Ụlọikpe Mkpegharị agwala Nnamdi Kanu lawa, na ikpe amaghị ya

Ụlọikpe Mkpegharị nọ n'Abuja enyela ntuziaka ka a tọhapụ Nnamdi Kanu si na ikpe amaghị ya n'ụbọchị Tọzde, abalị 13, nke ọnwa Oktoba.
A kachapụla ebubo 15 niile goomenti Naijiria boro Nnamdi Kanu
Ụlọikpe mkpegharị nke Abuja akụchapụla ebubo ndị fọrọ n’ebubo ndị gọọmentị Naịjirịa nwere n’isi Nnamdi Kanu bụ onyendu otu the Indigenous People of Biafra (Ipob)
N’ikpe a ekpere n’ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 13 nke ọnwa Ọktoba, 2023 nke ọkaikpe Jummia Hannatu Sankeey nọ n'isi ya, ya ndị ọkaikpe abụọ ọzọ kwuru na nwụchị Nnamdi Kanu na mba Kenya na mkpọghachịte ya na Naịjirịa megidere iwu.
Ndị ọkaikpe ahụ nyere iwu ka a tọhapụ Kanu dịka ha kwusiriike na nwuchi ya megidere iwu.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Kanu n’afọ 2021 na mba Kenya ma bọkwasị ya ebubo 15 nke gụnyere ebubo ịkpa nkata ikposa ọchịchị Naịjirịa.
N’ụbọchị 8 nke ọnwa Eprel, 2022 ọkaịkpe kụchapụrụ ikpe asatọ n’ime 15 ahụ mana Kanu si n’aka ndị ọkaiwu ya nke onyeisi ha bụ Mike Ozekhome mere mkpea banyere ebubo ndị a nke akara ya bụ CA/ABJ/CR/625/2022, ma na-arịọ ka akụchapụ ebubo asaa fọrọ dịka ha achịtaghị aja.
Dịka ha mechara mkpesa a n’ọnwa Sepụtemba, e bubatara ikpe ahụ gaa taa bụ ụbọchị 13 Ọktoba bụ ụbọchị ụlọịkpe kwupụtara ma nye iwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu n’ihi na usoro nwụchi ya ezịghị ezi ma daa iwu.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ebubo 15 ndị ahụ ekwupụtaghị ebe, ụbọchị, oge nakwa ụdịrị mmehie a sị Kanu mere tupu a nwụchịe ya n’ụzọ dara iwu ma kọghachịte Naịjirịa.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ha gara n’ihu kwuo na gọọmentị Naịjirịa ekweghị kwupụta ebe a nwụchịrị Nnamdi Kanu agbanyeghị ụdịrị ebubo ndị ha boro ya ma kwuo na mkpọghachịte ya n’ụdịrị ‘ntọrọ’ megidere ikike dịrị ya.
Ha kwukwara na etu na usoro e ji nwụchi ma kpọghachite Kanu esoghi n’ihe ụlọikpe ukwu tinyere anya tupu amalite ikpe ya ikpe ebe ahụ nke na-ezịghị ezi dịka ha si kwuo.
Ndị ọkaikpe ahụ kwukwara na ụlọikpe ukwu ahụ etinyeghị anya n’okwu na inweta nakwa mgbado ụkwọ n’ikike nnwụchi Kanu gara adị ire naanị n’ala Naịjirịa ma kwuo na nke a mere na ikpe ahụ na-aga n’ihu n’ụlọịkpe ukwu nke Abuja kwesịrị ịkwụsịtugodi.
Cheta na Ozekohome kwuru na mkpesa ha gbadoro ụkwụ na akụkụ akara 15 nke iwu banyere nwụchị bụ ‘Extradition Act’ na gọọmentị etiti kwesịrị ikpechapụ Kanu ikpe nke nwere ebubo ise ha nwere n’isi ya tupu ọ gbapụ Naịjirịa.
Ọkaiwu gọọmentị Naịjirịa bụ David Kaswe kwuru n’ọnwa Sepụtemba na mkpesa ndị ahụ achịtaghị aja.
N'ikpe a, ọkaikpe mbụ na nke abụọ kwuru okwu kọwara na nke a pụtara na aga akwụsịgodị ikpe Kanu na-aga n'ihu n'ụlọikpe ukwu nke Abuja bụ ebe gọọmentị etiti Naịjirịa bugara ya bụ ikpe n'ihi usoro nwuchi ya ahụ dara iwu.
Ha kwuru na ikike ụlọikpe ukwu ahụ n'ịkpe ikpe a achịtaghịzị aja ma ncha.



