Bola Tinubu: Onye bụdị 'Agụ Bourdillon’ meriri na ntuliaka Naịjirịa

Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu

Aka chịburu Legọs steeti bụ Bola Ahmed Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ ndị otu patị 'All Progressive Congress'(APC) dịka a kpọpụtara aha ya taa bụ abalị asatọ nke ọnwa Juun afọ 2022.

Tinubu ji vootu 1271 n'ime 2230 ( nke karịrị pasent iri ise vootu a tụrụ) were merie Minista njem bụ Rotimi Amaechi bụ onye nwetara vootu 316, ebe Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo, nwetara vootu 235.

Ndi ọzọ ha na Tinubu zọrọ ya gụnyere Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Sen Ahmed Lawan bụ onye nwetara vootu 152; Gọv Yahaya Bello nke Kogi steeti nwetara vootu 47,Gọv Dave Umahi nke Ebonyi steeti nwetara vootu 38; Gọv Ben Ayade nke Akwa-Ibom nwetara vootu 37,Senator Ahmed Sani nwetara voootu anọ; Ogbonnaya Onu nwetara otu 1; ebe Emeka Nwajiuba bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ nwetara otu vootu; Pastọ Tunde Bakare, Rochas Okorocha, Jack Rich na Ikeobasi Mokelu enwetaghị vootu ọbụla ma ncha.

Okwu mmeri o kwuru ka a kpọpụtachara aha ya, Tinubu kwuru na ya atụghị anya na ya ga-emeri.

O kelere ndị wepụrụ onwe ha n'ụsọ iyi nye ya ohere dịka Badaru Abubakar, Seun Ajayi , Dimeji Bankole, Godswill Akpabio, Kayode Fayemi, na Uju Kennedy.

Ọ katọrọ ịkwọ aka ọbara n'ihi okpukperechi, ma kpọọ oku ka onye ọbụla gbaso ịhụnaya ma wezụga tigbu-zogbuo.

Lee ihe ndị ị maghị maka Tinubu

  • Tinubu bụ onye ndu otu APC n'etiti kemgbe afọ 2013 tupu ọ pụta ịzọ ikike ife ọkọlọtọ APC na ntuliaka 2023
  •  A ma ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị kajara aka dịka o nwere ego, a na-anụ aha ya , ọ bụkwa onye nwere ụmụazụ n'elu n'ala.
  • Tinubu bụ aka chibụru Legọs steeti dịka gọvanọ bido n’afọ 1999 ruo afọ 2007.
  • Ọ dị afọ 70 dịka a mụrụ ya n’ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị, 1952 n’Osun Steeti.
  • Nne ya bụ Abibatu Mogaji nke bụ onyeisi ahịa a ma ama.
  • Ọ bụ onye ngụkọ ego nke Bekee kpọrọ 'accountant' .
  • Ọ malitere ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị n’afọ 2012 n’okpuru pati 'Social Democratic Party'.
  • Dịka onye na-alụ ọgụ maka ikike dịị onye, Tinubu so na ndị otu 'National Democratic Coalition' bụ otu lụrụ ọgụ ka e nye Moshood Abiola bụ onyemeriri na ntuliaka onyeisiala Naịjirịa n’afọ 1993.
  • O so na ndị nwere agba gbakọtara hibe pati All Progressives Congress (APC) bụ nke chụpụrụ pati People's Democratic Party (PDP) n’ọkwa ọchịchị n’afọ 2015