Four students die: Akwammiri dara tigbuo ụmụakwụkwọ mahadum anọ

Ebe foto si, Susan Edeh
Ndị isi mahadum 'Abubakar Tafawa Balewa University' ekwuola n'ezie na akwammiri dị n'ime ogige mahadum ha nke dị na Gubi, Bauchi, dara ma tigbuo ụmụakwụkwọ anọ, ebe mmadụ asaa merụrụ ahụ.
Akwammiri ahụ jịkọrọ klaasị na ebe obibi ụmụakwụkwọ dara oge ụmụakwụkwọ si ebe ha gara gụchaa akwụkwọ n'alaba ka oke mmiri ozuzo zochara n'abalị Monde.
N'okwu ya, oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, onyeisi mahadum ahụ bụ Muhammad Ahmad Abdullazeez tụrụ arịrị maka ọdachi ahụ dagidere mahadum ahụ.
Abdullazeez kwuru na mmadụ anọ ahụ nke gụnyere nwoke atọ na otu nwaanyị nọ na ngalaba "Management' nakwa 'Business Education' nwụrụ.
"Anyị ghọtara na ụmụakwụkwọ ahụ na-alọghachi na ụlọobibi ha ka mmiri na-ezo n'abalị akwammiri ahụ were daa, mmiri gbagbuo mmadụ anọ. Ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata nleta n'ụlọgwụ anyị."
Ọ gara n'ihu kwuo sị "anyị enweghị ike ikwu ugbua ma o nwere nwata akwụkwọ ka na-efu efu ganye na anyị mechaa nchọpụta."
Mana ụmụakwụkwọ mahadum ahụ na-ekwu na ọdachi ahụ bụ ihe a kaara igbochi ma ọ bụrụ na ndị nchịkọta mahadum ahụ gere nti na oku ha kpọrọla ka e dozie akwammiri ahụ.
Otu nwakwụkwọ achọghị ka a kpọ aha ya kwuru na"Akwammiri ahụ bụ onye gụburu na mahadum a rụrụ ya. E dozibeghị ya kemgbe. Odachie akaghị ime maọbụrụ na e doziri ya."









