Igbo culture: Ịtụ nzu, ịji akwụkwọ ube machie nkwụelu na ihe nrịbama ndị ọzọ dị omimi n'Ala Igbo na ihe ha pụtara

- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
N'ala Igbo, ụfọdụ mgbe ndị Igbo anaghị ekwu okwu gbowam.
E nwere ọtụtụ ihe nrịbama Igbo ji atụnyere ihe ha chọrọ ịkọwapụta nke bụ naanị ndị okenye maọbụ onye nwere akọ nwere ike inwe nghọta zuru oke ihe a na-arụtụ aka.
Lee ụfọdụ ihe nrịbama Igbo ji agwa ibe ha okwu:
1. Nkwụelu e ji akwụkwọ ube machie

Ebe foto si, Emmanuel Akosa
Nkwụelu bụ nnukwu ihe n'alụmdinanwunye n'ala Igbo, ọkachasị ma nwaanyị bunye onye chọrọ ịlụ ya mmanya na-egos na ọ nabatara ịlụ nwoke ahụ, nwaanyị ibula mamanya eji akwụkwọ ube machie ọnụ ya na-egosi alụlkwaghịm.

Ebe foto si, Igbankwunigeria
Onye ọkachamara n'ihe ọdịnala bụ Nze Ukaeje Duruagwu nke abụọ n'Umunakara, Imo steeti kọwara sị na, "akwụkwọ ube pụtara 'o bela'."
Na nso nso a, otu nwaanyị anyị achọghị ikpo aha ya agbarala aka di dịka o soro nne di ya jiri aka ya bụlara ndị mụrụ ya udu mmanya e tinyere ube, na amaghị ihe ọ pụtara.

Ebe foto si, Emmanuel Akosa/ Chibueze Ozo
Ọzọ yiri nke a na mpaghara ala Igbo ụfọdụ bụ nwoke ịkpọrọ nwuye ya buru manya gawa n'ụlọ ndị ọgọ ya n'ụbọchị Eke.
Dịka Duruagwụ si kọwaa, "I mee ya, ihe ọ pụtara bụ na ya bụ nwaanyị na ị lụchaala."
2. Ukwu unere a tọgbọrọ n'ama

Ebe foto si, Chibueze Ozo/Emmanuel Akosa
Unere bụ nnukwu nri n'ala Igbo; e nwere ike isi ya , sụọ ya asụ maọbụ hụọ ya n'ọkụ,rie.
Mana ị ma na ukwu ya unere mpụtara dị omimi n'ala Igbo.
A tọgbọọ ukwu unere e gbuturu n'ama, ọ na-egosi na a mụrụ nwa n'ebe ahụ.
Mgbe ụfọdụ mmadụ nwụọ, ọ bụrụ na a hụghị ozu ya, a na-etinye ogwe unere n' akpati, lie.
Duruagwụ kọẁara na nke a pụtara na ogwe unere na anọchite mmadụ.
Ụmụnwaanyị na-ejikwa mkpatụ oro(ululation) egosi ebe a mụrụ nwa ọhụrụ na mpaghara ụfọdụ n'ala Igbo.

Ebe foto si, Emmanuel Akosa
3. Ọmụ nkwụ
Ọmụ bụ ọdụ igu maọbụ igu akabeghị aka.
E ji ọmụ egosi ihe dị iche iche;ọmụ na-egosi ihe dị egwu.

E gee ọmụ n'ụzọmaọbụ n'ugbo, ọ pụtara 'onye abakwala maọbụ onye emetụkwala aka'.
Mana ndị agbara ọhụrụ na-etinye isi ebe ha ahụla, ị hụ ebe etunyere ọmụ, chebaa echiche ime iji mata ihe ọ na-egosi.

Ọmụ bụ ihe e ji egosi ihe dị egwu, iru ụjụ maọbụ mmachie.
Duruagwu kọwara sị, "Ala maọbụ ọhịa agbara ọmụ pụtara ‘abakwala’.”
"Ị hụ onye kpụ ọmụ n’ọnụ, ị ga-achara ya,ọ gaghị agwa gị okwu, ị gaghị agwa ya okwu"
4. Osisi ogirisi anọ e kere ọmụ

Ebe foto si, Emmanuel Akosa
Osisi ogirisi anọ e kere ọmụ n'etiti ma tinye ya ọjị atọ maọbụ asaa
pụtara ‘mkpesa kara aka,” nke a na-enye ma ọkwụ ịzọ ala maọbụ esemokwu ekwuorla okwu igbu mmadụ dịka Nze Duruagwụ si kọwaa.

Ebe foto si, Emmanuel Akosa
"O nwere ike a sịla na a ga-egbu mmadụ maọbụ a na- azọ ala."
”Onye a na-enye ya bụ okenye, Eze maọbụ onyeisi ndị nze.”
“Ihe ọ pụtara bụ na ihe ọbụla mere m, ọ dị gị n’aka.”
5. Ịtụ nzu maọbụ edo

Ebe foto si, Omenala Igbo bụ Eziokwu
Igbo na-eji nzu na edo ekpe ekpere.
Duruagwu kwuru sị, "Ebe ọbụla a kara izu maọbụ edo ọ bụ ihe ọma."
Ndị Igbo na-ede nzu, maọbụ 'powder' iji gosi 'ihe ọma'.
Dịka Duruagwu si kọwaa, "Ana a sị onye ihe ọma meere ya bịa manye aka n'ite ọmụmụ."
" Nzu ahụ na-egosi obi ịdị ọcha(purity). Onye obi ya adịghị ọcha anaghị ama aka na nzu."
A na-ama nzu maọbụ edo ebe a na-ekpe ekpere.
"Edo na-eme ka ihe doro edo, ebe a mara nzu maọb u edo.
6. Akụ ilu

Ọ bụrụ na ị bịa n’ụlọ mmadụ, ị biara ịjụ ese nwaanyị ị chọrọ ịlụ, enye gị akụilu, ihe ọ pụtara bụ gị agakwala n’ezinaụlọ ahụ.
Duruagwu sịrị, "Ihe akụ ilu na-ada n'ọnụ abụghị ihe ọ na-atọ."
Ihe ndị nrimaama ndị ọzọ gụnyere ịtụchi okporo ngwọ.
Duruagwụ kọwara na ụlọ ọbbụla a tuchiri okporo ngwọ mmadu agaghị ịba ya ọbuladị ma mmadụ anọ n'ụlọ ahụ.














