Fake bank alert: Ihe ise ị ga-eji amata 'bank alert' adịgboroja

Iji ịntanet azụ ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Ndị oji intanet ezu amapụtala ụzọ ọhụrụ iji na-apụ ndị mmadụ ego ha site n'ịzụ ihe ma zigara onye ha zụrụ ahịa ozi ụlọakụ abụghị nke ọma na-egosi na ha kwụọla ụgwọ ihe ha zụrụ.

N'ọnwa ole na ole gara aga, ndị uweojii nwuchiri onye dọkịta ghọrọ oji ịntanet ezu, nke jirila ụzọ aghụghọ zụrụ ọtụtụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ dị oke ọnụ aha n'ịntanet.

Aha onyonyo, Ọ gịnị bụ 'social media' n'Igbo?

Chidi Udeogu na Innocent Orji bụ ndị 'software' inginịa n'ụlọọrụ 'Zedcrest Capital' bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịhazi akụnaụba kọwara ụzọ ole na elo ị ga-eji mara ma gbalahụ ozi ụlọakụ adịgboroja.

Chidi Udeogu na Innocent Orji

Ebe foto si, Chidi Udeogu/Innocent Orji

Lee ise n'ime ha:

1. 'Bank alert' adịgboroja na-egosi naanị ego ole a kwụnyere, ebe ozi si n'ụlọakụ gị n'ezie ga-egosi ego ole fọrọ n'akpaego dị n'ụlọakụ.

2. Ọ bụrụ na edemede ozi i nwetara dị iche na nke ị na-enwetabu.

Orji kọwara na ozi "Ndị nke adịgboroja, na-etinye kpọm, rịkọm maọbụ 'underscore' n'aha ụlọakụ na-ezite ozi ahụ, nke a na-ede ya n'obere mkpụrụedemede (small letter)."

Aha onyonyo, Lee elekereaka nke a sị n'ahụ alata ọkụ

3. Ezigbo ozi na-egosi akara anọ ikpeazụ dị n'akara akpaego gị (account number), mana nke adịgboroja anaghị ebu ya.

Aha nkeananụānụ, 'Ụzọ ị ga-esi mara 'bank alert' adịgboroja'

4. Ezigbo ozi ga-akọwa ihe ego ahụ bụ ma ọ bụ mwepụ ka ọ bụ mgbakwụnye nyere ihe dị n'akpaego gị n'ụzọ kwesiri ekwesi.

5. Were 'banking app' mara ego ole banyere n'akpaego gị n'ụlọ akụ.

Aha nkeananụānụ, Kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya- Chidi Udeogu

Ọ bụrụ na obi akaghị gị, ọ kachasị ma mmadụ zụọ gị ahịa dara oke ọnụ ahịa, Udeogu na Orji dụrụ ọdụ ka i jiri 'bankịng app' dị n'ekwentị gị lee akpaego gị n'ụlọakụ tupu ị hapụ onye zụrụ gị ahịa ka ọ lawa.

Udeọgụ kwuru ka ị "kpọọ 'Account officer' gị ma 'bank alert' gị edoghị gị anya," maka ndị ụta.

Aha onyonyo, A na-ajụ ma abụ m mmadụ - Nigerian Jackie Chan

Akụkọ ga-amasị gị: