Igbo culture: Ụzọ isii ndị Igbo si ekpezi esemokwu oge gboo

Ndi na-agba mgba
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Mgbe ọbụla mmadụ maọbụ obodo na ibe ya na-enwe mmekọrịta, esemokwu nwere ike ịdapụta n'ihi ndiiche n'echiche onye na ihe onye na-achọ mana ọ bụ e lee, a ghara ka di na nwunye ji ebi.

Igbo nwere ụzọ dị iche iche e si edozi esemokwu maọbụ nghọtahie n'etiti di na nwunye, nwanne na nwanne, ezinaụlo na ezinaụlọ, ụmụnna na ụmụnna, otu na otu, maọbụ obodo na obodo.

Aha onyonyo, Ofalla ala Igbo

Otu onye ihe omenala doro anya bụ Durueke Ngwangene bunyere anyị uche etu ndị nna ochie si eme ya.

Lee ụfọdụ ụzọ ndị gboo si edozi esemokwu dịka o siri rụtụ aka:

1. Ịṅiyi

Nwoke bu efe nzu

Iyi bụ mmadụ iji ihe karịrị ya kwe nkwa maọbụ gọrọ onwe ya na aka ya dị ọcha maọbụ na ihe a na-ebo ya abụghị eziokwu maọbụ na ọ bụ.

A na-aṅụ iyi n'esemokwu dịka ịzọ ala maọbụ nnukwu ebubo. Nke a na-emekarị oge ndị ọzọ etinyechala ọnụ n'okwu ahụ mana edoziteghị ya.

A na-aṅụ iyi n'arụsị, obi, maọbụ n'ala ndị ichie. Nwangene kwuru na a na-ekwubi okwu ihe ga-eme onye aka ya adịghị ọcha ma a na-aṅụ iyi.

Ọ gara n'ihu gbaa akaebe maka ihe mere oge ọ dị na nwata sị, "Ahụla m onye e mere otu a, ala tigbuo ya."

2. Igba ndụ

Ndí ntorobịa na-eme omenala

Ịgba ndụ bụ ikwe nkwa na ịgaghị eme ibe gị ihe ọjọọ. A na-eji ihe dị icheiche agba ndụ.

Ụfọdụ na-eji nri agba ndụ. Ụfọdụ, mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n'anya na-eji ọbara agba ndụ iji hụ na otu onye agaghị agbahapụ ibe ya.

Mba na mba na-agba ndụ. Ndị nọ n'otu na-agbakwa ndụ.

Iji maa atụ, otu mmọnwụ iji chekwa ihe nzuzo dị n'etiti ha.

Otu dịga iche iche na-agba ndụ. Ọmụmaatụ, ndị nze na-agba ndụ na ị gaghị eme ụfọdụ ihe dịka; ị gaghị atụ asị, ị gaghị ezu ohi, ị gaghị awakpo nwaanyị n'ike wdg.

Nwangene kwuru sị, "A na-eji ihe dịka uriom ọkụkọ maọbụ okpete saa onye ahụ ire."

"Ịgbachaa ndụ ahụ, ị gaghị na-ekwu okwu etu ọbụla."

3. Ilu na ụkabụilu

Ilu bụ mmanụ ndị Igbo ji eri okwu; nke a bụ ụkabụilu a ma ama.

Mana ị matara na ilu bụkwa mmiri na-amari esemokwu?

Ndị Igbo sị na ọ bụ ire ọma ka eju ji aga n'ogwu.

Aha onyonyo, Igbo Culture: Usoro e ji echi nze n'ala Igbo

N'ala Igbo, a na-eji ilu akpọdata ndị obi ha lara elu n'ihi esemokwu site na ime ka ha chebaa echiche ime, ma kpee udo.

Lee ụfọdụ ilu ndị bụ igodo Igbo ji agbape ụzọ esemokwu gbachiri:

a. "Ọfọ ka ide ji awa ala."

b. "Ire Ọma ga-ejula ji aga n'ogwu."

ch. "Hapu ihe niile tara n'abali ka ọ bụrụ anwụ."

4. Orikọ

Ndí na-erikọ

O nwere ụdị esemokwu e nwere ike inwe, e sie nri rikọ were dozie ya bụ okwu.

Dịka Dureke Nwangene siri kọwaa, a na-akpọ ya "akanọkụ' maọbụ "orikọ."

"Ọ naghị ahịa ahụ o gbuo mmadụ n'ihi na a na-ekwubi okwu tupu e rikọọ ya."

Anú ọkụkọ

A na-ekwubi okwu tupu erie nri ahụ nye ọmụma atụ, a na-eme ụdị oriri a n'alụm nwaanyị.

A na-eji ewu mee ya, ya bụ ịgba iyi na ị gaghị eme ibe gị ihe ọjọọ.

5. Ihe onyinye

Akwụkwọ 'Things Fall Apart' nke Chinua Achebe dere

Ebe foto si, Getty Images

N'ala Igbo oge gboo, a na-eji ihe ubi, ego, ala, anụmanụ maọbụ mmadụ nye onyinye iji dozi esemokwu.

A na-eme nke a n'esemokwu dị n'etiti mmadụ na mmadụ ibe ya maọbụ obodo na obodo.

Chinua Achebe n'akwụkwọ ya ọ kpọrọ 'Things Fall Apart' kọrọ akụkọ etu ndị obodo Mbaino siri nye ndị Ụmụọfịa onyinye otu nwa nwoke gbara afọ iri na ise a kpọrọ Ikemefuna.

Nke a bụ iji dozie okwu pụtara ka ha gbuchara otu nwaanyị onye Ụmụọfịa were si etu ahụ gbalahụ ha na ndị Ụmụọfịa ịlụ agha.

Dịka Nwangene siri kọwaa n'ala Igbo, "Isi na Isi na-ala. I gbuhaala mmadụ n'ala Igbo, ihe ị ga-eji mechie ya bụ mmadụ."

6. Ịjụ ese

Ụkpa ikperikpe

Mgbe ụfọdụ ekpewe ikpe n'ime ụlọ maọbụ n'ama mana ekpesiteghị ya, e nweere ị ga-arụsị maọbụ na nke nwa dibịa ụjụ ese.

Dịka Nwangene si kọwaa, n'ihe gbasara esemokwu ala, "a na-eje n'arụsị maọbụ gbaa afa iji mata nke bụ eziokwu."

Aha onyonyo, Igbo Language: Gịnị bụ 'Blue' n'asụsụ Igbo?

Kedụ ndị na-ekpezi esemokwu n'ala Igbo?

Ụmụada
Nkọwa foto, Ụmụada o na ndị na-ekpezi esemokwu n'ala Igbo

Ndị ọrụ ha bụ idozi okwu n'ala Igbo gụnyere:

  • Ọkpara
  • Ụmụnna
  • Ụmụada
  • Otu ọgbọ
  • Ndị okenye
  • Ọha na eze

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: