'Ndị omekome chegharịa ma ọ bụ si Anambra pụọ" John Abang CP Anambra steeti
Akụkọ dị mkpa ụbọchị Fraide:
Onyeisi Ndị Uweojii n'Anambra steeti bụ John Abang adịla njikere imegide ndị Omekome

Ebe foto si, NPF
Onyeisi ndị uweojii na Anambra steeti bụ John Abang ewkusiela ike na ya ga-enye aka ka Anambra steeti bụrụ kpoo na-nchekwa.
O kwukwara na ha ga akpalite "Operation Puffadder i ji chụpụ ndị otu nzuzo,ndiohi ma ọkachasị ndị ntọrị."
John Abang kwuru nke a mgbe ọ na agwa ndi ntaakụkọ okwu n'ọka bụ nke mbụ ọ na enwe ụdị mkparita uka a
" I ma na ihe onye egwu bọolụ a n'amasị m" Antonio Conte

Ebe foto si, PA Wire
Onyeisi ndị otu bọọlụ Inter Milan bụ Antonio Conte ekwuola na ọ ga amasi ya ma ọ bụrụ na ha gote Romelu Lukaku dịka onye egwu bọọlụ.
Kama o kwuru na ihe so n'egbochi ha bụ ego ndị Manchester United ga etinye n'isi Lukaku.
FAAN anwụchiela onye begoro n'elu ụgbọelu:

Ebe foto si, Instagram / otto_orondaam
Ndị ọrụ nchekwa ụgbọelu nke ngalaba ndị nchịkọta njem ụgbọelu a kpọrọ Federal Airports Authority of Nigeria (FAANs) na Bekee anwụchiela otu nwoke ka ọ rịgoro ụgbọelu na-achọ ifepụ.
Nwoke ahụ bu akpa rigoro ụgbọelu Azman ahụ nwere akara '5N-HAI ' nke si Legọs aga Pọtakọt ụbọchi Fraide dịka ha na-eche ka e nye ha ikike ifepụ.
Ha kwuru na ọ bụ ọkwọugboelu ahụ nyere ha kpesa ha jiri nwụchie ma jichie nwoke ahụ nke akpọbeghị aha ya.
N'ozi ọnụ na-ekwuru FAAN bụ Henrietta Yakubu wepụtara, o kwuru na Faan na-emenyocha ihe ahụ merenụ, ebe ụgbọelu ahụ hapụụla gawa Pọtakọt dịka ha tọọ anya n'ala were nyochakwa ya.
A tụọla otu nwoke nga mkpụrụọka maka igbu ndị ezinaụlọ ya mmadụ ise

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwoke ga-aga mkpọrọ apụtaghị apụta maka igbu nwunye ya, ụmụ ya atọ gụnyere ejima nakwa nnenne ha.
Anthony Robert Harvey, onye gbara afọ 25 gburu nwunye ya dị afọ 41, ụmụejima ya gbara afọ abụọ nakwa ada ya dị afọ atọ nakwa nnenne nwunye ya na Perth dị na mba Australia afọ 2018.
Harvey, onye ji okporoigwe na mmma were kpaa mkpamkpa ahụ kwetara na ya mere ya n'ezie.
O bụrụ ụzọ kugbu nwunye ya ka ọ lọtara ọrụ n'abalị, sụgbuo ụmụ ya atọ ebe ha nọ n'ụra.
O gbukwara nne nne ha ka ọ bịara ụbọchị na-eso ya ịbịa leta ụmụụmụ ya.
Nke a bụ mbụ ụlọikpe mba Australia na-atụ mmadụ nga apụta apụta.
Nwanne Harvey kwuru na mkpebi ụlọikpe dị "ezigbo mma."
Ooni agwala Buhari okwu na ntị maka ndị Fulani

Ebe foto si, Femi Adesina/ Facebook
Onye Eze ọdịnala a ma ama bụ Ooni nke Ife na-arịo Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o sie imi n'ala ma gụpụta ndị omekome na-eyi ụmụ Naijiria egwu.
Oba Adeyeye Ogunwusi onye kpọrọ oku a ụbọchị Tọọzde na nzute ya na Buhari, kwuru na ọbụ udo ka onye ọbụla chọrọ ọbụghị ihe nwere ike ibute agha.
Ihedioha na-eti mkpu ụgwọ Imo steeti ji
Gọvano Imo Steeti bụ Emeka Ihedioha na-eti mpu na steeti ahụ ji ụgwọ karịrị otu narị ijeri naira a na-amaghị ihe e ji ya rụpụta.
Ndị gburu ndị njem na Moroko anatala ikpe ọnwụ

Ebe foto si, AFP
A maala ụmụokorobia atọ ndị Morocco ikpe ọnwụ maka Igbu ụmụagbọgho abụọ gara njem nlere anya n'obodo ahụ.
Ndị ekperima a, bụ ndị na-akwado otu 'IS', gbupuru ụmụagbọghọ ndị ahụ isi n'ugwu Atlas n'ọnwa Disemba 2018.
Pinnick alaala

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, a chụọla onyeisi egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Amaju Pinnick n'ọrụ dịka osote onyeisi otu bọọlụ mba Afrịka niile bu CAF.
Iko Afcon nke 2019 ga-agwụ taa

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ Senegal na Algeria ga-achịpụ ya na abali taa n'asọmpi ikpeazu iko mba Afrịka nke afọ a.
Senegal na-atụ anya ibute iko mba Afrịka nke mbụ ha, ebe Algeria nwere nchekwube na ha ga-amabute ya bụ iko nke ugboro abụọ.
Asọmpi ahụ ga-ebiri ọkụ n'elekere asatọ nke abalị.
Gee Nkeji BBC ebe a:











