Anyị wakporo Mother Valley, kpaa ndị Ipob/ESN eze- Ndịagha Naijiria

Ndị a nwụchiri

Ebe foto si, Nigeria Army

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu ọrụ nchekwa pụrụ iche gụnyere ndịagha, ndị uweojii na ndị 'Civil Defence' a kpọrọ "UDO KA (OPUK)' wakporo akwụ ndị otu Ipob//ESN dị na 'Mother Valley, Nkwere, Anambra steeti kpaa ndị otu Ipob/ESN nọ n'ọhịa ahụ eze.

N'ozi ha wepụtara n'akara ọbaozi ha na Facebook ụbọchị Fraide, Ndịagha Naijiria kwuru na ha na "ndị ' omekome' ahụ ji ogbunigwe nakwa egbe Ọka kwarịtara mgbọ tupu ha gbagbuo otu onye n'ime ha , ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe n'ahụ gbalaga".

Nsogbu nchekwa naada n'Anamabra steeti nakwa steeti dị iche iche n'ọwụwa Anyanwụ dịka ntọ na ọgbugbu na ntọrị ndị mmadụ na-eme.

Ọtụtụ mgbe, goọmentị na dịọrụ nchekwa Naijiria eboola otu nnewereonwe Biafra aka ha ịdị n'nsogbu a, ebe Ipob gọọrọla naka ha adịghị ya.

Ọhịa 'Mother Valley' dị na nkwere, Anambara Steeti

Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook

HOzi ahụ gara n'ihu kwuo na ha nwetara ngwaọgụ, egbe 'pump action' abụọ, na ihe ndị ọzọ , ebe ha gara n'ihu bibie agwụ ahụ .

N'otu aka ahụ, ndị nchekwa nwuchiri ndị Ipob abụọ bụ ndị ọgba agba na-agbara otu ha ama ije ndịagha.