Traditional Religion: Ihe mere ndị ntorobịa uka Kraịst ji alaghachị n'ụka omenala
- Onye dere ya, Uche Akolisa & Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & Video Journalist
Na mbido n'oge gboo, ndị Igbo na-ekpere chi ha site n'ụzọ omenala, mana n'ihe dịka afọ 1515, ndị Portugese wetara okpukpere ụka Kraisti n'ala Naijiria.
Ụka Kraịsti etoola na Naijiria nke na ndị nke Kraịsti arịla rue pasentị ịri anọ na ise na ụma Itoolu (45.9) na-ekpe ụka Kraist ebe, ebe pasent iri ise na atọ na ụma ise (53.5%) na-ekpe ụka Alakụba dịka World Fact Book si kwuo.
Mana ugbua, ọnụọgụgụ ndị nke Kraisti na-agbada dịka ụfọdụ ndị ntorobia na-ekpere Kraisti na-alaghachi n'omenala ndị nna ọchie. O doghị anya kpomkwem mmadụ ole pụọrọla.
Mana otu ajụjụ ọtụtụ ndị ọ na-agbagwojuanya na-ajụ bụ olee ihe mere na ụfọdụ ndị na-ekpere Kraisti ji atufu akwụkwọ nso, weghara ọfọ na ogu na nsonso a?

Ndị ọkammụta n'okwu okpukperechi na-ekwu na ndị isiojii bụbu ndị ụka Kraisti na ndi nke Alakụba na-alaghachi na okpukperechi omenala Igbo n'ihi mkpa nke ahụ maọbụ nke mmụọ.
"Ekpeela m ụka Kraisti afọ 28 tupu anya m were mepee, m were hụ na ndị nna naa anyị amagoro Chineke tupu ndị ụka ọbịa abịa(ụka Kraistị," bụ ihe Ejiofor Ezeaku gbara afo 34, bụ onyeisi otu ụka omenala nke ndị agba ọhụrụ a kpọrọ, Omenalabụzọeziokwu, si kọwaa njem nlọghachi ya n'ụka omenala.

Ọrịa, ụbịam na ihe isi na-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ tinye ụkwụ ebe ọbụla ha nwere olile anya inweta enyemaka.
Dịka Ezeaku rutụrụ aka n'ahụhụ ọha ndị mmadụ na-ata n'ihi ubịam na nsogbu ahuike kpalịitere ya ibido ụka omenala iji jikọọ ụmụ Igbo, ọ sịrị,".

Ebe foto si, Amaka Umeh
Amaka Umeh, bụ onye si na ụka Katolik gaghachi n'omenala na nsonso a gwara BBC Igbo sị na ọ bụ iji zaa oku ndi nna ochie kpọrọ ya mere o jiri hapụ okpukperechi nke Kraịst.
Mana otu okachamara n'okwu okpukperechi na mahadum 'University of Nigeria', Nsukka'(UNN) bụ Ven. Collin Ugwu kwuru na ọ bụ agwa ụfọdụ ndị ndu ụka ụka Kraịstị, oke ọchịchị nke ndị ntorobia nakwa ume ịda mba n'idowe iwu nke ndị otu Kraisti bụ ihe akpatara na ụfọdụ ndị ntorobịa na-alọghachị n'omenala.
Ugwu sịrị," Ndị ndu ụka abụghịzịkwa ndị a na-elekwasị anya."
I le ya anya n'elu elu, e nweghi nnukwu ndiiche di na usoro ofufe omenala agba ọhụrụ na nke ndị ụka Kraisti karia na umunwanyi na-eghewe isi ha ohe, ebe umunwoke na-ekpu okpu nwa agọrọ, ebe ha yiri onwe n'inye Chukwu okike otito, ikpe ekpere, gọọ ọjị ma rikọọ na inyerita onwe ha onyinye.
Mana ụfọdụ ndị na-ele ka ihe si aga n'obodo na-arụtụ aka na nlọghachi omenala so na ihe mere ka mpụ dịka ọgwụ ego nke a ma dịka 'okeite', igbu mmadụ, ntọ na mmadụ ifu efu na-arị ibe ya elu ugbua na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
N'afọ 2022, aka na-achị Anambara Steeti bụ Chukwuma Soludo,gbarụrụ ihu maka nlọghachị ndị ntọrọbia na-alaghachị n'ikpere arụsị na steeti ahụ ma kwee nkwa ibu agha megide ndị omekome, ndị dịbịa na-agwọrọ ha ọgwụ na steeti ahụ.
Mana Ezeaku kwuru hooha na ọgwụ okeite abụghị omenala.
Nlọchighazụ n'okpukperechi omenala dabanyere n'oge iti mkpu nnwereonwe Biafra na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria.
Ụfọdụ ndị ntorobia na-ahụta okpukperechi ụka Kraisti dịka alaka ọchịchị ndị ọcha ọkachasị ndị Briten bu ndị nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie na-ebo ebubo megidere ndị mpaghara ahụ n'oge Agha Biafra.
Kirie ya n'uju akụko a:






