Igbo idioms: Lee ụfọdụ akpalaokwu Igbo ji eri okwu na ihe ha pụtara

Ebe foto si, GettyImages
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Akpalaokwu b okwu maọbụ ahiriokwu nghọta dị na ya dị iche na mkpụrụokwu e ji mebe ya.
Dịka ilu, akpalaokwu nke bekee kpọrọ 'idiom' bụ mmanụ ndị Igbo ji eri okwu.
Akpalaokwu bụ otu n'ụzọ e si achọ okwu mma n'ụzọ gosiri ihe omimi, dịka Chigozie Nnabuife bụ ọkammụta na nka Asụsụ (Linguistics) na mahadum 'University of Lagos' si kọwaa.
Ọ sịrị, "Akpalaokwu bụ ụzọ e si ekwu okwu n'ụzọ dị omimi ka nghọta ya were gbaa ilu karịa ka a tụrụ anya."
"Nke bụ ụzọ e si ekwu okwu dị omimi".
Ọzọ bụ na akpalaokwu bụ ụtọasụsụ e ji mara ndị nke na-adị iche site na asụsụ gaa n'asụsụ.
Njirimara akpalaokwu na ihe ndịiche dị na etiti ya na ilu
E nwere ihe dị iche n'etiti ilu na akpalaokwu.
Ha gunyere:
- Akpalokwu na-adị nkenke karịa ilu.
- Ilu na-abụkarị okwu nwere nkeji abụọ
Nnabuihe sịrị, "Ilu na-abụkarị ahịrịokwu enwe ntụrị abụọ."
" Iji maa atụ, 'I ji maa atụ, 'ọkụkọ tụhie, olu hie ya.'"
"Ihe a kpọrọ aha n'akpalaokwu , ọtụtụ mgbe anaghị enwe ihe jịkọrọ ya na mpụtara ya."
"Mana n''ilu, mpụtara ya na-adị na ihe a kpọrọ aha."

Ebe foto si, Getty Images
Lee ụfọdụ akpalaokwu na mpụtara ha:
1. Ọ bụ edi: Nke pụtara na onye a na-ekwu maka ya na-ehi oke ụra.
2. Anya dị ya n'elu: Nke a pụtara na ọ naghị etinye anya n'ihe nke ọma.
3. Ọ kwatara agba nna ya: Nnabuife kọwara sị, "patakwa agba ya, asịghị ya were agba nna ya. Ọ pụtara na ọ na-eme ka nna ya."
4. Ntị chiri ya: Nke a pụtaghị na onye a na-ekwu maka ya anaghị anụ ihe kama ọ bụ onye anaghị ege okwu a gwara ya.
5. Aka kpara ngaji, ure egbuo ọnụ: Nke pụtara ịhụ ihe ọma, obi atọ gị ụtọ.
6. Ime aka abụọ: Nke a pụtara na onye a na-ekwu maka ya na ezu ohi.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
7. Ịwa agba: Nke a pụtara na a ga-ata gị ahụhụ.
8. Edi suru ya ọnụ: Ọ bụ ajọ nwata maọbụ o nwere ajọ agwa.
9. Isi ike: Ọ naghị anụ ndụmọdụ.
10. Iti aka na tipa bu aja: Nke a pụtara i tinyere aka na nsogbu tara akpụ maọbụ ihe agaghị amịta mkpụrụ.
11. Afọ ịta mmiri: Nke a pụtara na onye a na-ekwu maka ya nwere obi ọjọọ
12. Obi dị ya n'azụ: Nke pụtakwara na onye anyị nwere obi ọjọọ, ọ naghị emere mmadụ ebere.
13. Akpịrị ogologo: Nke a pụtara na onye ahụ dị ụsa, ọ maghị etu a si asị mba ma enye ya ihe.
14. Aka esighị ya ike: Nke a pụtara na o nweghị ego.
15: O nwereobi mkpu: Ọ bụ onye anaghị emere mmadụ ebere.
16. Anya dị ya n'ama: Nke a pụtara na onye ahụ na-agba n'ezi.
17.Onye ihu abụọ: Nke a pụtara na onye ekwesịghị ntụwasị obi.
18. Ire dị ya nkọ: Nke a pụtara na ọ bụ onye asịrị.
19. Mmiri abakwala nwa m ntị: Nke a pụtara ihe ọjọọ emekwala nwa ya.
20. Onye ọkụ elu: Nke a pụtara onye akwụna.
21 Ị wa ajị n'ume: Nke a pụtara i jisi ike.
22. Ịdị ala nso: Nke a pụtara onye dị mkpụ mkpụ.
23. Obi kpọrọ ya nkụ/Afọ tara ya mmiri: Nke a pụtara na ọ bụ onye ajọ obi, o nweghị ọmịiko
24, Ọ tara isi mbe: Ihe anaghị emetụta ya maọbụ fụọ ya ụfụ.
25. Isi na-anọ ya ọkụ: Nke a pụtara na ọ ma akwụkwọ.
27. Ọ nwụ ọkwa n'aka were bịa: Nke pụtara na ọ bịara n'oge.
28. Inye aka azụ: Inye ngarị
29. Ipu eze elu: Onye ahụ mere arụ maọbụ ihe e kwesịghị
30. Inwe anya ọkụ: Nke a pụtara inwe obi adịghị mma n'ihi ihe onye ọzọ nwere
31. Ịkụkọ mmadụ isi: Itinye esemokwu n'etiti mmadụ na ibe ya
32. Ịgba isi akwara: I kwechiri











