Ụbọchị ntuliaka afọ 2027: INEC ekwuola okwu gbasara mkpesa ndị mmadụ

Ụbọchị ntuliaka afọ 2027: INEC ekwuola okwu gbasara mkpesa ndị mmadụ

Ebe foto si, INEC, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC ekwuola okwu gbasara mmetụta ụfọdụ mmadụ maka usoro ntuliaka afọ 2027 ha wepụtara na nso nso a.

N'ụbọchị Fraịde 13 Febụwarị 2026 ka INEC kwupụtara na ha ga-ahazi ntuliaka onyeisiala na nke ndị omeiwu Naịjirịa n'ụbọchị 20 Febụwarị 2027, ma hazie nke ndị aka na-achị steeti na ndị omeiwu steeti n'ụbọchị 6 Maachị 2027.

INEC tinyekwara oge ntuliaka pati dị iche iche n'agbata 22 Mee na 20 Juun 2026 iji họpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa dị iche iche.

Ka o sina dị, ụfọdụ ndị Naịjirịa gosiri mmetụta gbasara ụfọdụ ụbọchị ntuliaka ndị ahụ, ọkachasị ndị Alakụba, dịka ha kwuru na ọ danyere n'ọnwa nsọ nke Ramadan.

Ha kwuru na obubuọnụ ha nwereike ịmetụta ọnụọgụ mmadụ ndị ga-apụta maka ịtụ vootu, ndị ga-ahụ maka njem, ndị nlereanya nakwa ndị ọrụ INEC.

Otu n'ime ndị kpọrọ oku a bụ onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar, onye gbara ụlọọrụ INEC ume ka ha lebagharịa anya n'ụbọchị ndị ha kwupụtara.

N'ihi nke a, Onyeisi kọmitii na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ INEC bụ Mohammed Haruna wepụtara ozi n'ụbọchị Fraịde, ma kwuo na a haziri usoro ntuliaka ahụ site n'ịgbaso iwu Naịjirịa nke afọ 1999, Iwu Ntuliaka nke afọ 2022 nakwa Iwu na Usoro ụlọọrụ INEC gbasara ịhazi ntuliaka nke afọ 2022.

Haruna kwuru na ọ bụ Iwu na Usoro ụlọọrụ INEC gbasara ịhazi ntuliaka, bụ nke malitere ọrụ kemgbe afọ 2019 na-etinye ụbọchị a na-ahazi ntuliaka.

Ma n'agbanyeghị, INEC kwuru na ha anabatala mkpesa ndị niile nwere aka oke gbasara ndanye ahụ.

Ntuliaka 2027: Lee Ntuziaka etu ọ ga-esi gaa

Joash Amupitan na onye ọrụ Inec

Ebe foto si, Inec/Facebook

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ehiwela ntuliaka Onyeisiala, nke ndị Ụlọomeiwu nke etiti n'ụbọchị Satọde 20 Febụwarị 2027, ebe ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-abụ n'ụbọchị Satọde 7 Maachị 2026.

Onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Joash Amupitan bụ onye wepụtara ntuziaka usoro ntuliaka n'Abuja dịka ọ na-agwa ndị ndu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị na-gba mbọ maka ikike dịịrị onye n'ụbọchị Fraide 13 Febụwarị, 2026.

Joash Amupitan bụ onyeisioche ụlọọrụ Inec

Ebe foto si, Inec/Facebook

Amupitan gbara ama n'usoro ntuliaka 2027 ga-amalite etu a:

  • Ntuliaka onyeisiala na nke Ụlọmeiwu Etiti – Febụwarị 20, 2027
  • Ntuliaka Ọkwa Gọvanọ nakwa ndị omeiwu nke steeti– Maach 6, 2027

Ọkwa ndị a ga-azọ na ntuliak 2027

Na ntụliaka 2027, ọkwa ndị a ga-azụ gụnyere:

  • Ọkwa Onyeisiala nakwa Osote Onyeisiala Naijiria
  • Ọkwa Gọvanọ nakwa Osote ya
  • Ọkwa ndị omeiwu Ụlọomeiwu Ukwu
  • Ọkwa Ụlọnnọchiteanya
  • Ndị ụlọmeiwu nke steeti

Steeti ndị agahị eso na ntuliaka ọkwa gọvanọ

Mana a gaghị enwe ntulika ọkwa gọvanọ n'ụfọdụ steeti na Naijiria dịka:

  • Anambara
  • Bayelsa
  • Edo
  • Ekiti
  • Imo
  • Kogi
  • Ondo
  • Osun