“Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya ebe nne ya ka-adị ndụ” - Ebuka Obi

Aha onyonyo, “Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya ebe nne ya ka-adị ndụ”
“Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya ebe nne ya ka-adị ndụ” - Ebuka Obi

Onye mgbasaozi ọma a ma ama bụ Chukwuebuka Obi akọwaala ihe mere o jiri ekwusike na o nweghi onye ọbụla ga-ahụ nwoke n’anya karịa nne ma ọ bụgodi nwunye nwoke ahụ.

Na mkparịtụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru sị “nwunye gị agaghị e mere gị ihe nne gị ga-emere gị.”

Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụrụ na a tụgịde nwoke ahụ egbe n’isi, na ihe nwunye ya ga-eme bụ ibe akwa mana nne nwoke ahụ ga-asị kama a ga-agbagbu nwa ya ka a gbagbuo ya onwe ya.

“Nne gị nwereike ịnwụchitere gị ọnwụ mana nwunye gị agaghị eme ya.”

Ọ sị na okwu ya bụ maka ụmụnwoke na-eji nwunye ha edochi anya nne ha ọkachasị mgbe nwunye ha ka nọ ndụ ma ghara ileta ya anya, na ọ bụ arụ.

“Ọ bụ arụ nwoke iji nwunye ya edochi anya nne ya, ebe nne ya ahụ ka-adị ndụ”

Ebuka Obi

N’aka nke ọzọ, o tinyekwara ọnụ n’ihe banyere nwoke maọbụ nwaanyị idina ụdịdị ya ma sị na ọ na-ewute ya nke ukwuu.

Ọ jụrụ sị “Ị hụtụla ebe oke nkịta na-edina ibe ya, maọbụ ebe mkpị na-edina ibe ya? Ihe ndị ahụ bụ arụ.”

Ebuka Obi gakwara n’ihu katọọ mmetọ dị iche iche ndị mmadụ na-eme site n’aha ịkwako nke gụnyere nwoke ịracha ike nwaanyị.

O kwuru na ihe ndị ahụ bụkwa arụ ma sị na mmepe ọgbara ọhụrụ wetere nnukwu njọ karịa ihe ndị dị mma o wetere.

Ọ zakwara ajụjụ banyere ezinaụlọ ya ebe o kwuru na nne na nna ya ka-adị ndụ. Aha ha bụ Ogbueghi Vincent na Veronica Obi bụ ndị rụrụ ọrụ nkuzi ruo mgbe ha lara ezumike nka.

Ọ sị na nne na nna ya mụrụ ụmụ asaa, nwaanyị anọ na nwoke atọ.

Ọ sị na a mụrụ ha ụmụ ejima nwoke abụọ, ebe ha tọkwara ụmụeji nwoke na nwaanyị.

Kirie ihe ndị o kwuru n'uju;