Ụmụnwaanyị dị ime emeela ngagharị iwe n'Ondo steeti

Ụmụnwaanyị dị ime

Ebe foto si, Aproko girl

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị dị ime achọghị ịkwụ ọtụtụ ụgwọ ndị ụlọọgwụ na-ana ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ihe ruru ụmụnwaanyị narị abụọ (200) dị ime mere ngagharị iwe n'isi obodo Akure dị n'Ondo steeti ụnyaahụ.

Iji kwuputa etu o siri jide ha n'olu, ụmụnwaanyị ndị a gara n'Ondo State Specialist Hospital mere ka gọọmentị mata na ha achọghị ịkwụ ụgwọ ọhụrụ a na-asị ha kwụọ.

Ha nọchiri ọnụụzọ ụlọọgwụ ahụ ma gbochikwa ndị bịara ịnata ọgwụgwọ ịbata n'ụlọọgwụ.

Ụmụnwaanyị a kwuru na ego a na-ana ha pụtara N25,000 maka ịmụ nwa na nkịtị nakwa N50,000 nke ịmụ nwa site n'ịwa afọ, karịrị akarị.

Akụkọ ga-amasị gị

Ụmụnwaanyị a kwuru na ha na-akwụbu N1,000 iji denye aha ha maka nyocha ahụ tupu a mụọ nwa nke bekee kpọrọ antenatal, mana ugbua ha na-akwụzị N4000.

Ha kwukwara na ebidoro ịna ha N500 ọzọ maka oge ọbụla ị bịara nyocha antenatal.

Iwe ha bụ na ha anaghị akwụbu ụgwọ iji mụọ nwa karịa N1,000 ahụ oge Olusegun Mimiko nọbu n'ọchịchị, mana ugbua o juru ha anya ụdịrị ego a na-ana ha.

State specialist hospital Akure

Ebe foto si, Aproko girl

Ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2