Ọmụgwọ ọ bụ omenala ga-akwụsị n'ala Igbo?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ile ọmụgwọ n'omenala Igbo bụ oge nne na-abịa ileta nwa ya nwaanyị na nwa ọ mụrụ (nke bụ nwa nwa ya).
Ụfọdụ oge, ọ bụrụ na nwaanyị enweghịzị nne (ọ bụrụ na nne mụrụ ya anwụọla), nwunye nna ya maọbụ nne di ya ga-abị nọrọ n'ụlọ ya lee ya ọmụgwọ.
Ihe mere o ji bụrụ nwaanyị na-ele ọmụgwọ kama nwoke, bụ maka na a na-ewe ya na ọ bụ nwaanyị kacha mara ihe gbasara ya maka na ọ gabigala ọnọdụ ahụ n'onwe ya.
Oge ọmụgwọ bụ oge nne na-akụziri nwa ya nwaanyị ihe niile ọ ma maka ilekọta nwa a mụrụ ọhụrụ.
Ụfọdụ oge, ọ na-abụ nne mụrụ nwa laa, nne di ya abịa bido lewe ya ọmụgwọ nke ya.
Nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-eji ohere ọmụgwọ zuru ike ma nne ya na-elekọta nwa ya.
Ihe nne na-eme n'ọmụgwọ
- Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma
- Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma
- Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n'afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki)
- Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ
- Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n'ahụ ọfụma
- Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n'elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje, nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta
- Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime
- Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n'ọnọdụ ahụ mbụ
- Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n'ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri

Ebe foto si, Getty Images
Uru ọmụgwọ bara
Ọmụgwọ bụ oge nne, nwa ya na nwa nwa ọhụrụ ya na-eji enwe ezigbo mmekọrịta nke bekee kpọrọ 'bonding'. Maka nke a ka ọtụtụ ndị nne na-eji aga ebe ọbụla nwa ha nọ mụọ nwa, ma n'ụlọ maọbụ na mba ofesi, ịga nọkọọ ihe ruru ọnwa atọ maọbụ karịa.
Ọ ga-akuzikiri nwa ya nwaanyị ihe ubeakwa nwa ya pụtara, maọbụ akwa agụrụ maọbụ akwa mmekpa ahụ.
Nri ekwesịrị iri n'ọmụgwọ
Nwaanyị a na-ele ọmụgwọ nwere nri ndị ọ na-eri. Ụfọdụ bụ iji asụchapụ ọbara kpụkọrọ ya n'afọ oge nwa nọ ya n'ime. Nri ndị a bụ ma mkpọrọgwụ ma ngwanri dị icheiche.
- Ofe mmiri ụda
- Ji mmiri ọkụ
- Ofe nsala
- Mmiri ọgwụ etere ete
- Tii dị ọkụ na akamụ
- Nri asụrụ asụ
- Nzu
- Azụ ọkpọọ na okporoko
- Anụ ọkụkọ
- Ụda
- Ehuru na ehu
- Ụzịza
- Ụtazị
- Nri ọbụla ga-enwe ezigbote ose

Nri nwaanyị ekwesịghị iri n'ọmụgwọ
- Ihe juru oke oyi
- Egwusi, ọgbọnọ na ofe ọbụla e ji mmanụ e si
- Ahuekere
- Nri ọbụla nwere abụba (nwaanyị anaghị eri ya maka na a na-ewe ya na abụba ga-akpụkọ ya n'afọ maọbụ n'ahụ)
Ngwụcha ọmụgwọ
Ọmụgwọ gwụ, nne bịara ọmụgwọ ga-enweta ihe buru ibu.
Ndị ọ bịara ileta ga-azụtara ya ihe onyinye dị icheiche dịka ego, akwa ọmụma, akpụkpọụkwụ, akpa, ihe nri dị icheiche, wee dịrị gawazie.
A ga-azụtara ya akpa nnu na akpa ncha nke ọ ga-eke ndị agbataobi ya ma ọ laruo ebe o bi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











