Cyber Crime Victim: Etu onye 'yahoo yahoo' si chọọ iri m' Amy Yoakum

Ndị EFCC boro ebubo izu ohi ịntanetị

Ebe foto si, Twitter/officialEFCC

Nkọwa foto, Ndị EFCC boro ebubo izu ohi ịntanetị.

Igbo si na eburu ozu onye ọzọ ọ dị ka ebu ukwu nku.

Dịka akụko na-aka mma na ọnụ onye o mere, akụko a na egosi ụfọdụ ndị umu 'Yahoo yahoo' riri ego ha.

Ka anyị bido na ofesi.

AmyYoakum si na ndị yahoo yahoo ghọgburu ya

Amy Yoakum

Ebe foto si, @ Amy Yoakum

Nkọwa foto, Amy Yoakum kwuru na onweghi uru di na izu ohi

Amy Yoakum bụ onye Ameịrka sị na steeti California.

Ọ kọrọ anyị etu ya na onye ohi ịntaneti bụ nwaafọ Naịjiria siri gbarịa.

Yoakum kwuru si: "ọ bụ na websaịt a na-achọta enyi nwoke (dating site) ka m zutere nwoke a."

"O tinyere foto gosiri na ọ bụ onyeọcha n'Amerịka bi na steeti na-eteghi aka ebe m bi.

"Ọ gwara m na ọ bu onye Injinia (Engineer) nke nọ Naịjrịa na-arụ ụlọ akwụkwo.

"Ọ gwara m ihe niile m chọrọ ịnụ nke mere ka m hụ ya n'anya, ọ dịzi ka ọ bụ sọosọ m bụ nwaanyị nọ n'uwa a."

Yoakum gakwara n'ihu kwuo na mgbe ha na-akpa n'ekwentị, n'asụsụ nwoke a adịchaghị ka nke onye Amerịka.

Nke a mere ka ọ jụwa ajụjụ.

Ọ gara nnyocha na intaneti wee hụta maka ndị ji ịntanetị ezu ohi, ọ kachasị nke ndị enyi nwoke na nwaanyị.

Yoakum gwara nwata nwoke ahụ na ọ matala ebumnobi ya.

Nwa amadị ahụ rịorọ ya mgbaghara ma kọwaara ya na o jighi ego ma ihe niile.

Yoakum kwuru na o mechakwara nye nwoke ahụ ego site n'obi ebere.

Kama otu enyi ya nwaanyị danyekwara n'aka ndị yahoo, e rie ya Dọla puku iri abụọ na ise ($25,000).

Amy Yoakum nyere umunwaanyị ibe ya ndụmọdụ ka ha jiri isi ha mgbe ha na akpa n'intanetị.

Na nke Dom Onwuamaeze, mmadụ ṅomiri enyi ya nwoke n'iji ghọgbuo ya

@Dom Onwuamaeze

Ebe foto si, @ Dom Onwuamaeze

Nkọwa foto, Ha ji olu enyi m nwoke ma kpọo m na ekwenti

Dom Onwuamaeze siri na nke ya dị ya ka ihe onyoonyoo.

Ọ bụ olu o chere bụ enyi ya nwoke ka e ji kpọọ ya n'ekwe ntị gwa ya na o nwere ahịa ha ga-azu wee nwete ego.

Onwuamaeze kwuru sị: "Amaghị na ọ bụ onye ohi n'ihi na aha ya na olu ya yiri nke enyi m nwoke".

Onwuamaeze kọwara na ndị ahụ napụrụ ya puku naịra iri abụọ (N20,000).

Ozugbo o nyechara ha ya, ha azaghịzịkwa ya na ekwentị.

E siri nghọgbu ozi ghọgbuo Muyiwa Balogun

Email adigboroja

Ebe foto si, @Muyiwa Balogun

Nkọwa foto, Email adigboroja eziteere Muyiwa Balogun

Balogun kwuru na nke ya site n'ozi "email" ka ha ji wee rie ya.

"Email" ahụ kwuru na o nwere ihe mere akara ọbaego m."

"Ha gwara m ka m tinye akara ọba ego m ma akara nzuzo m ji agbape ya."

"Mgbe m zaghachịrị ya, enweteghi m ozi na adọrọla ego m niile.

"Nke a mere ka m chee na o nweghi ihe mebiri.

"Kama mgbe m gara ịdọro ego na 'ATM', enweghi shịshị ọbụla fọrọ n'ọba ego m."

Ndụmọdụ ndị uweojii

PPRO Imo steeti Ikeokwu Godson

Ebe foto si, @Ikeokwu Godson

Nkọwa foto, 'Ụfọdụ mgbe ọ na abu anyaukwu na eduba ndị mmadụ n'aka ndị ohi' Ikeokwu Godson

Ọnụ na ekwuru ndị uweojii n'imo steeti bụ Ikeokwu Godson nyere ndị mmadụ ndụmodu sị -

1) Onye nwela anyaukwu, nyocha azụmahịa ọbụla tupu i tinye ego gi.

2) Onye wetere ozi 'Email' maọbụ n'ekwenti, onye ahụ were ụkwụ ya gaa n'ụlọaku gaa mee ihe ha si ya mee.

Ebe ọnụ na ekwuchitere ndi EFCC bụ Wilson Uwujaren nyere ndi mmadụ ndụmọdụ ka ha:

1) Saa anya na mmiri ma ha enyela onye ọbụla ihe gbasara ọba ego ha.

2) Mmadụ niile nyochaa atụmatụ niile gbasara ego tupu i tinye ego gi.

3) Onye nwetere ozi na ezighiezi detere ha akwụkwọ na [email protected].

Akụko ga-amasi gi :

Lee ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ihe ndị ntoroọbịa chọrọ ka ndị gọọmenti mere ha