Lee ihe ụmụnwaanyị ji isiowu emezi

Ebe foto si, Game of Fros
Ọ bụ eziokwu na ndị nne nne anyị ha n'oge gboo bụ naanị isiowu na isiaka a kpara akapa bụ ihe ha maara ha ji achọ mma.
Ha na-eti isiowu n'ụzọ dị icheiche mana ọ gbanwere oge e bidoro ire ntutu ndị ọcha n'eyi.
Ụmụnwaanyị hapụrụ isiowu e ji mara ndị Afrịka bido iti nke ndị ọcha, nke mere na n'afọ ole ole gara aga, nwaanyị a hụrụ ebe ọ kpara isiowu; a na-ele ya anya ka:
- Ọ bụ ya ka ụwa kara njọ, maka na o nweghi ego ọ ga-eji zụtali ntutu kwanye n'isi maọbụ ga jiri ihe mgbakwunye tinye n'isi jiri kpaa ya
- Ọ bụ ya bu ụlọụka n'isi maka na o nwere ụdị okpukpe a na-ele anya na ọ bụ ha nwee ya bụ ụdị ishi okike
- Ọ bụ mgbeke kachasị mgbeke na-amaghị etu nwaanyị si ejikwa onwe ya. Oge ahụ, ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ahapụ enyi ha maka na ọ na-akpa ishiowu.
Mana ugbua, ọ dịkwa ka o nwere ihe gbanwere. Ọ dịkwazi ka ụmụnwaanyị enwere ihe ha hụrụ na ya bụ ụdị isi.
Mana o nwere ihe dị iche na etu e si eke ya mgbe ahụ na ugbua.
Ugbua, ọ bụghịzị naanị owu eri ka e ji ekezi isiowu, a na-eji ma owu eri, ma owu rọba nakwa owu nke ndị Bekee a na-akpọ 'Brazillian Wool'.

Ebe foto si, Tuvia Kings
Oge mbụ, naanị agwa owu e nwere bụ ojii, mana ugbua, ụmụnwaanyị nwereike ịkpa isiowu jiri ụdị agwa ọbụla masịrị ha, etu o si gụọ ha.

Ebe foto si, Game of Fros
Agbanyeghi ụdị ihe ọgbara ọhụrụ ụmụnwaanyị jizi eke isiowu, ha atụfụbeghi owu rọba na owu eri. Owu eri na-arịazi ahụ inweta n'ahịa ugbua.

Ebe foto si, Amarachi Attama/ Facebook

Ebe foto si, Ezinne Harrie Aninwe/ Facebook
Ezinne Aninwe kwuru na agbanyeghi na isiowu na-adọtị ntutu, otu ihe ọọ mere ya ji akpa ya bụ na ọ dị ọnụ ala.
O kwuru na ọ naghị emefu ego ka ụdị isi ndị si emefu.
Onye ji naanị otu puku naịa nwereike ịkpa isi mara mma gụnyekwara akụrụngw ihe ndị ọ ga-etinye na ya, mana ike ụdị isi ndị ọzọ adịghị ọnụala etu ahụ.
Ụfọdụ ụmụnwaanyị kwuru na ishiowu na-afụ ụfụ nke ukwuu mere na ha anaghị akpa ya ma ndị ọzọ ekwenyeghi na nke a.
Isiowu anaghị akwụsị ụmụnwaanyị iti ụdị uwe ọbụla ha chọrọ, ha ji ya eti ma akwa ọdịnala ma nke bekee.

Ebe foto si, Chinonso
Nwaanyị a bụ Chinonso Onyia kwuru na ihe o ekere isiowu bụ ihe ndị a:
1. Isi owu na eto ntutu ofuma2. Ọ naghị afụ ụfụ 3. O nwere ụdị mma isi owu na ama4. Maka na abụ m ezigbo nwa Ada Igbo, ọ na-amasị m ike isiowu n'ihi na ọ bụ isi e ji mara ndị Igbo.

Ebe foto si, Tuvia Kings

Ebe foto si, Cyndi

Ebe foto si, Game of Fros / Instagram
Otu ihe dị mkpa ịmata bụ na ndị na-eme isi ekwuola na isiowu na-enye aka ichekwa ụdị ntutu Chineke nyere ndị Afrịka site n'ihuigwe ha siri ike.
Ha kwukwara na ọ na-enye aka eto ya bụ ntutu we hụụ na ọ gbatịrị nke ọma.
Ezinne Aninwe kwuru na otu ihe ya ji eke isiowu oge ụfọdụ bụ maka na ọ na-enye aka gbatịa ntutu ya ma mee ka ijikọ ya dị mfe.
Ụmụnwaanyị na-eti agbọghọ mgbe ochie kere isiowu nke ọma, o ga-abụ ya kpatara na ntutu ha toro eto nke ọma ma kwee ha nhazi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










