Premiership: Otu di icheiche na-akwadebe agha

Ebe foto si, Getty Images
Asọmpị na ngwụcha izuụka a bụ ụbọchị asaa n'ime onwa nkea ga-ahu ọtụtụ otu egwuregwu sọ mpi.
Na Premier League, Liverpool na Everton ga-asọ mpi na elekere iri abụọ na okara nke ehihe.
Christal Palace na Bournemouth, Newcastle na Leicester ga-asọmpi n'elekere atọ n'ehihe.
Stokecity na Tottenham Hotspur ga-esokwa n'oge ahụ.
Asọmpị kachasị mkpa
Mana asọmpị ha kachasị atụ anya bụ nke Man City na Man United.

Ebe foto si, Getty Images
Ha ga-asọ mpi a n'elekere isi na okara nke abalị satọde.
Otu ọkachamara n'ihe gbasara egwurugwu bụ Stephen Mbonu gwara BBC Igbo na obi ya kwuru na Man City ga-emerị n'asọmpị a.
O kwuru na: "cheta na Liverpool meri Man City n'ụbọchị abụọ garaaga. Asọmpi a bụ ụzọ ha ga-eji kpanite mmụọ ọzọ"
Man United ha dị njikere?
Mbonu kwuru na Lukaku na Pogba bụ ndị ga-enye Man United nsogbu na asọmpị a.

Ebe foto si, Getty Images
N'okwu ọnụ Mbonu: "ọ bụrụ na Man United lee ihe onyonyo ka Liverpool sịrị merị Man City ha nwere ike ị ma Man City aka ntị n'asọmpị a"
Tottenham na Stokecity
Nkea bụ asọmpị ọzọ ndị egwuregwu na-amasị na-atụ anya.
Stoke City ga-ejii anya ọnwụ na ndụ sọ mpị a makana ha so na ndị a nwere ike ịgbapu na iko premier league.
Mana Tottenham na-agba mbọ ugbua ka ha ba otu anọ kachasị mma makana sọọsọ asọmpi premier league ka ha nọrọ ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị:









