Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa

Aha onyonyo, Etu ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu si emetụta ndụ m
Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa

Ụmụafọ Naịjirịa akọwaala etu ha siri hụta ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu dịka ọ nọrọla otu afọ.

Nke a na-abịa dịka 29 Mee 2024 ga-eme ya otu afọ ọ weere ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa.

Otu nwokoroọbịa a kpọo Yusuf Suleimon bụ onye nkwado Tinubu kwuru na afọ ejughi ya n'ọchịchị Tinubu n'ime otu afọ.

Nwamadị a kọwara na ọ malitere mgbe ọ nọ n'ụlọakwụwkọ Sekọndịrị na-akwado Tinubu ruo mgbe ọ gụchara akwụkwọ ma tinyekwa ego ya iji nkwado ya n'oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.

N'okwu ya "afọ ejughi m n'ọchịchị onyeisiala Tinubu n'otu afọ maka na ọtụtụ ihe ndị o kwere na nkwa, o mebeghi ha."

"O kwuru na ọ ga-ewepụta ọtụtụ ọrụ nye ndị ntoroọbịa mana a kwụsịrị m ọrụ n'afọ a, e nwekwara ọtụtụ ndị ntoroọbịa ọzọ na-enwezighi ọrụ ugbua."

Otu nwaanyị ọzọ kwukwara na oge ntuliaka na ọ kwadoro Tinubu mana ugbua na ihe isi ike akarịala ka ọ dịbu na mbụ.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;

"Afọ ejughi m n'ọchịchị Onyeisiala Tinubu n'ime otu afọ"

Aha onyonyo, "Afọ ejughi m n'ọchịchị Onyeisiala Tinubu n'ime otu afọ"