Azụmahịa, enyemaka, nchekwa: Kedụ ka mmeri Trump ga-esi metụta Afrịka?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka o doro anya na Donald Trump enwetala mmeri dịka Onyeisiala Amerịka nke ugboro abụọ, ndị ndu Afrịka amalitela izibata ozi ekele ha.
"Zimbabwe kwụ chịm ịgbakọọrọ gị aka n'ọrụ", ka Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangawa dere ebe Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu gosiri olileanya na ọchịchị Trump nke ugboro abụọ ga-eweta mmepe akụnaụba na mgbakọaka n'etiti Afrịka na Amerịka.
Mana ọchịchị Trump nke ugboro abụọ ọ ga-adị mma n'Afrịka?
Oge mbụ ọ bụụrụ Onyeisiala, ndị nkatọ boro ya ebubo ileghara Afrịka anya tinyekwara ịkọwa ụfọdụ mba dị n'Afrịka dịka "mba ọnụ nsị".
Ka o siladị, o wepụtara ụfọdụ atụmatụ kwalitere azụmahịa n'Afrịka - atụmatụ ndị gara n'ihu na-arụ ọrụ n'ime afọ atọ ọ pụrụ n'ọchịchị.
Mana kedụ ka ọ ga-esi bịakwute Afrịka n'oge ọhụrụ a?
Azụmahịa na itinye ego
Ọchịchị Joe Biden na-apụ apụ "gbalịrị nnukwu igosipụta na Afrịka bụ onye mgbakọaka bara uru", ka W Gyude Moore bụbu Minista Laịberịa gwara BBC.
Iji maa atụ, e toro Amerịka maka itinye ego n'okporo Lobito nke bụ okporoigwe gafere Angola, Demokratik Rịpọblik of Kongo na Zambịa bụ nke a ga-eji ebufe ngwongwo ndị dị oke mkpa.
N'afọ 2023, Amerịka kwuru na ha etinyela ego karịrị ije dọla iri abụọ na abụọ ($22) kemgbe Biden banyere n'ọchịchị.
Mana a na-enwe mmetụta na Trump nwereike ịkwụsị atụmatụ ndị a.
Atụmatụ African Growth and Opportunity Act (Agoa) mere ka mba ndị Afrịka tozuru oke na-atụga ụfọdụ ngwaahịa ha mba Amerịka na-akwụghị ụtụisi kemgbe afọ 2000 bụ nke e kwesịrị ilebara anya.
N'oge ọchịchị ya gara aga, Trump kwuru na a ga-elebagharị anya n'atụmatụ ahụ oge ọ ga-akụrụ ọnụ n'afọ 2025.
Ma oge ọ na-achụ nta vootu, o kwere nkwa imejupụta mgbakwunye ụtụisi pasenti iri (10%) na ngwaahịa e mepụtara na mba ndị ọzọ.
Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Saụt Afrịka ekwuola na ịkachapụ Agoa ga-emetụta ọnọdụ akụnaụba.
N'afo 2018, ọchịchị Trump wepụtara Prosper Africa na Development Finance Corporation (DFC) nke na-akwado atụmatụ mmepe dị iche iche n'Afrịka nakwa gburugburu ụwa.Biden.
Enyemaka

Ebe foto si, Getty Images
Afrịka na-enweta ọtụtụ enyemaka ya site n'Amerịka, bụ ndị ha kwuru nyere ha ego ruru dọla atọ na ụma asaa ($3.7) n'ime afọ a.
Mana ọchịchị Trump gara aga mere atụmatụ ugboro ugboro ibelata enyemaka ya gaa mba ndị ọzọ, ka ụfọdụ akụkọ kwuru.
Ụlọ omeiwu Congress jụrụ ịnabata nke a.
Ọ bụrụ na e mejupụtara mbelata ndị ahụ, "atụmatụ Amerịka banyere ahụike, nkwalite ọchịchị onye kwuo uche ya na enyemaka nchekwa maka mba Afrịka gaara akwụsị," ka Council of Foreign Relations kwuru.
A na-atụkwa egwu na Trump nwereike mechie Pepfar bụ atụmatụ Amerịka malitere kemgbe nke ha tinyerela ọtụtụ ego na ya iji buo agha megide ọrịa HIV n'Afrịka.
N'afọ gara aga ndị omeiwu pati Rịpọblikan gbara ụkwụ megide Pepfar, boo ebubo na atụmatụ ahụ na-akwalite ite ime. E nyere nkwado ka agbatịkwuo ya nwa oge ruo ọnwa Maachị afọ na-abịa abịa, mana Trump dịka onye a maara maka ịgba ụkwụ megide ite ime nwere ike igbochi nke a.
Ndị ọbịa

