Ihe megoro kamgbe otu afọ gọọmentị Naịjirịa nwụchigharịrị Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Govt
Taa bụ ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa June 2022, ka o mere otu afọ kpọmkwem kamgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchigharịrị Mazi Nnamdi Kanu, onye isi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).
Ọ bụ na Kenya ka a nwụchiri Mazi Kanu dịka ndị ọkaiwu ya na ndị nkwado ya na-ekwu na ọ bụ ntọrọ ka gọọmentị Naịjirịa tọọrọ nwa amadị a.
Kamgbe e jichichara Kanu, gọọmentị akpọpụla ya ụlọikpe ebe ha boro ya ọtụtụ ebubo, nke gụnyere iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatụ gọọmentị.
Mazi Kanu ekwuola na aka ya dị ọcha.
Gịnị merela kamgbe ahụ?

Ebe foto si, Screengrab
Ọtụtụ ihe emeela kamgbe e jichiri Kanu, ọ kachasị etu o si metụta ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọwụwa Anyanwụ.
Cheta na tupu a nwụchie Mazi Kanu, o hibere otu nchekwa nke ọ kpọrọ 'Eastern Security Network', bụ ndị ọ sị na ha ga na-echekwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'aka ndị ọchịehi na ndị na-eyi ndụ egwu.
Mana ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu ESN a bụ ndị na-eyizi ndị mmadụ egwu ugbua na mpaghara ala Igbo niile.
Ọtụtụ obodo n'ala Igbo dịzị ka ebe a gbara ọsọ agha ugbua, maka mkpamkpa ndị ekperima a na-akpọ 'uknown gunmen' na-akpa.
Ndị ekperima egbuola ọtụtụ mmadụ ma mebie ọtụtụ ụlọ gọọmentị nakwa nke ndị uweojii.
Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ndị IPOB na ESn ebubo maka ihe ọjọọ ndị a, mana ugboro ugboro ka ndị otu a gọọrọ ọnụ ha ma kwuo na aka ha adịghị na ya.
Sit-at-home' kwa Mọnde ọbụla

Iji gosi iwe ha maka nnwụchi a nwụchiri onyeisi ha, ndị otu IPOB kwuru na a ga na-enwe ọnọdụ onye apụla ezi kwa Mọnde ọbụla, na mpagha Ọwụwa Anyanwụ niile.
Ya bụ ihe ka na-emerịrị ruo taa, n'agbanyeghị na ndị isi Ipob mechara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ.
Kama ndị IPOB kwuru na ụbọchị ọbụla Mazi Kanu ga-aga ụlọikpe ga-abụrịrị ụbọchị 'sit-at-home'.
Mana ndị ekperima ka na-eyi ndị mmadụ egwu kwa Mọnde ọbụla ma onye ọbụla kachie ntị pụta ezi.
Mọnde ugbua bụzị nnukwu ụbọchị ezumike n'ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, karịarị ma ụbọchị Sọnde.
N'afọ gara aga, gọọmentị Anambra steeti mechara tie iwu na ụmụakwụkwọ ga na-agazi akwụkwọ n'ụbọchị Satọde, n'ihi na ndị Ipob ewerela ụbọchị Mọnde.
Ikpe Kanu malitere ọzọ

Cheta na gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Kanu nke mbụ n'afọ 2015 ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Mana na 2017, Kanu si na Naịjirịa gbaa ọsọ ndụ, dịka o kwuru na ndị agha wakporo ụlọ ya n'Afara Ukwu dị n'Umuahia iji gbuo ya.
Ya mere, oge e jidere ya ọzọ na Kenya na 2021, ikpe ya malitekwara ebe ọ kwụsịrị.
Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ka nọkwa n'isi ya bụ ikpe.
Ka ọ dị ugbua, Mazi Kanu agaala ikpe ihe ruru ugboro ise kamgbe a nwụchigharịrị ya.
Nkewa adịla na IPOB

