Ndị omekome bịara inwuchi m n'Enugwu iji gbochie ọgbakọ ekpere Zion - Ebuka Obi

Foto Ebuka Obi na foto ọtụtụ ndị bịara mmemme ekpere ahụ

Ebe foto si, Ebuka Obi/Instagram/BBC

Nkọwa foto, Foto Ebuka Obi, onye ụkọ Chukwu na igwe mmadụ n'ama egwuregwu n'Enugwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisi ụlọụka Zion Ministry bụ Evangelist Ebuka Obi eboola gọọmenti Enugwu steeti ebubo na ha chọrọ iji aka ike kwụsị emume ekpere ọ chịkọbara n'ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe Stadium n'Enugwu n'ụbọchị Satode 21 Febụwarị 2026.

Kedụ ihe mere?

N'ụbọchị Satọde ahụ, dịka Ebuka Obi si kọwa, "Agwara m ndị ndu ụlọụka m n'Enugwu nke Brọda Romanus nọ n'isi ya, ka ha nweta ikike zuruoke tupu mụ abịa mee emume ọbụla n'Enugwu steeti".

O gara n'ihu kwuo na a kwụrụ ụgwọ niile ha kwesịrị ịkwụ ma kwuo na Komishọna na-ahụ maka egwuregwu bụ Lloyd Ekweremmadu nyere ha akwụkwọ ikike ịga n'ihu mee ọgbakọ ahụ.

Obi mere ka o doo anya na ya aghọtaghị ihe mere Komishọna ahụ na onyeisi nchekwa n'obi ọchịchị gọọmenti Enugwu jiri nye ntụziaka ka e gbochie mmemme ahụ.

"Agara m n'ihu kpọọ Gọvanọ Soludo, Gọvanọ Uzodimma, onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio na ọtụtụ ndị ọzọ, mana Gọvanọ Peter Mbah azaghị oku ekwe ntị ndị a niile kpọrọ ya".

Foto ndị bịara ọgbakọ ekpere Ebuka Obi mere n'Enugwu steeti

Ezigaara m Gọvanọ Peter Mbah ozi ka ọ chọpụta ndị nyere ntụziaka ka a kwụsi mmemme ekpere ahụ

N'aka nke ọzọ, Ebuka Obi kwukwara na ndị uweojii biara n'ụlọ oriri na nkwari ọ nọ na ya n'Enugwu ka ha nwuchie mana ọ gbara ọsọ gaa ebe ọzọ.

N'agbanyeghị ihe ndị a niile, ọtụtụ nde mmadụ gara n'ihu gbakọọ maka mmemme ahụ n'ama egwuregwu Nnamdi Azikiwe Stadium ebe ya bụ ekpere mechara mee.

Obi kwuru na o zigaara Gọvanọ Peter Mbah ozi ma gwa ha ka ọ chọpụta ndị ahụ nyere ntụziaka ka a kwụsi mmemme ekpere ahụ.

Onye omeiwu na-anọchiteanya Agwu n'ụlọomeiwu Enugwu steeti bụ Jane Ene bịara rịọ Ebuka Obi ka ọ gbaghara gọọmenti Enugwu steeti maka ihe ahụ mere ma kwuo na Gọvanọ Peter Mbah amaghi maka ntuziaka ahụ e nyere ka e gbochie ọgbakọ ekpere ahụ.

Ene kwuru na ya ga-etinye anya anya na mmiri ma chọpụta ndị ahụ na-achọghị ka ya bụ ọgbakọ ekpere gaa n'ihu nakwa ndị ahụ biara n'ụlọ oriri na nkwari inwuchi Ebuka obi.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Ebuka Obi

Foto Ebuka Obi oge ọ na-ekpe ekpere

Ebe foto si, Ebuka Obi/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onye ozioma Ebuka Obi bụ onye Uburu Ihejioffor dị n'Okpuruọchịchị Oru West nke Imo steeti.

O kwuru na ya dị afọ asatọ wee malite ịnụ olu mmụọ nsọ ka ọ na-agwa ya okwu.

Ọ bụzị oge ọgbara afọ iri na abụọ ka o jidere aka n'ebe ntụaja ma kwee nkwa atọ nke mbụ bụ na ya agaghị edina nwaanyị ruo mgbe ọ ga-alụ nwunye, nke abụọ - na ya agaghị elekwasị ego anya, nke atọ - na ọ gaghị apụ n'ụka Katọlik.

Nkwa ndị a ka o kwuru na o dobere ya rue ugbo a nke mere ndị na-eso ya jiri dị nde kwụrụ nde na Naijiria nakwa mbaụwa ndị ọzọ.

Ọ malitere Ekpere amụma ya a kpọrọ Zion Ministry n'afọ 2009.

Tupu ọ malite guzobe ekpere ahụ, ọ bụ onye na-azụ ahịa akụrụngwa latrik n'Idumota Lagos.

Dika o siri kọwaa, n'afọ 2009 ka mmụọ nsọ gwara ya kpọchie ụlọahịa ya gazie buru akwụkwọ nsọ ma na-agbasa ozioma.

O kwuru na ọtụtụ amụma ọ na-ebu nke e ji akatọ ya bụ ihe mmụọ nsọ Chukwu gwara ya kwuo.

Ebuka Obi kwuru na ọ gaghị ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ akwụkwọ nsọ maọbụ ebu amụma kama na ọ malitere ime ihe amụmụ mgbe ọ dị afọ asatọ.