ga-ememina ndị mere ihe ahụ dịka gọọmentị etiti katọrọ ya bụ ihe ma nye ndị agha ikike ịdakwasị ndị mkpara mkpa mkpa ahụ.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.



