Egwu na-atụ m na Nnamdị Kanu nwere ike nwụọ na ụlọ nkpọrọ DSS - Mike Ozekhome

Onye isi ndị ọkaikpe na-ekwuchitere Mazi Nnamdi Kanu, bụ Mike Ozekhome, etiela nkpu arịrị na ọbụrụ na akpachaghị anya, na Mazị Nnamdi Kanu nwere ike ịnwụ na-aka ndị ọrụ nchekwa DSS n'ihi na ahụ mgbu ya dịzị oke njọ ugbua.
Ozekhome kwuru n'ụlọikpe Supreme Court ụnyaahụ na Mazi Nnamdi Kanu kwesiri ka awaa ya ahụ n'ụlọọgwụ ngwa ngwa iji chekwaba ndụ ya.
Ọ rịọrọ ka e buru Nnamdị Kanu ọsọ ọsọ bupu ya n'aka DSS, ma buga ya na Kuje Prison ebe a ga-ebido inye ya ọgwụgwọ ozugbo ozugbo.
Ozekhome gwara ha na anaghị ekpe ozu ikpe.
Mana ya bụ ụlọikpe zaghachiri Ozekhome na "Chukwu ga-edobe Nnamdi Kanu ndụ, ọgaghị anwụ na nkpọrọ".
E bugara ikpe ya ịbụzi Septemba, 14 2023.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor
Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwụpụtala iwe ya banyere etu ikpe ya adọtị ikpe ya ogologo oge.
Kanu kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde site n'ọnụ ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakọr dịka Ụlọikpe higharịrị ikpe ya gaa abalị 14 nke ọnwa Septemba afọ 2023.
Ejimakọr sịrị, " Esi m ebe m gara leta Nnamdi Kanu n'ogige ndị DSS n'Abuja pụta.
" Ezigbo obi adịghị Maazi Nnamdi Kanu mma maka nhigharị ụlọikpe Kachasị higharịrị ikpe ya rue Septemba 14."
A na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.

Ebe foto si, Aloy Ejimakor
A gbara ọsọ na Nnewi taa

Dịka ikpe Nnamdi Kanu bịara ụlọikpe taa, ndị a mabeghị ndị ha bụ gagharịị na-amanye ndị mmadụ nọọn'ụlọ nke butere ọsọ onye gghara nwaanne ya n'ebe ụfọdụ na Nnewi Amabra steeti n'etiti ụbọchị Tọzde.
Ndị bi na Nnewi gwara BBC na ọsọ tara n' 'Roundabout Nnewi' n'ihe dịka Elekere 11:22 nke ụtụtụ dịka ndị ha kpọrọ 'ndị agboro" na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ iji gosi nkwado nye Nnamdi Kanu bụ onye ikpe ya dara ụbọchị ahụ n'Abuja.
Ahịa azụchaghị ka ọ na-azụ, nke ụgbọala na-agba ka o kwesịrị.
Nke mere ka ọnụ ụgbọala rịa nke na isi Nnewi gaa ọka bụ nke e ji N700 rịrị rue N800.
Ihe mere e ji yigharịa ikpe Nnamdi Kanu gaa ọnwa Sepụtemba

