Ayade: Gụanụ okporo ụzọ aha Ekwueme

Ebe foto si, AFP
Ayade rịọrọ gọọmenti etiti ka ọ gụọ nkụkwụ ọkpọro ụzọ maọbụ ewumewu nke gọọmenti aha osote onye isiala mgbe gara aga, bụ Dr Ekwuemme iji cheta nkwado o nyere maka kwalite ọchịchị ala Naijiria.
Okamụta ahụ rịọrọ aririọ a mgbe o duru osote ya bụ prof Ivara Esu, na ndị otu ọchịche ya ga nkwanye uguwu ikpeazụ nke e mere Ekwueme nwụrụ anwụ na Enugwu.
O kwuru na ọ gaghị adi mma ma ọbụrụ na a gụọ ewumegu nke mpaghara Naijiria kama ka agụọ ewumewu nke gọọm̀enti etiti dị n' Abụja.
Ayade kọwara na Ekwueme bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nyere aka kwalite oganiru Naijiriaa na mba ojii.






