August Harvey Martin: Onye Amerịka ji ndụ ya chụọrọ Biafra aja

August Harvey Martin

Ebe foto si, seaboardairlines.org/Website

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

August Martin bụ nwaafọ Amerịka ọtụtụ ndị n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa agaghị echefu echefu.

Martin jiri ndụ ya chụọ aja oge ndị ọwụwa anyanwụ Naijirịa chọrọ ịnweta mba Biafra nke mere ka agha dapụta n'etiti ha na Naijirịa.

Ya bụ agha alụrụ site n'afọ 1967 rụọ afọ 1970 tara isi ihe karịrị mmadụ otu nde.

Ọ bụ akwụkwọ ndị ọba akwụkwọ nke ngalaba Njem nke obodo Minnesota ka e siri weta ụfọdụ ihe dị n'ime akụkọ a.

Onye bụ August Harvey Martin?

August Harvey Martin maọbụ 'Augie' dịka ndị enyi ya na-akpọ ya bụ onyeisioji nke mba Amerịka.

A mụrụ ya n'obodo Los Angeles dị na Kalịfonịa n'ụbọchị iri atọ na otu n'afọ 1919.

Ezinụlọ ya mechara kwaga obodo New York ebe ọ gara akwụkwọ.

Aha onyonyo, Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'

Ọ gụrụ akwụkwọ na DeWitt Clinton High School n'afọ 1983.

Na-agbanyeghị na ọ nwere ọbere ahụ, abịa n'egwuregwu. ọ gbatara ọnụ ya dịka onye na-agba ọsọ.

August Harvey Martin dịka onye na-anya ụgbọelu

August Harvey Martin

Ebe foto si, Seaboardairlines.org/Website

Nkọwa foto, Nke abụ ihe akwụkwọ 'August Harvey Martin Activities Book' nke edere maka ụmụaka

August Martin lahachiri kalifonịa ebe ọ gụrụ akwụkwọ na San Mateo Junior College na mahadum nke Kalifonịa.

Mgbe Martin na-agụ akwụkwọ na San Mateo, ọ sara ma lekọta ụgbọelu iji nweta ego o ji kwụọ ụgwọ maka ọmụmụ ịnya ụgbọelu.

Ọ nyara ụgbọelu ya nke mbụ nke bụ "Fleet Model 2" n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 1940.

Ọ gara n'ihu ịmu etu esi anya ụgbọelu na 'Civilian Pilot Training Program' nke mahadum Kalịfonịa.

Aha onyonyo, O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme

Tupu ọ gụchaa mahadum, ọ bụrụla "Flight Instructor Rating".

N'afọ 1942, ọ rụrụ ọrụ dịka onye nkịtị na-enyocha ọnọdụ ụgboelu nke ndị atụmatụ V-12 nke ndị agha mmịrị mba Amerịka na Mahadum Cornell.

August Harvey Martin dịka onye agha elu

August Martin banyere ndị agha elu nke mba Amerịka n'afọ 1943.

Ọ bụ na obodo Tuskegee nke dị n'Alabama ka ọmụrụ ịnya ụgbọelu agha.

Ụgbọelu ndị ọ nyara gụnyere "The Stearman", "Vultee 'Vibrator' , na 'AT-6' dịka onye cadet agha elu.

The Stearman

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto otu n'ime ụgbọelu August Martins nyara dịka onye aghaelu bụ 'The Stearman'

Martins nyara ụgbọelu nke B-52 'Mitchel Twin Bomber'.

Kama agha mba ụwa niile nke abụọ gwụrụ tupu August Martins esoro lụọ ya.

Ọ pụrụ n'oru dịka onye agha ụgbọelu n'afọ 1946.

Mgbe a lụchara agha mba ụwa nke abụọ

Otutu ndị aghaelu enweghị ọrụ oge agha mba ụwa abụọ biri.

Ịnweta ọrụ siri ike tụmadị ma ị bụrụ onye isiojii.

Martins mechara nweta ọrụ dịka onye na-elekọta ụgbọelu n'ụlọ ọrụ Wilis Air Service nke dị na Teterboro, New Jersey.

Aha onyonyo, Samuel Edeson: Nnamdi Kanu enweghị ikike ịgbanwe Ọkọlọtọ Biafra

Sịta n'afọ 1946 ruo afọ 1955 ọ kwọrọ ụlọọrụ Buffalo Skylines, El Al Airlines na World Airways ụgbọelu ha.

N'afọ 1955 ka ụlọọrụ Seaboard World Airlines were ya n'ọrụ nke mere ka ọ bụrụ onyeisiojii mbụ bụ Captain na-anya ụgbọelu ndị njem.

Site n'afọ 1955 ruo 1968, Captain Martin nyara ụgbọelu DC-3, DC-4, Lockheed Constellation na CanadAir Cl-44 n'ụlọọrụ Seaboard World Airlines.

Ọnwụ August Harvey Martin

Uli
Nkọwa foto, Etu ọdọ ụgbọelu Uli dị taa

August Harvey Martin bụ onyeisiojii mbụ rutere ọkwa Captain dịka onye mbụ bụ onyeisiojii na-akwọ ụgbọelu ndị mmadụ ji eme njem.

Otu ihe eji mara Martin bụ mbọ ọ na-agba iji nyere mba ndị na-achọ nwereonwe nke ha aka.

Otu mba ndị a gụnyere Biafra.

Martin wepụtara onwe ya ị hụ na ụfọdụ ihe ndị dị mkpa dịka nri na ihe ndị ọzọ rutere ndị Biafra.

Lockheed Constellation

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lockheed Constellation, ụdịrị ụgbọelu Martins nyara oge ọ nwụrụ

Ngalaba njem nke obodo Minessota dị na mba Amerịka kwuru na ọ bụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julị afọ 1968 ka Martins nwụrụ.

Ha kwuru na Martins nwụru oge ọ chọrọ ifetu ụgbọelu ya n'ọdọ ụgbọelu nke Uli oge oke mmiri na-ezo.

Kama ụlọọrụ ebe ọru buru ọrụ bụ seaboardairlines kwuru na ọ bụ ya na nwụnye ya nke abụọ bụ Gladys Frank Martin nwụrụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Juli afọ 1968.

Aha onyonyo, Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra