Anambra election 2021: Ihe 5 nwere ike isi ebe a na-atụ vootu kpọga gị mkpọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Ka ị na-akwado ịga ebe ị ga-ebinye aka n'akwụkwọ vootu, ị ma ihe ndị ị na-ekwesịghị ime ma i ruo ebe a na-eme ntuliaka?
Ntụliaka a nwere ike ịbụ nke mbụ ị na-esonye maọbụ ọ bụrụ na i sonyela na ntuliaka ugboro ugboro, mana ị ma ihe ndị nwere ike ibutere gị nsogbu n'ọgbọ ntuliaka?
Dịka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwuo, ime ihe ise a n'ọgbọ ntuliaka ga-ekotere gị okwu na ụka.

Gbanarị ihe ise a:
N'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-ekwu na ntuliaka ọkwa gọvanọ agaghị enwe isi n'Anambra steeti, Inec na-adọ aka na ntị na ihe ndị ga-ebutere gị nsogbu ma ị mee ha taa.
1) Aghọgbula onye ọbụla na ị bụ onye ụlọọrụ Inec:
Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ndị na-agwa ndị mmadụ na ha na-arụrụ Inec ọrụ, mana otu abụghị n'ezi.
Marakwa na aka kpara gị ka ị na-aghọgbu ndị mmadụ n'ụzọ a, ị ga-akwụ nha otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.
2) Iji akwụkwọ mbinyeaka:
E jide gị ka i ji akwụkwọ mbinye aka (ballot paper) nke ị na-enweghị ikike ijide, ị mara na ị nọ n'ezigbo ofe dị ọkụ.
Ọ bụrụ na adaghị gị nha ịkwụ nde naịra iri ise (N50m), ị mara na ị nwere ike ịga mkpọrọ afọ iri.

Ebe foto si, Getty Images
3) Iji ngwaọgụ bịa:
Ụbọchị ntụliaka, ị kwesịghị iji ngwaọgụ maọbụ ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ bịa.

Ebe foto si, Getty Images
E jide gị ka i ji ngwaọgụ dịka egbe maọbụ mma na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, ị ga-akwụ puku narị naira ise (N500k) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ maọbụ ha abụọ.
4) Inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntụliaka gị:
Ị daala iwu ma ị nye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntuliaka gị nke a na-akpọ "PVC" ka o were mee ntuliaka.
Ị dakwara iwu ma ọ bụrụ na i jide PVC karịrị otu (nke bụ nke gị). E jide gị, ị ga-akwụ iwu otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.

Ebe foto si, Getty Images
N'otu aka ahụ, ị ga-akwụ iwu otu puku narị naịra (N100k) maọbụ ị gaa mkpọrọ ọnwa isii maọbụ ha abụọ ma e jide gị ebe i ji akwụkwọ ikike ntuliaka onye ọzọ jirila mee ntuliaka.
5) Iburu ngwaọrụ e ji eme ntụliaka:

Ebe foto si, Getty Images
E jide gị ebe ị maburula ngwa ọrụ e kwesịrị iji eme ntuliaka, ị dabanyela n'ezigbo nsogbu.
Ị ga-aga mkpọrọ afọ abụọ.
Ụlọọrụ Inec ji nke a dọọ ndị mmadụ aka na ntị na websaịt ha.








