Joe Achuzia, onye agha Biafra anwụọla

Onye bụ otu onye ndị duru ndị agha Biafra n'agha Naịjiria anwụọla ka ọ gbara afọ ịrị itoolụ.
Joe Hannibal O.G. Achuzia nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị taa ebe elekere asatọ n'ụlọọgwụ gọọmentị etiti n'Asaba.
Diọkpara ya bụ Onyeka Achuzia gwara ndị ntaakụkọ n'Asaba na ọ bụ obi tiwara etiwa ka ha jiri agbasa ozi a.

"Nnam rịara ọrịa nwa ntakịrị oge tupu ọ nwuọ. Ihe a dị anyi nwute."
Achụzia so na ndị ịsị agha Biafra nụrụ ọgụ mnwere onwe n'afọ 1967.






