Iwu BVN ọhụrụ: Ihe ndị dị mkpa ị kwesịrị ịma gbasara iwu a CBN wepụtara

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ Etiti Naịjirịa 'Central Bank of Nigeria'(CBN) ewepụtala iwu ọhụrụ siri ike metụtara ndebanye aha BVN bụ nke malite ịdị ire site n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, afọ 2026.
Iwu ọhụrụ a ga-emetụta ụlọakụ niile na ụlọọrụ ego ndị ọzọ.
Lee ụfọdụ iwu ọhụrụ ahụ nke CBN siri na ọ ga-enyere aka melite ozi gbasara BVN ma kwụsị nrigbu:
- Nke mbụ, CBN sịrị na ọ bụ naanị ndị gbara afọ iri na asatọ gawa n'ihu ga-enwe ike idebanye aha maka BVN.
- Ọzọ, ha kwuru na ịgbanwe akara ekwentị(phone number) e jikọrọ na BVN ga-ekwe omume naanị otu ugboro na ndụ.
- CBN webatakwara atụmatụ nyocha BVN nwa oge maka azụmahịa ndị a na-enyo enyo.
- Ụlọakụ ma ọ bụ ụlọọrụ ego nwere ike itinye BVN mmadụ n'ebe nlele ruo awa 24 iji chọpụta azụmahịa ọbụla na-adịghị mma.
O zi ahụ kwuru sị, "BVN ahụ a na-enyo enyo ga-anọ na nnyocha naanị awa 24, n'oge ahụ, ha ga-akpọtụrụ onye nwe akpaego(account) ahụ ka ọ kọwaa azụmahịa ahụ a na-enyo enyo.
"Nke a ga-eme ka e nwee ike ịkwụsị ndịohi ozugbo, ma n'otu oge ahụ na-echebe ndị ahịa ka a ghara igbochi akaụntụ ha ogologo oge.".
Iwu ndị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
CBN machiri ohere ịbanye na nchekwa ozi BVN ka ọ buru naanị maka ụlọakụ na ụlọọrụ ego ndị nwere ikike.
Atụmatụ a ga-enyere aka belata iji ozi ndị mmadụ eme ihe n'ụzọ na-adịghị mma.
Ozi ahụ kọwakwara na CBN ewebatala ụzọ ndị sara mbara ga-eme ka ndebanye aha BVN sie ike.
Ha sịrị na nke a ga-elekwasị anya n'ịhụ na ozi BVN ziri ezi, na mgbochi nrụrụaka ego.
Nke a ga-enyocha ozi ndị ahịa, na usoro haziri ahazi maka ịgbanwe ozi BVN.
Ụlọ akụ ga-agba mbọ hụ na ozi ndị ahịa ziri ezi ma nwee ike ịkwado ha oge niile.
Ozi ahụ sịrị, "Atụmatụ mmezi iwu ndị a ga-enyere aka n'ịkwụsị nrụrụaka ego, wusie njirimara mmadụ ike, ma mee ka ndị ahịa nwee ntụkwasị obi na usoro ịkwụ ụgwọ nke Naịjirịa."





