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Eyigharịala ikpe Nnamdi Kanu gaa ụbọchị 14 nke ọnwa Sepụtemba, 2023. Ụlọikpe kachasị mere nke a ka a nụchara mkpesa gọọmentị Naijirịa.
Ọkaiwu gọọmentị bụ A. Gazali anabataghị mkpesa abụọ ọkaiwu Kanu mere nke bụ: ka a tọhapụ Kanu ka si n’ụlọ na-abịa ikpe ya nakwa ka e bupụ ya n’ụlọ mkpọrọ DSS ma buga ya n’ụlọikpe mkpọrọ Kuje Correctional Centre nke Abuja.
Gazali mere nke a n’ihi na ọ na o kwuru na ọ depụtabeghi asịsa okwu a ma rịọ ka ụlọikpe nye ya ruo abalị Fraịdee bụ abalị 12 nke ọnwa Mee, 2023 ka o mee nke a.
Ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome kwuru na ọ dị njikere ka ụlọikpe nụ mkpesa ndị a ngwa ngwa.
Ọ rịọrọ ndị ọkaikpe ahụ ka ha hibe ikpe gaa n’oge na-adịghị anya n’ihu ọnọdụ ahụike Kanu.
O kwuru "Ndị nwee m, ahụ adịghị Nnamdi Kanu, a sịịla ka awa ya ime ahụ mana e kweghi ya si ụlọ nga pụọ gaa nata ọgwụgwọ."
“Anyị na-arịọ ka e buru ya si ụlọ mkpọrọ DSS pụọ ma gaa nke Kuje Correctional Centre ka e nwee ike nye ya ọgwụgwọ.”
Mana ndị ọkaikpe ahụ labara anya n’akwụkwọ ha ma kwuo na naanị ụbọchị 14 nke ọnwa Sepụtemba bụ mgbe ha nwere oge ịnụ ikpe a.
Ha kwuru: “Ọrụ juru anyị aka n’ụlọịkpe a ugbua ọ kachasị dịka anyị na-elebaanya na mkpesa banyere ntuliaka.”
“Ọ naanị abalị 90 ka enyere anyị, nke a mere anyị ga-eji yigharịa ikpe a ruo ụbọchị 14 nke ọnwa Sepụtemba dịka ụlọịkpe na-aga ezumike”
“Ikpe a ga-abụ ikpe mbụ anyị ga-anụ ma anyị si ezumike lọta, anyị ga-anụ ya n’uju, Kanu agaghị anwụ n’ụlọ nga. Chukwu ga-edobe ya ndụ ọbara ya agaghị anọ unu n’aka.”
Etu a ka ụlọịkpe ahụ siri saa mkpesa Ozekhome.

Ebe foto si, Reuters
Ụlọikpe kachasị nụrụ ikpe gọọmentị nwere megide Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra, Ipob n'ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, 2023 a.
Otu ọkaikpe mmadụ ise bụ ihe nụrụ ebubo itoolu ọhụrụ gọọmentị Naịjirịa na-ebokwasị n’isi Kanu.
Ọ bụ n’ụbọchị 27 nke ọnwa Epre ka gọọmentị Naijirịa rịọrọ ụlọikpe ahụ ohere ka ha bụte ebubo itoolu ọhụrụ a.
Cheta na ụlọikpe mkpegharị nyere iwu n’ọnwa Ọktoba 2022 ka a họhapụ Nnamdi Kanu ma kagbuo ebubo ndị nọ ya n’isi.
Mana gọọmentị Naijirịa gara n’ihu jibodo Kanu n’ihi na ọ natara ikie 'Stay of execution' dịka ha kwuru na ha chọrọ ịgbagha mkpebi ahụ n’ụlọikpe kachasị.
Chetakwa na n'ọnwa Eprel a, ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa nyere gọọmentị etiti iwu ka ha weta ebubo itoolu ọzọ ha sị na ha chọrọ itinyekwu n'ebubuo ha na-ebo Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe Biafra.
Otu ndị ọkaikpe ise nke ụlọikpe kachasị, nke ọkaikpe John Okoro bụ onyeisi ya, nyere mkpebi ahụ n'ụbọchị Tọzde, dịka a malitere ịnụ ikpe dị n'etiti gọọmentị Naịjirịa na Nnamdi Kanu.
Dịka ikpe ahụ malitere, ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome gwara ụlọikpe na ya tinyekwara akwụkwọ ka e si n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS kpọpụ Nnamdi Kanu ma kpọga ya n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje ebe a ga-anọ leta ahụike ya anya nke ọma.
Ozekhome rịọkwara ka ụlọikpe kachasị mee ngwangwa n'itule okwu gbasara Nnamdi Kanu.
Mana ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Tijanu Gadzali kwuru ka ụlọikpe nye ya ohere ka o tinye akwụkwọ iji gbaghaa arịrịọ ahụ Ozekhome na-arịọ n'ihi na o tebeghị aka ọ malitere ọrọ n'ikpe ahụ.
Gadzali kwukwara na gọọmentị Naịjirịa nwere ebubo itoolu ọhụrụ ha chọrọ itinyekwu n'ebubo ha boro Mazi Kanu.
O dobeghi anya ihe ebubo itoolu ọhụrụ a bụ.
Na mkpebi ha, ndị ọkaikpe nyere Ozekhome ndụmọdụ ka o wepụ arịrịọ gbasara ịkpọpụ Kanu n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS kpọga ya ụlọ mkpọrọ Kuje maka na ọ ga-eme ka okwu ahụ tee aka, kama ka ọ gbado anya n'isiokwu mkpesa ya nke bụ ka a tọhapụ Nnamdi Kanu dịka ụlọikpe mkpeghari si nye iwu.
N'ihi nke a, ndị ọkaiwu ahụ yigharịrị ụbọchị ikpe ka ọ dị n'ụbọchị 11 nke ọnwa Julaị, iji nye ohere ka ọkaiwu gọọmentị etiti tinye akwụkwọ nke ya.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe pụtara n'ikpe Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Supreme Court n'ọnwa gara aga

