Election 2019: Gịnị bụdị inconclusive?

Inec
Nkọwa foto, Ụfọdụ steeti ndi Inec ekpebibeghị maka ntuliaka ha
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Otu n'ihe tụrụ ụmụ Naijria n'anya na ntuliaka gọvanọ afọ 2019 e mere na nso nso bụ na mpụtara ntuliaka e mere n'ebe ụfọdụ dị dịka Inec siri kwupụta 'inconclusive' na Bekee.

Steeti ndị a bụ Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti.

Kemgbe nke a mere ya bụ okwu bụ 'inconclusive" bụzị okwu ndị mmadụ ji ekwu okwu, ebe ụfọdụ amaghị ihe ọ pụtara.

Gịnị bụ 'inconclusive?

Onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Ọkaiwu Ifeanyi Ulumma kọwara na ntuliaka ịdị "inconclusive" pụtara "ebe e mere ntuliaka a na-emerughị n'isi."

Kedụ mgbe a ga-asị na emerụghị ntuliaka n'isi?

Olisa Agbakoba bụ nnukwu ọkaiwu a ma ama na Naijiria kwuru na onye meriri abụghị naanị na o nwere vote kachasị, ọ ga emeri na imirikiti mpaghara dị icheiche ebe e mere ntulika aka ahụ.

Ụzọ abụọ ntuliaka nwere ike bụrụ ihe erughị n'isi dịka Agbakoba na Ulumma siri kwuo bụ:

1. Ọ bụrụ na ihe onye meriri ji ka onye o meriri ehighị nne, ọkachasị ma ọ bụrụ na vootu a kagburu dị nnukwu.

2. Ọ burụ na e nwere ọgbaghara, ebe ihe agaghị n'anya ya dịka ebe e nwere nsogbu izu igbe vootu

Ụfọdụ steeti ndi Inec ekpebibeghị maka ntuliaka ha

N'ihe mere n' Adamawa, Kano, Sokoto, Bauchi nakwa Platu steeti, Ulumma na Agbakọba rụtụrụ aka na ' Ọ dị ka ebe ndị PDP na-emeri ka a kpọpụtara dịka "inclonslusive."

Ulumma dụrụ Inec ọdụ si ha ha leruo anya ma nye onye ọbụla meriri mmeri ma ọ bụ onye APC, APGA maọbụ onye pati ọzọ, ha nye ya onye meriri."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: