Ihe ndị Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kwuru maka Peter Obi banyere NDC
Ndị bi na mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola obi ha banyere Peter Obi banyere pati NDC.
Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụọnụ kwuru obi ha nakwa ohere nke a nwereike inye Peter Obi nakwa Rabiu Musa Kwankwaso na ntuliaka afọ 2027
Cheta na Peter Obi na Kwankwaso nọrọ n'ụbọchị Sọnde 3 Mee 2026, kwuo na ha ahapụla pati African Democratic Congress (ADC) ma banye pati Nigeria Democratic Congress (NDC).
Achọghị m nkewa na ikpe na pati NDC - Peter Obi

Ebe foto si, NigeriaNDCHQ/X
Peter Obi akpọọla oku ka a ghara inwe nkewa maọbụ okwu n'ụlọikpe na pati Nigeria Democratic Congress (NDC).
Obi kwuru nke a oge a nabatara ya na Rabiu Musa Kwankwaso na pati NDC n'ụbọchị Sọnde 3 Mee 2026.
Onyeisi pati NDC bụ Seriake Dickson nabatara Obi na Kwankwaso na NDC dịka ha hapụrụ pati African Democratic Congress (ADC) n'ụbọchị Sọnde 3 Mee, 2026.
Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti jị ọkọlọtọ Labọ Pati zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 ebe Rabiu Kwankwaso chịburu Kano steeti zọkwara ọkwa onyeisiala na pati New Nigeria People's Party (NNPP),
Nke a na-abịa dịka a na-akwado maka ntuliaka afọ 2027.
Ihe Peter Obi kwuru na nnabata ya na NDC

Ebe foto si, NigeriaNDCHQ/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Oge a nabatara ya na NDC, Peter ji ohere ahụ gwa gọọmenti etiti ka ha ghara ịbịakwa tinyere ọgbaaghara na pati NDC dịka ha si mee na ADC ma gwa gọọmenti ka ha pati ndị ohere dịka ọchịchị onyekwuouche ya si kwuo.
N'okwu ya "Biko achọghị m ka e nwee okwu n'ụlọikpe. Ndị otu NDC, biko unu agana ụlọikpe, ihe anyị chọrọ bụ inwe pati ụmụnwaanyị na ụmụaka anyị ga-enwe ntụkwasiobi na ya."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya nwere ntụkwasiobi na pati NDC ga-ehiwe gọọmenti ga-azọpụta Naịjirịa n'aka ajọ ọchịchị ma nweta Naịjirịa ezi nchekwa nye ụmụafọ ya.
Obi kpọrọ oku ka ndị nkwado ya niile gbaa mbọ debanye aha na pati Nigeria Democratic Congress (NDC).
Kwankwaso ji ohere ahụ kpọọ oku ka ụmụafọ Naịjirịa niile debanyekwa aha ha na pati NDC ngwangwa ma kwuo na ndị nkwado ya amalitela idebanye aha ha na NDC.
Na nzaghachi ya, onyeisi NDC bụ Seriake Dickson nabatara Obi na Kwankwaso ma kwe ha nkwa na a gaghị enwe ikpe ọbụla maọbụ nkewa ọbụla na NDC.
Dickson kọwara Obi na Kwankwaso dịka ndị tozuru etozu ịzọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala ma kwuo na pati NDC ga-ewepụta usoro ndị ọzọ banyere mbata Obi na Kwankwaso n'oge adịghị anya.
Ihe mere m ji hapụ pati ADC - Peter Obi
Peter Obi bụbu aka chịrị Anambra steeti nakwa onye ji ọkọlọtọ Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023, ekwuola ihe mere o ji hapụ pati ADC dịka a na-akwadobe ntuliaka afọ 2027.
Peter Obi kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'aka X ya ma kwuo ihe mere o ji kpebie isi na ADC pụọ.
Ka ọ dị ugbua, Peter Obi ekwughị pati ọ ga-abanye mana a na-atụanya na ọ ga-ekwuputa patị ọhụrụ ya na nso nso a.
Cheta na otu Obidient Movement na-akwado Peter Obi, kwuru na Peter Obi na ndị isi kara aka ka na-enwe mkparịtaụka iji chepụta ụzọ ka mma iji hụ na e nwere mgbanwe na Naịjirịa.
Ozi onyeisi Obidient Movement bụ Yunusa Tanko wepụtara, gwara ndị nkwado ha ka ha nwee ndidi ma kwe nkwa na Peter Obi ga-ewepụta ozi n'oge na adịghị anya banyere pati ọhụrụ ọ ga-abanye.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Peter Obi ahapụla pati ADC

