Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa
Ụmụafọ Naịjirịa akọwaala etu ha siri hụta ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu dịka ọ nọrọla otu afọ.
Nke a na-abịa dịka 29 Mee 2024 ga-eme ya otu afọ ọ weere ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa.
Otu nwokoroọbịa a kpọo Yusuf Suleimon bụ onye nkwado Tinubu kwuru na afọ ejughi ya n'ọchịchị Tinubu n'ime otu afọ.
Nwamadị a kọwara na ọ malitere mgbe ọ nọ n'ụlọakwụwkọ Sekọndịrị na-akwado Tinubu ruo mgbe ọ gụchara akwụkwọ ma tinyekwa ego ya iji nkwado ya n'oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.
N'okwu ya "afọ ejughi m n'ọchịchị onyeisiala Tinubu n'otu afọ maka na ọtụtụ ihe ndị o kwere na nkwa, o mebeghi ha."
"O kwuru na ọ ga-ewepụta ọtụtụ ọrụ nye ndị ntoroọbịa mana a kwụsịrị m ọrụ n'afọ a, e nwekwara ọtụtụ ndị ntoroọbịa ọzọ na-enwezighi ọrụ ugbua."
Otu nwaanyị ọzọ kwukwara na oge ntuliaka na ọ kwadoro Tinubu mana ugbua na ihe isi ike akarịala ka ọ dịbu na mbụ.
Kirie ihe ha kwuru n'uju;