Ikpe Mazi Nnamdi Kanu malitere n'ebe mbido afọ 2023 a.
E mechara yigharịa ya bụ okwu gaa ụbọchị 11 nke ọnwa Mee.
Ọ bụ otu n'ime ndị ọkwaiwu Mazi Kanu bụ Aloy Ejimakor gbara ama nke a n'akara Twitter ya.

Ebe foto si, Screengrab
Etu ndị ọrụ nchekwa si wụjuo ebe niile n'oge ikpe

Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa jupụtara n'okporoụzọ dị icheiche n'Abuja n'ụbọchị ahụ e kpere ikpe Kanu.
O kwuru:
"Ma ndị uweojii, ndị Road Safety, na ụfọdụ ndị agha nọchiri na mpaghara isi ụlọọrụ ndị uweojii, na mpaghara Ụlọikpe ukwu, na mpaghara 'Unity Fountain'," ka onye ntaakụkọ anyị kwuru.
"Mana o doghị anya ma ọ bụ naanị maka ikpe Nnamdi Kanu ka ndị ọrụ nchekwa a ji nọrọ ebe niile, maka na ndị agha Naịjirịa nwekwara emume ha na-eme n'ogige 'Eagle Square' nke dị nso na mpaghara ụlọikpe ahụ. Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-esonye n'emume ahụ."
N'oge mbụ, mgbe ikpe Mazi Nnamdi Kanu ka dị n'ụlọikpe ukwu (Federal High Court), ndị ọrụ nchekwa na-anọchị mpaghara ụlọikpe ahụ niile n'ụbọchị ọbụla Mazi Kanu ga-abịa ụlọikpe.
Ha na-egbochi okporoụzọ ka ndị ụgbọala si mpaghara ọzọ iji gbochie ọgbaaghara ọbụla nwereike ịdapụta site na ndị nkwado Mazi Kanu, bụ ndị na-ejupụta n'igwe na mpaghara ụlọikpe ụbọchị ọbụla Kanu ga-abịa ụlọikpe.
Mana oge ikpe Kanu gafere n'ụlọikpe mkpegharị, nke dị nso n'ogige isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja, ndị ọrụ nchekwa anaghịkwa adị ọtụtụ n'ogige ụlọikpe n'ihi na Mazi Kanu n'onwe ya anaghị abịazị n'ikpe nke ahụ, ọ bụ naanị ndị ọkaiwu ya na-anọchite anya ya.
Nchịkọta ebubo na ikpe gọọmentị Naịjirịa na-ekpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nigeria Govt
Mazị Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob), bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke ha kpọrọ mba Biafra.
Kanu, onye bụkwa nwaafọ mba Briten, na-esi n'ụlọọrụ redio a kpọrọ 'Radio Biafra' na-ezisa ozi ma na-akpọ oke ka Biafra bụrụ mba nọdụrụ onwe ya. Kanu na-akpọ Naịjirịa 'zoo' nke pụtara ebe obibi ụmụ anụmanụ.
Mana gọọmentị Naịjirịa machiri otu Ipob ma kpọọ ha otu na-eyi ndụ egwu.
N'ọnwa Ọkutoba afọ 2015, ndị ọrụ nchekwa jichiri Mazị Nnamdi Kanu n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja dịka o si mba UK lọbata Naịjirịa.
E jichiri ya n'ụlọ mkpọrọ ndị ọrụnchekwa nzuzo bụ 'Department of State Services (DSS) ma mechaa kpụpụ ya ụlọikpe ebe e nyere iwu ka e si n'ụlọ mkpọrọ DSS kpọfee Kanu n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja.
N'ọnwa Eprel 2017 ka ọkaikpe Binta Nyako tọhapụrụ Mazi Kanu n'ihi na ahụ esichaghị ya ike, ka o sizie n'ụlọ na-abịa ụlọikpe.
Ọkaikpe Nyako nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa ndị ntaakụkọ okwu, nakwa ka ọ ghara ịnọ n'ọgbakọ ọbụla ga-akarị mmadụ olemole. Mana gọọmentị Naịjirịa kwuru na Kanu erubeghị isi n'iwu ndị ahụ ụlọikpe nyere tupu a tọhapụ ya, nke a mere ha ji kpọọ oku ka e jidekwa ya ọzọ.
