Ha ga-eli Achuzia n'ụbọchị Satọde n'Asaba

Ha bidoola abalị ncheta Joseph 'Hannibal' Achuzia bụbụ onye amama dịka onye dike agha Biafra.
Achụzia bụbụ onye jibu ọkwa dịka 'Ikemba nke Asaba' nwuru n'ụbọchị iri abụọ n'isi n'ọnwa Feburuwarị n'afọ a, ọ dị afọ iri asatọ na itoolu.
Abalị ncheta ya bidoro ụbọchị Tuusde, ha ga-eme ọzọ n'Owere na Asaba taa na echi tupu elie ya n'ụbọchị Satọde.
N' okwu ya, na emume ncheta e mere n'Enugwu, onyeisi otu Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru na ọnwụ Achuzia bụ ohere Ndigbo niile egosi na ha bụ ụmụnne, dị n'otu na icheta mkpamkpa dabidoro umunne ha n'oge Agha."
Ejiofor Onyia, bụbụ onyeisioche komitii na-ahụ maka nkwadebe akwamozu ya gwara ndị nta akụkọ na ha na-atụ anya ndị gọvanọ niile na-achị steetị ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ụbọchị ha ga-eli Achuzia.









