Chukwuma Soludo: Anwụchiela mmadụ itoolu e cheere na aka ha dị na mwakpo ya

Ebe foto si, Ejimofor Opara
Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano ekwuola na anwụchiri mmadụ itoolu echeere na aka ha dị mwakpo Chukwuma Solduo n'Isuofia.
O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'ụlọ Prof Dora Akunyili Wome's Development Centre dị n'Awka.
A wakporo Soludo mgbe ọ gara nzụkọ ndị ime obodo na Isuofia n'ọwa gara aga.

Ebe foto si, Twitter/CCSoludo
Aka ndị uweojii akparala mmadụ anọ ọzọ bụ ndị ha sị na aka ha dị na mwakpo ndị o ji egbe wakporo obodo Isuofia n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Maachị 2021, n'ọgbakọ ebe Chukwuma Soludo na ndị ntorobịa obodo ya na-enwe mkparịtaụka.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Ikenga Toochukwu kwuru na mmadụ anọ ndị sara asịsa na ha so wee kpaa agwa ọjọọ a.
Dịka Ikenga si depụta, aha ndị ahụ ha nwụchiri bụ Mbah Victor - gbara afọ iri atọ; John Olisakwe - gbara afọ iri abụọ na otu; Chigozie Omeh - gbara afọ iri abụọ, na Emmanuel Nnobi - gbara afọ iri abụọ na asatọ.
Chetakwa na ndị o ji egbe ahụ tọọrọ Mazi Emeka Ezenwanne onye ji ọkwa Kọmishona na gọọmentị Anambra, mana ndị uweojii kwuru nna ha na-agbasi mbọ ike ịtọhapụ nwa amadi a.
Ikenga gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha na-agbanyere ndị uweojii izu iji nyere ha aka buso ndị ekperima agha nke ọma.
Echeghị m na mwakpo a bụ ihe ndọrọndọrọ - Soludo

Ebe foto si, Police
Chukwuma Soludo n'onwe ya ekwuola na o cheghị na mwakpo a bụ n'ihi na o so azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na Channels TV n'abalị Tọzde.
Soludo kwuru sị: "Ọkwa Gọvanọ Anambra abụghị ihe mmadụ ga-eji wufuo ọbara, ọ bụghị etu anyị si eme n'Anambra."
"Mụ na ndị niile na-azọ ọkwa a dịcha na mma, ya mere ọ ga-agba m gharịị nke ukwu ma ọ bụrụ na mwakpo a bụ iji memilaa m."
"Mana achọghị m ikwubi okwu ugbua ka m ghara imebi nnyocha nke ndị ọrụ nchekwa na-eme ugbua."
Ọ bụ ndị uweojii ka ndị mere mwakpo a chere egbe - Onye hụrụ ihe mere

Ebe foto si, Nigeria Police
Otu onye hụrụ oge ndi o ji egbe wakporo ọgbakọ Chukwuma Soludo kwuru na ọ bụ ndi uweojii ka ndi ahụ chere ihu dịka ha batara n'ogige ahụ.
Maazị Ejimofor Opara bụ otu n'ime ndị na-arụrụ Maazi Soludo ọrụ gwara BBC Igbo na ndị ahu malitere gbawa ndi uweojii egbe ka ha batara ebe ahụ.
"Anyị nụrụ ụda egbe chee na ọ bụ ndị uweojii anyị na ha so na-agba egbe. Anyị wee hụzia hụ ka ndị uweojii ahụ na-ada n'ala, ọbara na-agba."
Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere bụzi ngwere n'ọsọ, ọkụkọ n'ọsọ. "Ọsọ ndụ ka anyị malitere ịgba."
Cheta na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ọgbakọ Soludo bụ onye na-azọ oche gọvanọ Anambara steeti n'ukpuru pati All Progressives Grand Alliance (APGA) na-eme n'Isuofia n'ụbọchị Wenezde.
Maazị Soludo zara ekwenti ya oge BBC Igbo kpọrọ ya mana onweghi ọtụtụ ihe o kwuru banyere ihe mere ya.
Ọ bụ na mgbede Wenezde ka kepụ kepụ maka mkpa mkpa n'Isuofia pụtara na soshal media.

Ebe foto si, Ejimofor Opara
Akụkọ ahụ kwuru na ndị oji egbe wakporo ebe Chukwuma Soludo - bụbu onyeisi ụlọakụ ukwu na Naịjiria - na ndi ntoroọbịa Isuofia na-eme nzukọ ma gbuo ndị uweojii abụọ.
Maazị Opara kwuru na nke ahụ bụ eziokwu.
Ọ sị: "Ọ bụghị nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị ka anyi na Soludo gara. Ọ bu okwu Bekee na-akpọ "stakeholders meeting"ka anyị na-eme n'Isuofia."
Lee ihe Maazi Opara kwuru n'uju ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post

Ebe foto si, Nigeria Police
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenganyia kwetere na ya bụ ọgbaaghara mere n'ezie mana mana ha ka nọ na nchọpụta ịma ka o siri mee.
Mana o kwukwara na ndị oji egbe a tọrọ Kọmịshọna na-ahụ maka ihe mmepe obodo Bekee kpọrọ "Public Utilities" bụ Emeka Ezenwanne bu onye amabeghi ebe o nọ ugbua.

Ebe foto si, Nigeria Police
N'akwụkwọ mgbasa ozi Ikenganyia binyere aka na ya, ndị uweojii Anambara kwuru na ọ bụ dịka onyeisi ndị uweojii n'Anambara bụ Monday Bala Kuryas akpọrọla ndị uweojii gaa nleta ebe ihe amere.
Ọ sịkwa na ya ka na-eche ịmata ka o nwere ndị ndị ahụ ekwensu jiri kwara ngwaọrụ meruru ahụ.
Anwụchiela otu onye maka ihe a mere.
gwara BBC na ọ bụ ndi Onye bụbu gọvanọ Anambara steeti bụ Peter Obi, etinyela ọnụ n'ihe mere n'Isuofia n'ụbọchị Wenezde, ma kwuo na ya bụ ihe adịghị mma ma ncha.
Peter Obi kwuru nke a n'akara Twitter ya n'ụtụtụ Tọzde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ọ sịkwa ka ndi nchekwa gbaa mbo nwụchie ndi kpara ike a me gbaa ha n'anwụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Nigeria Police