Ebe foto si, Getty Images
Ebumnoobi Trump gbasara ndị esighị ezi ụzọ bata Amerịka bụ nke doro anya. Oge ọ na-achụ nta vootu, o kwere nkwa ịchụla otu nde mmadụ enweghị nkwado iwu ịnọ n'Amerịka.
Nke a metụtara Afrịka dịka n'afọ 2022, edekọtara aha ndị ọbịa si Afrịka puku iri na atọ (13,000) n'okeala Mexico na Amerịka. N'afọ 2023, ọnụọgụ mmadụ a eruola puku iri ise na asatọ (58,000). Ụfọdụ mmadụ ndị ahụ kwuru na ha na-agba ọsọ n'ihi agha, mkpagbu na ụbịam.
Nke a agaghị abụ atụmatụ ya mbụ megide ndị ọbịa. N'ọchịchị mbụ ya, Trump webatara atụmatụ ga-ebelata ndị ọbịa sitere n'ọtụtụ mba Afrịka gụnyere Naịjirịa, Eritrịa, Sụdan na Tanzanịa.
Ụlọ mgbasaozi Kenya bụ Taifo kwuru na ndị ọbịa otu narị puku na iri isii (160,000) sitere Ọwụwa anyanwụ Afrịka na-enwe obi mmapụ na ha ga-agabiga ịkpa oke oge Trump ga-abụ Onyeisiala.
Nchekwa na ọgbaaghara

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka Trump pụrụ n'ọchịchị, Rọshịa gosiri onwe ha n'Afrịka.
Otu ụzọ pụtara ihe ha siri mee nke a bụ site n'ịrọpụta ndịagha na ngwaagha na mba ndịagha isi ekweghị ọnwụ na-akpa ike dịka Mali, Nijie na Bọkịna Faso.
Trump ọ ga-akwado mba ndị Afrịka na mbọ ya ịkwapụ Rọshịa?
"Ọ bụnadị na ndịagha Amerịka na-ahụta Rọshịa dịka ihe iyi egwu, Trump n'onwe ya ahụtaghị Rọshịa dịka ihe iyi egwu," ka Moore gwara BBC.
A na-ebugharị akụkọ na Trump na Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin nwere ezi mmekọrịta.
Ka o sinadị, Trump azọbatala ụkwụ na mgbe gara aga inyere Naịjirịa aka buo agha megide ndị Boko Haram.
"N'oge ọchịchị Barrack Obama, ndị Naịjirịa bi n'Amerịka gbachiteere ya mana ọ jụrụ ịnabata arịrịọ Naịjirịa ka e bunye ha ngwaagha. Oge ndị Boko Haram na-awakpo obodo anyị dị na mgbago ugwu Naịjirịa, ọ bụ Trump kwadoro ka azụbata ụgbọelu ndịagha bụ Tucano jet, iji nyere anyị aka kekpọọ nchekwa anyị," ka onye bụbu omeiwu, Ehiozuwa Johnson Agbonayinmma gwara ụlọ mgbasaozi Naịjirịa bụ Vanguard.
Okwu ọzọ bụkwa agha ime dị na Sụdan, nke na-akpọtụ kemgbe ọnwa iri na asatọ ma gbuokwa puku kwuru puku mmadụ.
Mana nke bụ eziokwu bụ na enweghị onye maara ebe Trump ga-elekwasa anya ma ọ banye n'ọchịchị.