Ebe foto si, Alex Ogbonnia
Etu ndị mmadụ si anabata ozi mpụtara ikpe a
Ọnụ na-ekwuru otu Ohanaeze ndigbo bụ Alex Ogbonnia gwara BBC Igbo na mkpebi a ụlọikpe mkpeghari mere akpatala ọtụtụ ọṅụ n’ama dịka o ji anya ya hụ ka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n’ụzọ kemgbe ozi mpụtara ikpe a gbara n’ọha.
Ọ gwara BBC Igbo “Ndị mmadụ na-enwe aṅụrị n’ihi ọgụ Kanu na-alụ abụghị ọgụ nke onwe ya mana ọ bụ nke mmadụ niile ọkachasị ndị ọbụla Naịjirịa na-akpagbu.”
Ọ gara n’ihu kwuo “Obi dị m mma maka etu ụlọikpe a siri were ịkwụwa aka ọtọ kpee ikpe a ghara ile ihu onye ọbụla anya”
Ogbonnia kwuru na ọṅụ juru ya obi n’ihi mpụtara ikpe a nwereike ịmetụta ntuliaka nke 2023 n’ụzọ dịka nnwụchi na ndobe Kanu n’ụlọ nga so n’ihe na-eche ndị mmadụ kemgbe banyere ntuliaka 2023.
Dịka ozi mpụtara ikpe a na-efesa, akụkọ aṅụrị nakwa ọṅụ na-adapụta ọkachasị n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo n’Umuahia gbara ama nke dịka o kwuru na ụda mkpọn’ala Bekee bụ 'Fireworks' na-akpọtụ n’akụkụ Afaraukwu bụ obodo Kanu dị n'Umuahia nakwa n’akụkụ Umuahia ndị ọzọ.
N’ogige ụlọikpe mkpegharị nke Abuja ahụ, ọtụtụ ndị nkwado Kanu pụtakwara n’igwe na-enwe anụrị ma na-agụ egwu ọnụ maka etu ya bụ ikpe siri gaa agbanyeghị na ekpechara ya bụ ikpe nke malitere n’elekere atọ nke ehihe n’ebe ime mgbede.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị


Ebe foto si, Reuters
Ụfọdụ ihe ndị dị mkpa n'ikpe mkpegharị a e kpere n'ọnwa Sepụtemba
- Ọkaiwu Mike Ozekhome bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu rịọrọ ka a tọhapụ ya o nwee ike si n’ụlọ na-abịa ma kwuo na ahụike ya dara ada.
- Ọ rịọkwara ka a kụchapụ ebubo ọhụrụ ndị nọ n’isi Kanu ma weghachite ndị nke ochie nọ n’isi ya n’afọ 2015 dịka o kwuru na ebubo ọhụrụ ndị a esoghị usoro iwu Naịjirịa nke gụnyere etu e siri nwụchie ya na Kenya mana ndị ọkaiwu na-anọchịteanya gọọmentị Naịjirịa bụ David Kaswe sara mkpesa ndị a ma kwuo na ya bụ mkpesa achịtaghị aja.
- Ọ gara n'ihu rịọ ka ha kpechapụ ikpe ha dị n’ụlọikpe ukwu nke Abuja. Nke mere ọkaikpe a jiri bugharịa ikpe a.
- O mekwara mkpesa ka e tinyeghachịe ebubo ise e dobere n’isi Kanu mgbe a wụchịrị ya n’oge gara (2015) tupu a nwụchịe ya ọzọ n’afọ 2021 ma kụchapụ ebubo asaa nọ n’isi ya ugbua dịka o kwuru na a tọrọ Kanu n’ụzọ na-ezịghị ezi nke o kwuru na gọọmentị Kenya amaghị maka ya.

Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa
Obere ntọala banyere ikpe a
- Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob), nke bụ otu na-achọ nwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Mana gọọmentị Naịjirịa machiri otu Ipob ma kpọọ ha ndị oyi ndụ egwu.
- N'afọ 2015, ndị uweojii nzuzo nke Naịjirịa bụ 'Department of State Services' nwụchiri Mazi Kanu oge o si mba UK ebe o bibu lọbata.
- A kpụpụrụ ya ụlọikpe, n'ihu ọkaikpe Binta Nyako, n'ihi ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịchutu ọchịchị onye kwuo uche ya.
- E jichiri Mazi Kanu n'ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja, ruo afọ 2017 dịka ikpe ya na-aga n'ihu, mana ụlọikpe mechara tọhapụ ya ka o sizie n'ụlọ na-abịa. Mana na 2017, Nnamdi Kanu gbara ọsọ na Naịjirịa dịka o kwuru na ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya igbu ya.
- Kemgbe ahụ, ikpe ya kwụsịtụrụ n'ụlọikpe Naịjirịa ruo ọnwa June 2021, mgbe a nwụchiri Kanu ọzọ na mba Kenya dịka o mere njem ebe ahụ.
- Gọọmentị Kenya kpụghachiri Kanu na Naịjirịa ebe e jichiri ya n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ma malitekwa ikpe ya ọzọ.
- Dịka ikpe a malitekwara ọzọ, gọọmentị Naịjirịa wetara ebubo iri na ise ọhụrụ n'ụlọikpe nke gụnyere mgbasa ozi iyi ndụ egwu na Naịjirịa, inye iwu ka ndịị mmadụ wakpo ndị ọrụ nchekwa ma gbuo ha, inye ndị mmadụ iwu ka ha mebie ụlọ na akụrụngwa gọọmentị na ndị ọzọ.