Ebe foto si, Simon Ekpa
Kamgbe Kanu banyere mkpọrọ, otu ya bụ IPOB dịka o keriela.
Ọtụtụ ndị apụtala ugbua na-ekwu okwu nke mere na ndị nkwado Kanu amakwaghị ndị ha ga-esonyere.
Otu onye a kpọrọ Simon Ekpa enweela ndị nsonso buru ibu, dịka ọ na-akatọ ndị isi IPOB.
N'aka nke ọzọ, nwa amadị aha ya bụ Chinasa Nworu, bụ onye ji ọkwa 'Director of State' na Ipob na-nwekwara ndị nkwado nke ya dịka onyeisi.
Ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor na-ejikwa aha Kanu ezi ndị nkwado ya ozi.
Nke a mere ọtụtụ ji ekwu na Ipob ekeriela.
Mmekpa ahụ ndị DSS

Ebe foto si, Govt
Dịka e ji Kanu n'ụlọ mkpọrọ nke ndị uweojii nzuzo Naịjirịa, a kpọrọ DSS n'ịchafụ, ndị ọkaiwu ya ekwuola ugboro ugboro na ndị DSS na-emekpa ya ahụ.
Ụzọ dị icheiche e si emekpa Kanu ahụ, dịka ndị ọkaiwu ya si kwuo gụnyere:
- Ha ekweghị ka ọ gbanwee uwe ya
- Ọ naghị ahụ ihu eligwe anya
- Ọ na-edinabu n'ala ụkpọrọ (mana ụlọikpe mechara nye iwu ka ndị DSS nye ya akwa ndina nakwa ihe nhibe isi)
- Ha ekweghị ka ya na ndị mkpọrọ ọzọ na-emekọrịta
- Tupu ndị ọkaiwu ya ahụ ya anya, a ga-enyochagide ha, ọ fọdụ ịgba ha ọtọ
- Ndị DSS enyeghị ya ugegbe anya pụrụ iche o ji agụ akwụkwọ
- Ha ekweghị ka akwụkwọ na ihe ndị ọzọ o ji ekpe ekpere dịka onye Judaism ruo ya aka
- Ha amịrịla ọbara ya ugboro ugboro n'aha ime nnyocha ahụike; dgz
Ịkpọ oku ka a tọhapụ Kanu

Ebe foto si, Govt
Otu dị icheiche a kpọọla oku ma rịọkwaa arịrịọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari biko tọhapụ Mazi Kanu, mana o nwebeghị isi.
Nke a gụnyere otu ndị okenye Ohaneze ndị Igbo, nke onye ndu ha bụ Ichie Mbazulike Amaechi.
Ichie Amaechi arịọla Buhari ugboro abụọ ka ọ tọhapụ Kanu; nke mbụ bụ n'obi gọọmentị dị n'Abuja, nke abụọ bụ oge Buhari gara njem nleta n'Ebonyi steeti.
Mana ya bụ okwu enwebeghị isi.
Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ, ndị isi ụka, ndị ọka iwu na ọtụtụ ndị ọsọ etinyekwala ọnụ na-arịọ ka a tọhapụ Kanu, mana onyeisiala kwuru na ya bụ okwu apụọla ya n'aka.
Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti, ejirikwala ụkwụ ya gaa n'ụlọọrụ ndị DSS ga leta Mazi Kanu na mkpọrọ iji gosi mbọ a na-agba maka ntọhapụ ya.
Etu ihe si kwụrụ ugbua
Ka ọ dị ugbua, ikpe Kanu ka dị n'ụlọikpe.
Ụbọchị ikpe ọzọ bụ echi bụ Tuzde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jun.
Ndị ọkaiwu ya ka na-arịọ ọkaikpe Binta Nyako ka ọ tọhapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe.
Mana ndị ọkaiwu nke gọọmentị etiti ekweghị, kama ha chọrọ ka ọ ka nọrọ n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS.
N'ụbọchị ikpe gara aga, ọkaikpe Nyako jụrụ ịtọhapụ Kanu.
O kwuru na Kanu ga-akọwara ụlọikpe ihe mere o ji gbaa ọsọ oge a tọhapụburu ya n'afọ 2017.
Mana cheta na otu ụlọikpe dị n'Umuahia Abia steeti, kpebiri na ọ bụ ọsọ ndị ka Kanu gbara, maka na ndị agha chọrọ igbu ya; ọ bụghị ọsọ ikpe ka ọ gbara.
Dịka ikpe na-aga n'ihu, ndị okenye Igbo na-ekwukwa na ha ka na-aga ije, ịrọ gọọmentị ka e nwee mkperịtaụka, nke bekee na-akpọ 'political situation' gbasara okwu Mazi Kanu.






























