Rochas Okorocha: Ọ ga-eso na ndị ndọrọndọrọ e nweghizi ọnọdụ?

Ebe foto si, Victor Umeh,Ajumobi, Bukola Saraki/Facebook
Ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya etu ụgbọ siri ghara ụfọdụ e chere na ha bụ ndị nwe obodo dịka Victor Ume, Bukola Saraki, George Akume nke Benue nakwa Abiola Ajimobi nke Oyo steeti, dịka ndị be ha mere ha e cheta e bewe na ntuliaka a.
Lee ije mmadụ anọ a:
1. Victor Umeh

Ebe foto si, Victor Umeh/Facebook
Uche Ekwunife nke PDP pịara Victor Umeh ukwu n'ala na ntuliaka 2019 a.
Ekwunife nọbu otu Apga ebe ọ nọ dịka onye nnọchite anya ha n'afọ 2010 ruo 2014, gara APC, ebe o siri lọghachịkwa na PDP.
2015 bụ nke mbụ Victor Umeh na-aba n'ụlọomeiwu, ebe ọ gara n'aha Apga.
2. Bukola Saraki

Ebe foto si, Bukola Saraki/Twitter
E wepụrụ Saraki ike n'oche na Kwara ebe ọ kụrụ afọ n'ala ka ọ nọchara agba nke mbụ ya n'ụlọomeiwu Ukwu.
Ka ọ nọ n'ụlọomeiwu ukwu, ọ chịrị dịka onyeisi ha.
3. Abiola Ajimobi

Ebe foto si, @AAAjimobi
Abiola Ajimobi bụ gọvanọ chịrị Oyo steeti afọ asatọ chọrọ ịga Ụlọomeiwu ukwu ịnọchite ndị Ọyọ-Sentral, mana Kola Balogun nke PDP ji vootu 105,720 nara ya ụra rahụ dịka ya onwe ya nwetara vootu 92,217.
Ndị Oyo na-echeta Ajimobi maka etu o si ekwu okwu n'ọha dịka ha ji 'Constitutent authority' echeta ya n'ihe agwa ọ kpasoro ụmụakwụkwọ mahadum LAUTECH.
4. George Akume

Ebe foto si, @SenatorAkumeTwitter.JPG
George Akume chịburu Benue steeti so na ndị nwere agba a gwara buru ute ha lawa na ntụliaka ụlọomeiwu ukwu e mere na 2019.
Orkev Jev nke PDP ji vootu dị 157,776 were kụpụ Akume nwetara vootu 115,422 n'aha APC.
5. Binta Masi Garba

Ebe foto si, @GarbaBinta
A gbarala Binta Masi Garba bụ naanị nwaanyị si Ugwu Naijira nọ n'Ụlọomeiwu Ukwu ụgbọ nwa mkpi.
Garba na-anọchite Adamawa-North n'ụlọomeiwu Ukwu n'aha APC mana Elisha Ishaku Abbo nke PDP ji vootu dị 43,117 nye ya ọsọ dịka Garba nwetara naanị vootu 16,219.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Rochas Okorocha: Ọ ga-eso na ndị ndọrọndọrọ e nweghizi ọnọdụ?

Ebe foto si, @RealRochas/Twitter
Ọ bụ na Tọzde bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ka a ga-achọpụta ezi ọnọdụ Okorocha.
Rue ugbua, Inec kwuru na ọ bụ sọsọ ndị enyere ikike ga-eso na nzụkọ ha kpọrọ ndị zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana nyocha BBC Igbo mere gosiri na aha Rochas esoghị na aha ndị e denyere ga-abịa n'ọgbakọ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ihe nke a pụtara bụ na Okorocha nwere ike isonye na ndị e were dịka ochie dike na ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria mana mpụtara ntuliaka 2019 azọsịala nsị n'afọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









