Lee ihe ụmụnwaanyị ji isiowu emezi

Nwada kere ishiowu

Ebe foto si, Game of Fros

Ọ bụ eziokwu na ndị nne nne anyị ha n'oge gboo bụ naanị isiowu na isiaka a kpara akapa bụ ihe ha maara ha ji achọ mma.

Ha na-eti isiowu n'ụzọ dị icheiche mana ọ gbanwere oge e bidoro ire ntutu ndị ọcha n'eyi.

Ụmụnwaanyị hapụrụ isiowu e ji mara ndị Afrịka bido iti nke ndị ọcha, nke mere na n'afọ ole ole gara aga, nwaanyị a hụrụ ebe ọ kpara isiowu; a na-ele ya anya ka:

  • Ọ bụ ya ka ụwa kara njọ, maka na o nweghi ego ọ ga-eji zụtali ntutu kwanye n'isi maọbụ ga jiri ihe mgbakwunye tinye n'isi jiri kpaa ya
  • Ọ bụ ya bu ụlọụka n'isi maka na o nwere ụdị okpukpe a na-ele anya na ọ bụ ha nwee ya bụ ụdị ishi okike
  • Ọ bụ mgbeke kachasị mgbeke na-amaghị etu nwaanyị si ejikwa onwe ya. Oge ahụ, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahapụ enyi ha maka na ọ na-akpa ishiowu.

Mana ugbua, ọ dịkwa ka o nwere ihe gbanwere. Ọ dịkwazi ka ụmụnwaanyị enwere ihe ha hụrụ na ya bụ ụdị isi.

Mana o nwere ihe dị iche na etu e si eke ya mgbe ahụ na ugbua.

Ugbua, ọ bụghịzị naanị owu eri ka e ji ekezi isiowu, a na-eji ma owu eri, ma owu rọba nakwa owu nke ndị Bekee a na-akpọ 'Brazillian Wool'.

ụmụagbọghọ na isi owu ha

Ebe foto si, Tuvia Kings

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-eji agwa masịrị ha akpa isi owu, etu o si gụọ ha

Oge mbụ, naanị agwa owu e nwere bụ ojii, mana ugbua, ụmụnwaanyị nwereike ịkpa isiowu jiri ụdị agwa ọbụla masịrị ha, etu o si gụọ ha.

Onye kere ishiowu

Ebe foto si, Game of Fros

Nkọwa foto, Nwata nwaanyị a jiri agwa mmemme kee isi nke ya

Agbanyeghi ụdị ihe ọgbara ọhụrụ ụmụnwaanyị jizi eke isiowu, ha atụfụbeghi owu rọba na owu eri. Owu eri na-arịazi ahụ inweta n'ahịa ugbua.

Isiowu

Ebe foto si, Amarachi Attama/ Facebook

Owu Rọba

Ebe foto si, Ezinne Harrie Aninwe/ Facebook

Nkọwa foto, Ndị ụfọdụ na-eti owu Bekee, ụfọdụ ka na-etikwa nke rọba

Ezinne Aninwe kwuru na agbanyeghi na isiowu na-adọtị ntutu, otu ihe ọọ mere ya ji akpa ya bụ na ọ dị ọnụ ala.

O kwuru na ọ naghị emefu ego ka ụdị isi ndị si emefu.

Onye ji naanị otu puku naịa nwereike ịkpa isi mara mma gụnyekwara akụrụngw ihe ndị ọ ga-etinye na ya, mana ike ụdị isi ndị ọzọ adịghị ọnụala etu ahụ.

Ụfọdụ ụmụnwaanyị kwuru na ishiowu na-afụ ụfụ nke ukwuu mere na ha anaghị akpa ya ma ndị ọzọ ekwenyeghi na nke a.

Isiowu anaghị akwụsị ụmụnwaanyị iti ụdị uwe ọbụla ha chọrọ, ha ji ya eti ma akwa ọdịnala ma nke bekee.

Chinonso Onyia

Ebe foto si, Chinonso

Nkọwa foto, Nwaanyị tiri uwe ọdịnala

Nwaanyị a bụ Chinonso Onyia kwuru na ihe o ekere isiowu bụ ihe ndị a:

1. Isi owu na eto ntutu ofuma2. Ọ naghị afụ ụfụ 3. O nwere ụdị mma isi owu na ama4. Maka na abụ m ezigbo nwa Ada Igbo, ọ na-amasị m ike isiowu n'ihi na ọ bụ isi e ji mara ndị Igbo.

Tuvia

Ebe foto si, Tuvia Kings

Nkọwa foto, Nwaanyị a ji ekike ndị ọgbara ọhụrụ tie isi owu nke ya
Obianujunwa

Ebe foto si, Cyndi

Nkọwa foto, Nwaanyị a tiri ishowu ma tee uri ọnụ etu nwa agbọghọ Igbo si eti mgbe gboo
Game of Fros

Ebe foto si, Game of Fros / Instagram

Nkọwa foto, Nwaanyị a ji ekike ndị bekee ji aga ọrụ wee tie ishiowu nke ya

Otu ihe dị mkpa ịmata bụ na ndị na-eme isi ekwuola na isiowu na-enye aka ichekwa ụdị ntutu Chineke nyere ndị Afrịka site n'ihuigwe ha siri ike.

Ha kwukwara na ọ na-enye aka eto ya bụ ntutu we hụụ na ọ gbatịrị nke ọma.

Ezinne Aninwe kwuru na otu ihe ya ji eke isiowu oge ụfọdụ bụ maka na ọ na-enye aka gbatịa ntutu ya ma mee ka ijikọ ya dị mfe.

Ụmụnwaanyị na-eti agbọghọ mgbe ochie kere isiowu nke ọma, o ga-abụ ya kpatara na ntutu ha toro eto nke ọma ma kwee ha nhazi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