Mana n'ọnwa Sepụtemba afọ 2017, oge ndị agha Naịjirịa na-eme atụmatụ nchekwa ha kpọrọ 'Operation Python Dance' na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, akụkọ kwuru na ndị agha wakporo ụlọ Mazi Kanu n'obodo ya bụ Afaraukwu, Umuahia, Abia Steeti.
Nnamdi Kanu n'onwe ya kwuru na ndị agha ahụ gburu ọtụtụ mmadụ na mwakpo ahụ mana ya onwe ya mịpụrụ gbaa ọsọ.
Malite n'oge ahụ, onweghịkwa onye hụrụ Mazị Kanu anya ruo n'ọnwa Ọkụtoba afọ 2018 oge a hụrụ ya na mba Israel ebe ọ gara njem ekpere na Jerusalem.
Ọ gbara ọtụtụ gharịị etu Mazị Kanu si pụọ na Naịjirịa dịka ụlọikpe nyere iwu ka o debe akwụkwọ 'passport' ya n'aka ụlọikpe ahụ oge a tọhapụrụ ya.
Mazi Kanu mechara gafee London ma malitekwa ịgbasa ozi nnwereonwe Biafra.
N'ụbọchị 29 nke ọnwa June afọ 2021, Ọkaiwu kachasị nke Naịjirịa bụ Abubakar Malami kwuputara na gọọmentị Naịjirịa ejidekwala Mazi Nnamdi Kanu ọzọ na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.
O kwuru na ihe ha ji jichie Kanu bụ maka na ikpe ya ka na-aga n'ihu n'ụlọikpe Naịjirịa tupu ọ gbaa ọsọ, mana Kanu na ndị ọkaiwu ya na-ekwu na ọ bụghị ọsọ ikpe ka ọ gbara, kama ọ bụ ọsọ ịzọ ndụ ya ka ọ gbapụrụ oge ndị agha wakporo ụlọ ya na 2017.
Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu nakwa ụfọdụndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa na-ekwukwa na ọ bụ ntọrọ ka gọọmentị Naịjirịa tọọrọ Mazi Kanu na mba Kenya ma kpụlata ya n'ụzọ megidere iwu ba ụwa. Ha kwuru na ọ bụrụ na Kanu bụ onye kpara arụ na Naịjirịa, gọọmentị Naịjirịa kwesịrị idegara gọọmentị mba UK akwụkwọ ma gwa ha ka ha jide Kanu ma nyefee ya n'aka Naịjirịa ka e kpee ya ikpe, mana ebe Naịjirịa emeghị nke a, ọ pụtara na njide ha jidere Kanu dara iwu.
Oge ikpe Nnamdi Kanu malitere ọzọ n'Abuja na 2021, gọọmentị Naịjirịa wetakwara ọtụtụ ebubo ọzọ tụkwasị n'ebubo ndị ha boburu na 2015, nke wetara ọnụọgụgụ ebubo niile ha boro Nnamdi Kanu ruo 15.
Mana ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome gwara ụlọikpe ka ha kụchapụ ebubo niile a na-ebo Nnamdi Kanu maka na ha achịtaghị aja. N'ọnwa Eprel 2022, ọkaikpe Binta Nyako, kụchapụrụ ebubo asatọ n'ime ebubo 15 ah ma hapụ naanị asaa.
Nke a ejughị ndị ọkaiwu Kanu - Mike Ozekhome SAN na Ifeanyi Ejiofor - afọ, ha wee wega okwu ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
N'ọnwa Ọkụtoba 2022, ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo niile e boro Nnamdi Kanu ma nye iwu ka gọọmentị Naịjirịa tọhapụ ya na-egbughị oge.
Mana gọọmentị wepuru okwu ahụ n'ụlọikpe kachasị na-ekwu na o kwesịghị ka a tọhapụ Mazi Kanu. Ọ bụ okwu a ka a na-atule n'ụlọikpe kachasị ugbua.









