Awka Inec attack: Ihe ndị "unknown gunmen" wakporo ụlọọrụ Inec nakwa uweojii dị n'Awka hapụrụ ebe ha na-agba ọsọ

Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano agaala njem nleta n'ụlọ ọrụ ndị Independent National Electoral Commission (INEC) ebe ndị o ji egbe gbara ọkụ n'Awka n'abalị May 23,2021.
Obiano toro ndị uweojii nke ukwu maka etu ha si gbochie ndị o ji egbe ahụ imezu ebumnuche ha.
O kwuru na ọ dịmma etu esighị nwee ndị e gburu na ya bụ ọdachị ma na-ekwu na ụda egbe ndị mmadụ nụrụ n'abalị ụnyahụ n'Awka bụ ndị uweojii gbara ya iji chumie ndị o ji egbe ahụ.

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Gọvanọ Obiano kwuru na ọchịchị ya ga-ahu na-arụziri ihe ndị mebiri emebi n'ụlọọrụ Inec.
Kọmịshọna ndị uweojii n'Anambra bụ Chris Owolabi kwuru na ndị o ji egbe wakporo ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) mana ha emenwụghị ihe ha bu n'uche.
O kwuru na ọ bụ naanị ụlọ igwe na-enye ọkụ bụ ebe ndị oji egbe ahụ gbanwụrụ ọkụ.
O kwuru na o nweghị ihe ọ bụla ndị o ji egbe ahụ menwuru n'ụlọọrụ ndị uweojii 'Police B Divisional Headquarters' makana ndị uweojii kere nkwụcha ọfụma ma chumie ha nke mere na ha hapụrụ ụgbọala ha atọ gbalaga.
Mana onye ntakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ọ hụrụ akụkụ ebe a gbara ọkụ n'ụlọọrụ Police B Divisional Headquarters' ahu.

Owolabi si na ha nwụchịrị ndị o ji egbe ahụ bịara ịkpa mkpa a mana ha ekweghị ekwu mmadụ ole ha nwụchịrị.

Ha kwukwara na ha na-aga ụlọọgwụ dị iche iche ịmata ma o nwere ndị merụrụ ahụ n'ọdachị a mana o nwebeghị onye ha chọpụtara.
Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ ihe a mere kwuru na ndi mmadụ na-eke nkwụcha dịka ha na-agagharị n'ogbe ahụ ugbua.

Ihe ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anamabra steeti gwara anyị n'ụtụtụ a

Ebe foto si, INEC
Ndị o ji egbe awakpola isi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) dị n'Awka Anambra steeti ụnyahụ bụ May 23,2021.
Akụkọ na-ekwu na ndị o ji egbe gbalikwara ịwakpo ụlọọrụ uweojii a kpọrọ 'Police B Divisional Headquarters diketere ụlọọrụ INEC ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwetere na mkpa mkpa a kpara n'abalị Sọnde mana ọ matachabeghị ka ya bụ ihe si mee.
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka ya bụ ọkụ si agbaa n'otu akụkụ ụlọọrụ INEC nakwa ụda egbe na-ada mana BBC Igbo amabeghị nke bụ eziokwu.
Mwakpo a na-abịa dịka abalị ole na ole awakporo ogbe ndị Nigerian Security and Civil Defence Corp (NSCDC) ma gbuo ndị ọrụ ha abụọ na Nneyi, Umueri dị n'okpuruọchịchị Anambra East, Anambra steeti.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
- Etu e si lie Ọchịagha Attahiru Ibrahim na ndị ọzọ nwụrụ na mberede ụgbọelu
- Destiny Etiko, Yul Edochie, Ụmụ Obiligbo... Lee ụmụ Igbo a ma ama na-eso nzọụkwụ nne maọbụ nna ha
- Etu e si lie Ọchịagha Attahiru Ibrahim na ndị ọzọ nwụrụ na mberede ụgbọelu
- ka Chelsea, Liverpool maọbụ ManUnited gbunye Arsenal ncha ka ha sapụ ụchụ