Ebe foto si, Peter Obi/X
Peter Obi ekwupụtala mkpebi ya ịhapụ Pati African Democratic Congress (ADC).
Aka chịburu Anambra Steeti kwuru na mkpebi ya ịhapụ ADC abụghị maka na onyeisioche ha bụ David Mark na Atiku Abubakar mejọrọ ya kama ọ bụ maka na ndị ahụ tinyere ọgbaaghara na Labour Pati amalitekwela itinye ọgbaaghara na pati ADC.
N'ozi Peter Obi wepụtara n'ụbọchị Sọnde abali atọ nke ọnwa Mee, 2026, o kwuputara mwute banyere etu ọtụtụ ndị mmadụ si eleda ya anya nakwa etu e si agba onye nwere ezi omume mgba okpuru na Naịjirịa.
N'agbanyeghị na Obi ekwubeghị pati ọ ga-abanye, gara n'ihu kwuo na ọchịchọ obi ya ịbụ onyeisiala abụghị okwu ọnwụ na ndụ, kama na ọ chọrọ ịhụ na e nwere ezi ọchịchị kwenyere na nkwalite, nchekwa nakwa ọdịmma ụmụafọ Naịjirịa.
O kwuru na ya nwere olileanya na Naịjirịa ga-abụ mba ga-enweta ezigbo ndị ọchịchị ga-akwalite ikpe ziri ezi ma nye onye ọbụla ohere dịịrị ha.
Cheta na Peter Obi bụ aka chịburu Anambra Steeti ma bụrụkwa onye jiri ọkọlọtọ Labour pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.
Rabiu Kwankwaso ekwuola na ya abanyebeghị pati NDC
N'aka nke ọzọ, Rabiu Musa Kwankwaso emeela ka o doo anya na ya abanyebeghị pati Nigeria Democratic Congress (NDC).
Kwankwaso kwukwara na ya ekpebibeghị ịzọ ọkwa onyeisiala maọbụ onye ọ ga-akwado n'afọ 2027 ma gbakwụnye na ADC ekwubeghị mpaghara Naịjirịa onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala ga-esi apụta.
Nke a na-abịa dịka akụkọ malitere ifesa na soshal midia na Peter Obi na Kwankwaso ahapụla ADC ma banye NDC iji zọọ ọkwa Onyeisiala na osote onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2027.
Kwankwaso kọwara n'ozi o wepụtara n'akara X ya na ya na ndị nkwado ya ka na-atule uche banyere pati ọzọ ha ga-abanye dịka okwu banyere onye ga-eji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) zọọ ọkwa na ntuliaka 2027 malitere ifesa.
O kwuru na mkpebi ụlọikpe kachasị na Naịjirịa banyere onye bụ onyeisioche ADC nakwa atụmatụ Ọkaikpe ukwu Naịjirịa ịkachapụ aha ADC na pati ndị ga-azọ ntuliaka n'afọ 2027, emeela ka ya na ndị nkwado ya malite ịchọ pati ọzọ ha ga-abanye.
N'okwu ya, "Mụ na ndị nkwado m na ndịisi pati NDC, PRP na ndị ọzọ, amalitela inwe mkparịtaụka banyere ụzọ anyị ga-eji chekwaa ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa".
Ọ gara n'ihu kwuo na kemgbe afọ 2014 na 2019 ọ zọrọ ọkwa onyeisiala na pati APC na PDP ma daa na ntuliaka imeụlọ ha, ọ gara n'ihu kwado ndị patị ya họpụtara na ntuliaka afọ ndị ahụ.
Kwankwaso bụbu Gọvanọ Kano steeti nakwa minista nchekwa, kwuru na ihe mere ya ji abịaghị ọgbakọ abụọ ADC mere na nso nso a bụ maka ọgbakọ ndị ọzọ ya nwere ma kwuo na ya gwara ndịisi maka ọgbakọ ndị ahụ.

































