Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụegọ Trump

Donald Trump na ụtụego o manyere

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka akagbuola ụtụego Onyeisiala Donald Trump tụkwasara na ngwaahịa na mba ụwa

N'afọ 2025, Trump tinyere ego ụtụisi na ngwaahịa a na-ebubata n'Amerịka, sị na ọ bụ iji nyere Amerịka aka na mmepụta ngwaahịa

Mana kama inweta nkwado Ụlọomeiwu, Trump gbadoro ụkwụ na iwu nke gbatagbata nke akụnaụba mba ụwa nke afọ 1977 a kpọrọ 'International Emergency Economic Powers Act. Declaring an emergency 1977' were tinye n'ọrụ ozugbo.

N'ọnwa Ọgọst afọ 2025, Ụlọikpe Mkpegharị nke Amerịka nyere mkpebi na ọtụtụ ụtụego ahụ Trump tinyere megidere iwu.

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gara Ụlọikpe kachasị ka ha tụgharịa ikpe Ụlọikpe mkpegharị nyere gbasara ụtụisi o tinyere na ngwaahịa ọbụla a na-ebubate n'Amerịka.

Ebe foto si, Getty Images

Mana Ụlọikpe Kachasị tinyere aka n'ikpe ahụ dịka Ụlọọrụ Onyeisiala (White House rịọrọ ka a kagbuo mkpebi ahụ nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere.

Otu na-emegide ụtụego Trump chọrọ ka akwụhachi ụtụego ndị a nara ana

Otu nime otu nd i na-emegide ụtụego Trump tinyere a kpọrọ, "We Pay the Tariffs" aṅụrịla maka mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere nke kagburu ụtụego Trump tinyere na ngwaahịa.

Otu ahụ ebipụtala akwụkwọ ozi nke ha chọrọ ka ndị mmadụ ibinye aka iji kpoọọ oku ka a kwụghachi ego nile akwụrụ n'ụtụego .

Onyeisiotu ahụ bụ Dan Anthony.kwuru sị, "Mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere taa bụ nnukwu mmeri nye ụmụ obere ụlọahịa Amerịka bụ ndị ibu ụtụisi dara n'isi."

Anthony kwuru na Mkpebi ụlọikpe ahụ enweghị isi ma ọ bụrụ na a kwụghachi nke a natara anata.